Home
GRID: Clothing People Wear
Ihe a na-eti n’ahu:
Ife a na-eyi n'aru:
Clothing People wear
No |
Central Igbo/ Anambra /English |
Igbo and English Sentences |
1 |
Nkebi Ukwu Bekee
Nkebi Ukwu Oyibo
Beleti
Belt |
Nkebi m masiri m
Nkebi m masili m
I like my belt
Nna m na-eti nkebi ukwu bekee
Nna m na-eyi nkebi ukwu oyibo
My dad wears a belt |
2 |
Kotu
Kotu
Coat |
Nwanne m nwoke nwere Kotu
Nwanne m nwoke nwelu Kotu
My brother has a coat |
3 |
Uwe mkpụrụ aka
Afe mkpịsị aka
Gloves |
A na m eti uwe mkpụrụ aka mgbe oyi
A na m eyi afe mkpịsị aka mgbe oyi
I wear gloves during cold weather |
4 |
Okpu
Okpu
Hat |
Nna m nwere Okpu
Nna m nwelu okpu
My father has a Hat |
5 |
Sketi
Sketi
Skirt |
Nne m nwere ọtụtụ sketi
Nne m nwelu ọtụtụ Sketi
My mother has a lot of skirts |
6 |
Uwe mgbada
mọbụ (or) Afe ogonogo
"Gawụnụ"
Gown |
Nwanne m nwanyi na-eti uwe mgbada
mọbụ(or) Nwanne m nwanyi na- eyi afe ogonogo
My sister wears a gown
Nne m yii gawunu ojii gaa ụka
My mother wore a black Gown to Church |
7 |
Bụlawụsụ
Bụlawụsụ
Blouse |
A na m eti bụlawụsụ dị mee mee
A na m eyi bụlawụsụ di mee mee
I wore a red blouse |
8 |
Uwe ụkwụ ogologo
Afe ụkwụ ogonogo
Trọza
Pants |
E nwere m uwe ụkwụ ogologo
Nna m nwelụ afe ụkwụ ogonogo
E nwere m Trọza
I have pants (trouser) |
9 |
Akpụkpụ Ụkwụ
Shoes |
Nne m nwere ọtụtụ Akpụkpụ ụkwụ
Nne m nwelu otutu akpụkpụ ụkwụ
My mother has many pairs of shoes |
10 |
Ihe eji ama oge
Ife eji ama oge
Watch |
Enwere m Ihe eji ama oge
E nwelu m ife eji ama oge
I have a watch or a clock |
11 |
Mgbalaka
Mgbanaka
Bracelet |
Eti m mgbalaka abụọ
Eji m mgbanaka ebụa
I am wearing two bracelets |
12 |
Akwa olu
Akwa onu
Scarf |
Biko nye m Akwa olu
Biko, nye m Akwa onu
Please, give me a Scarf |
13 |
Mgbalantị
iyeri ntị
Earring |
Nne m na-eti mgbalantị
Nne m na-eyi iyeri ntị
My mom wears earring |
14 |
Sutu
Suit |
Nna m na-eti Sutu aga ọrụ
Nna m na-eji sutu eje ọlụ
My father wears a Suit to work. |
15 |
Uwe agbama akwụkwọ
Afe agbama akwụkwọ
Wedding gown |
Uwe agabma akwụkwọ mara nma
Afe agbama akwụkwọ amaka
A wedding gown is beautiful |
16 |
Mgbala aka
Mgbana aka
Ring |
Di m nyere m Mgbala aka ọlụlụ
Di m nyelụ m mgbana aka ọnụnụ
My husband gave me a wedding ring |