Login and Register

Log in  \/ 
x
x
Register  \/ 
x

Home

Chap19-Isi Iri Na Itoolu

ISI NKE IRI NA TOOLU

 

Mmiri ukwu nke ikpeazụ n’afọ naara edo. Mgbe ahụ bụ oge e ji azọ aja e ji arụ ọgba aja. A naghị eme nke a tupu oge a n’ihi na mmiri na- ebughasi aja ahụ a zọrọ azọ; a naghikwanụ eme ya mgbe oge a gachara n’ihi na nwa obere oge, owuwe ihe ubi na ọkọchị ga-abịa.

Nke a bụ owuwe ihe ubi nke ikpeazụ Okonkwọ ga-eme na Mbanta. N’ikpeazụ, afọ asaa ndi ahụ o tufuru n’ike ọgwụgwụ naara abịa n’isi ngwụcha. N’agbanyeghị na o mere nke ọma na Mbanta, ikwunne ya, Okonkwọ matara na ya gaara eme karịa otu ahụ n’ala nna ya Ụmụọfịa bụ ebe ụmụ nwoke na-anaghị asọ anya ma dịkwa ike ọgụ. N’ime afọ asaa ndị ahụ, ọ gaara arịgoro n’ebe kachasị elu. Ya mere, ụbọchị niile ahụ ọ gbapụrụ ọsọ ndụ ji ewute ya. Ndị ikwunne ya nyerela ya aka, o kelekwara ha maka ya. Ma, nke ahụ emegharịghị ihe ọ bụla. Ọ gụrụ nwa mbụ a mụtaara ya ebe a Nneka n’ihi obiọma ndị ikwunne ya. Mgbe a mụụrụ ya nwa nwoke ka afọ abụọ gachara, ọ kpọrọ ya Nwọfịa.

Mgbe ọ banyere n’afọ nke ikpeazụ ọ ga-anọ na mgbapụ ahụ, Okonkwọ zigaara Obierika ego ka ọ rụtara ya ulọ abụọ n’ezi ha, bụ ebe ya na ezinaụlọ ya ga-ebi wee ruo mgbe ọ ga-arụta ụlọ ndị ọzọ nakwa  aja ụlọ gburu gburu ezi ya. Ọ gaghị agwa nwoke ọzọ ka ọ rụọrọ ya obi ya, ma ọ bụkwanụ aja ọgba ya. Ihe ndị ahụ bụ ihe nwoke na-aru n’onwe ya, ma ọ bụ na-erite n'aka nna ya.

Mgbe mmiri ikpeazụ ahụ bidoro zowe, Obierika ziri Okonkwọ ozi na a rụchaala ụlọ ndị ahụ, Okonkwọ wee kwadowe ụla ya mgbe mmiri ahụ kwụsịrị. Ọ gaara amasị ya ịlọta n’oge bịa rụọ ezinaụlọ ya tupu mmiri ahụ akwụsị, kama ọ gaara eketa oke ọzo site n’ime ntaramahụhụ afọ asaa ahụ site n’ime otu a. Ọ chọghị ka nke ahụ mee. Ya mere o jiri kasie, chere ka ọkọchị bịa.

O jiiri nwayo bịa. Mmiri ozuzo jiri nwayọ kwụsịwa wee ruo mgbe o bidoro tụsịwa atụsị. Mgbe ụfọdụ anwu na-acha ma mmiri ahụ zowe, nwa obere ikuku nakwa efe. Ọ bụ ụdịrị mmiri ya na ikuku ọma na-eso. Eke na ogwurugwu bidoro pụtawa, mgbe ụfọdụ, abụọ dị ka nne na nwa, nke nwa agbọghọbịa mara mma na nke agadị na a naghị ahụzị nke ọma. A na-akpọ eke na ogwurugwu a eke nke elu igwe.

Okonkwọ kpọrọ ndị inyom ya atọ gwa ha ka ha mekọta ihe a ga-eji kpọọ oke oriri. Ọ sịrị: “Aghaghi m ikele ndị ikwunne m tupu m alaa.”

Ekwefi ka nwere akpụ n’ubi ya nke ọ kọrọ n’afọ gara aga. Ndị nwunye di ya ndị ọzọ enweghị. Ọ bụghị n’ihi na ha bụ ndị umengwụ, kama ha nwere ọtụtụ ụmụaka ha naara azụ. Ha kwekọritara na ọ bụ Ekwefi ga-eweta akpụ e ji eme oriri ahụ. Nne Nwoye na Ọjịugo ga-eweta ihe ndị ọzọ dị ka azụ ọkpọọ, mmanụ na ose ha ji esi ofe. Okonkwọ ga ahụ ihe gbasara anụ na ji ha ga-eri.

N’isi ụtụtụ echi ya, Ekwefi na ada ya Ezimma na Ọbịageli, ada Ọjịugo, gara n’ubi ya ịbuta akpụ ahụ. Nke ọ bụla n’ime ha bu ogologo abọ, mma o ji egbuta osisi akpụ ahụ, na obere ọgụ ọ ga-eji gwupụta akpụ ahụ. Ka ha si nwee ihuọma, obere mmiri zoro n’abalị ahụ, ya mere na ala agaghị esi ike.

Ekwefi sịrị ha: “Ọ gaghị ewe anyị oge tupu anyị abụta akpụ otu anyị siri chọọ.”

Ezimma kwuru sị: “ma, ijiriji ga-atụ n’elu ahịahịa akpụ ndị ahụ.” O bu abọ ya n’isi ma jikọta aka ya n’obi ya. Oyi na-atụ ya. “Ọ naghị amasị m ma mmiri oyi na-atụsa m n’azụ. Anyị gaara echere ka anwụ pụta wee mịkọrọchara mmiri dị n’akwụkwọ ndị ahụ.”

Ọbịageli kpọrọ ya ‘nnu’ n’ihi na ọ sịrị na ya na mmiri adịghị na mma. “Ụjọ ọ na-atụ gị na ị nwere ike ịgbaze?”

Ịbụ akpụ ahụ gara were were dị ka EkwefI siri kwuo. Ezimma jiri osisi toro ogologo yọchaa osisi akpụ ọ bụla tupu o hulata igbubi  ya nakwa ịbụpụta akpụ. Mgbe ụfọdụ, ha anaghị egwu ala. Ha foro osisi akpụ ahụ, akpụ dị n’ala ewee soro aja pụta. Mgbe ha bụtara nke buru ibu, ha bugara ya n’iyi ugboro abụọ, ebe nwanyị ọ bụla nwere olulu ebe ọ na-awụnye akpụ ya ka o ree.

Ọbịageli kwuru sị: “Ha ga-adị mma n’ime abalị anọ ma ọ bụdị atọ, n’ihi na ha akabeghị aka.”

Ekwefi sịrị ya: “Ha adịchakwaghị otu ahụ i chere. O mewela ihe dị ka afọ abụọ m kọrọ ubi a. Ihe mere ha ji dịcha ntakịrị bụ na ala ebe a adịghị mma.”

                   …………………………………………………………………………………….

Okonkwọ adịghị emekwa ihe n’ọkara. Mgbe nwunye ya Ekwefi kpesara na ewu abụọ ga-ezu na ememme ahụ, Okonkwọ gwara ya na nke ahụ agbasaghị ya.

“Ana m akpọ oriri a n’ihi na enwere m ike ya. Agaghị ebi n’akụkụ mmiri wee jiri asụ mmiri na-akwọ aka. Ndị ikwunne m merela m ihe oma, n’ihi ya, aga m egosi ha na obi dị m ụtọ.”

Ya mere o jiri gbuo ewu atọ na ọtụtụ ọkụkọ. O yiri ebe a na-eme oriri ọlụlụ nwanyị. Ụtara, ji a gwọrọ agwọ, ofe egusi, ofe olugbu nakwa ọtụtụ ite mmanya juputara ebe ahụ.

A kpọrọ ụmụnna ha dum oku oriri ahụ, ndị agbụrụ dum Okolo nke bụ onye biri ndụ n’ihe dị ka narị afọ abụọ gara aga. Onye mekarịchara okenye ugbu a na nnukwu ezinaụlọ a bụ Uchendụ, nke bụ nwanne nne Okonkwọ. E nyere ya ọjị ka ọ waa, o wee gọọrọ ndị nna ha ochie ọfọ. Ọ rịọrọ ha maka ahụike na ọmụmụ. “Anyị anaghị arịọ maka akụ na ụba n’ihi na onye nwere ọmụmụ na ahụike nwere akụ na ụba. Anyị anaghị arịọ ka anyị nwekwanye ego kama ka anyị nwekwanye ụmụnna. Anyị ka ụmụ anụmanụ mma n’ihi na anyị nwere ụmụnna. Anụmanụ na-akọ ọkọ ya n’ahụ ososi ma na mmadụ na-agwa nwanna ya ka ọ kọọ ya nke ya.” Ọ gọọrọ Okonkwọ na ezinaụlọ ya ọfọ dị iche. Ọ wara ọjị ahụ wee tụpụrụ ndị nna ha ochie otu ibe ya n’ala.

Ndị nwunye Okonkwọ na ụmụaka ha na ndị bịara inyere ha aka isi nri bidoro bupụtasịwa erimeri ndi ahụ. Ọtụtụ ihe oriri na ọṅụṅụ jupụtara ebe ahụ nke na ọ gbara ọtụtụ ndị ikwunne ya gharịị n’anya. Mgbe ha bupụtachara ihe niile, Okonkwọ biliri ikwu okwu. Ọ sịrị: “Arịọrọ m unu ka unu nara ntakịrị ọjị a. Ọ bụghị iji kwụghachị ihe ọma niile unu meere m n’ime afọ asaa ndi a. Nwanta anaghị akwu ụgwọ mmiri ara nne ya. Akpọkọrọ m unu n’ihi na ọ dị mma ka ụmụnne zukọọ.”

E buru ụzọ kee ha ji a gwọrọ agwọ n’ihi na ọ dighị arụ ka ụtara, ọzọkwa bụ na ọ bụ jị na-ebute ụzọ. Mgbe ha richara nke a, e nyekwara ha ụtara. Ndị ụfọdụ jịrị ofe egwusi, ufọdụ jiri ofe olugbu rie ya. Ha kere anụ ahụ ebe ụmụnna ọ bụla ketara oke nke ya. Ha weere oke ha dị ka ha siri tọọ onwe ha. Ọ bụladị ndị na-enweghị ike ịbịa ebe ahụ ka e weputaara oke nke ha mgbe o ruuru ha.

Otu n’ime ndị okenye n’ụmụnna ha biliri ikele Okonkwọ mgbe ha ṅụchara mmanya:

“Ọ bụrụ na m sị na anyị atụghị anya oke oriri dị otu a, ọ ga-abụ m ịsị na anyị amaghị ka nwa anyị Okonkwọ si emesa aka. Anyị dum mara ya, anyị tụkwara anya oke oriri. Ma, nke a karịrị ihe anyị tụrụ anya ya. I meela. Ka ihe dum i mefuru lọghachiri gị okpukpu iri. Ọ dị mma n’oge ugbu a ụmụ okorọbịa na-eche na ha mara ihe karịa ndị nna ha, ịhụ onye na-eme ihe n’ugwu, n’ụzọ ochie. Onye kpọrọ ụmụnna ya oriri emeghị otu a iji gbuchuo ha agụu. Ha dum nwechara nri n’ụlọ ha. Mgbe anyị na- ezukọ na mbara ama n’abalị ma ọnwa tiwe, ọ bụghị maka ọnwa ahụ. Onye ọ bụla na-ahụ ya site n’ụlọ ya. Anyị na-agbakọ n’ihi na ọ dị mma ka ụmụnna gbakọọ. I nwere ike ịjụ ihe mere m ji ekwu ihe ndị a. Ana m ekwu ya n’ihi na egwu unu bụ ụmụ okorọbịa na-atụ m.” Ọ tụrụ aka ya ebe ọtụtụ ụmụ okorọbịa nọ. Mụ onwe m nwere nwa obere oge ibi  n'ụwa a, otu ahụ ka ọ dịkwa Uchendụ, Ụnachukwu na Emefọ. Egwu unu bụ ụmụ okorọbịa na-atụm n’ihi na unu amaghị ihe bụ na ọbara siri ike. Unu amaghị ihe bụ iji otu olu ekwu okwu. Gịnị na eso nke a? E wetaara unu otu okpukpe ọjọọ. Nwa okorọbịa nwere ike ịhapụ nna ya na ụmụnne ya ugbu a. O nwere ike ikwutọsị agbara nna ya na ndị ichie ha dị ka nkịta dinta nke bidoro yịwa ara na mberede were megide nna ya ukwu. Egwu unu na-atụ m, egwu obodo anyị na-atụ m.” Ọ tụgharịrị ọzọ ebe Okonkwọ nọ wee sị ya: “I meela otu isi kpọkọta anyị.”

 

 

IGBO AMAKA

ỤLỌAKWỤKWỌ IGBO

MỤTA IGBO

CULTURAL DANCE

MASQUERADE

EGWU DI YA

EDEMEDE IGBO

ONYE NKUZI IGBO

OLU ỤMỤ IGBO

IGBO MADE EASY

Learn In Igbo in 1 day

Learn In Igbo

Copyright � 2018-2020. Mother Tongue Academy. All Rights Reserved.We can be  reached  by Phone at (516) 442-9191  or by our Website  Contact  E-mail