Login and Register

Log in  \/ 
x
x
Register  \/ 
x

Home

Chap20-Iri Abụọ

ISI NKE IRI ABỤỌ 

 

Mmadụ ịhapụ obodo ya nọọ afọ asaa ebuka. Ọnọdụ ya adịghị anọ ebe ahụ echere ya. Ngwa ngwa ọ pụrụ, onye ọzọ ebilie nọchie ya. Obodo ahụ dị ka ngwere; ọ bụrụ na o tufuo ọdụdụ ya, ọ ga-eputekwa ọzọ.

Okonkwọ macha ihe ndị a. Ọ ma na ya etufuola ọnọdụ ya n’ime mmọnwụ toolu ahụ bụ ndị na-ekpe ikpe n’obodo. O tufuola ohere ahụ ndị obodo ya hụrụ ọgụ n’anya nwere iji megide ndị okpukpe ọhụrụ ahụ bụ ndị a gwara ya na ha agbanyela mgbọrọgwụ. O tufuola afọ ndị ahụ ọ gaarala eji chie echichi ndị ahụ kachasị elu n’obodo ha. Ma, ụfọdụ nime ihe ndị a o tufuru bụ ndị o nwere ike iweghachi.  O kpebiri na ndị obodo ya ga-echeta nlọta ya n’ụzọ pụrụ iche. Ọ ga-alọta n’ebube, wee weghachi afọ asaa ndị ahụ o tufurula.

Ọ bụrịị n’ime afọ mbụ ọ gbapụrụ ka ọ bidoro haziwe maka nlọta ya. Ihe mbụ ọ ga-eme bụ ịrụgharị mbara ezi ya n’ụzọ dị ebube. Ọ ga-arụ ọba ji nke karịrị nke ahụ o nwere na mbụ, ma ruọkwa ụlọ abụọ maka ndị inyom ọhụrụ. Mgbe ahụ ka ọ ga-ezipụta akụ na ụba ya site n’ichiri ụmụ ya ndị nwoke echichi ọzọ. Naanị ndị aka siri ike n’obodo nwere ike ime nke a. Okonkwọ hụziri nke ọma ọnọdụ ahụ dị elu nke ndị obodo ya ga-enye ya, ọ hụkwara onwe ya ebe ọ na-echi echichi ahụ kacha elu n’obodo.

Ka afọ ndị ahụ ọ gbapụrụ ọsọ ndụ naara agafe n’otu n’otu, ọ dị ya ka chi ya ọ naara achọ imezi ihe ọdachị ndị ahụ garala aga. Ji ya naara abawanye ụba ma n’ikwunne ya ma n’Ụmụọfịa bụ ebe enyi ya nwoke naara enye ha ndị a rụta, e kee.

Ihe ọdachị diọkpara ya ahụ wee mee. Na mbụ, ọ dị ya ka ihe ahụ ọ ga-akarị mmụọ ya. Ma, o nwere mmụọ e ji edi ihe, ye mere, n’ikpeazụ Okonkwọ lugburu iru uju ya. O nwere ụmụ nwoke ise ọzọ bụ ndị ọ ga-azụlite n’ụzọ ndị obodo.

Ọ kpọrọ ụmụ ya ndị nwoke ise ahụ ha bịa nọrọ n’obi ya. Nke nta n’ime ha dị afọ anọ. “Ụnụ niile ahụla oke arụ nwanne unu nwoke kpara. Ugbu a, ọ bụghịkwa nwa m ma ọ bụ nwanne unu nwoke. Aga m enwe naanị diọkpara nke na-eme ka nwoke, nke ga na-ewelita isi ya n’ebe ndị obodo anyị nọ. Ọ bụrụ na o nwere onye n’ime unu chọrọ ịbụ nwanyị, ya sowe Nwoye ugbu a m ka nọ ndụ ka m nwee ike ịbụ ya ọnụ. Ọ bụrụ na unu atụgharịa megide m mgbe m nwụrụla, aga m abịakwute unu wee gbajie unu olu.”

Okonkwọ nwere ihuọma n’ebe ụmụ ya ndị nwanyị nọ. Ọ na-ewute ya mgbe dum na Ezimma bụ nwanyị. N’ime ụmụ ya niile, naanị ya na-aghọta ọnụdụ ya mgbe dum. Ka afọ gawara ka ụdọ njikọ obi ebere bidoro dịwa n’etiti ha abụọ.

Ezimma tolitere mgbe ahụ nna ya gbapụrụ ọsọ ndụ wee bụrụ otu n’ime ụmụ agbọghọbịa kacha mma na Mbanta. A naara akpọ ya ‘Ugomma’ dị ka a kpọrọ nne ya mgbe ọ dị n’agbọghọbịa. Nwantakịrị nwanyị ọrịa ahụ nke buteerela nne ya oke ọbara mgbali elu, bụkwa onye gbanwerela n’otu ntabi anya ahụ wee bụrụzịe nwa agbọghọ ahụ gbasịrị ike. Ọ bụ eziokwu na o nwere mgbe obi anaghị adị ya mma, bụ mgbe ọ na-atakarị onye ọ bụla dị ka nkịta ara. Ọnọdụ dị otu a na-adakwasị ya na mberede n’enweghị ihe kpatara ha. Ha anaghị anọ ọdụ, ha anaghịkwa abịa mgbe dum. Ọ bụrụ na ọ nọrọ n’ọnọdụ dị otu a, ọ naghị anabata onye ọzọ na-abụghị nna ya.

Ọtụtụ ụmụ okorọbịa nakwa ndị dimkpa ndị nwere ego na Mbanta bịara ilụ ya. Ọ jụrụ ha dum n’ihi na nna ya kpọrọ ya otu anyasị wee sị ya: “E nwere otụtụ ndị ọma nwere ego ebe a, ma ọ ga-amasị m ma ọ bụrụ na ị lụọ dị n’ụmụọfịa mgbe anyị lara.”

Naanị ihe a ka o kwuru, ma Ezimma aghọtachaala ihe niile dị na mkpụrụ okwu ole na ole ndị ahụ. Ya mere o jiri kwere.

Okonkwọ sịrị ya: “ Ọbịageli nwanne gị nwanyị agaghị aghọta ihe m kwuru  ma i nwere ike ịkọwara ya.”

N’agbanyeghị na ha abụọ bụ otu ọgbọ, Ezimma na-agwakarị nwanne ya nwanyị ihe ọ na-eme. Ọ kọwara ya ihe kpatara na ha agabeghị alu di, o wee kwere. Ya mere ha abụọ jiri jụ ilụ di na Mbanta.

“ Ọ gaara adị m mma ma a sị na ọ bụ nwoke,” ka Okonkwọ chere n’ime obi ya. Ọ na-aghọta ihe dum otu o kwesiri. Onye n’ime ụmụ ndị ọzọ gaarala aghọta ihe ọ na-eche nke ọma? Ụmụ agbọghọbịa abụọ ọma ndị a tozuru etozu o nwere ga-eme ka nlọta ya n’Ụmụọfịa dọta ọtụtụ ndị mmadụ. Ndị ọgọ ya nwoke ga-abụ ndị nwere agba n’obodo. Ndị ogbenye na-amaghị aha ha agaghị anwa anwa ịbịa.

         ……………………………………………………………...............................................................................................................................

Ụmụọfịa agbanweela n’ezie n’ime afọ asaa ahụ Okonkwọ gbapụrụ ọsọ ndụ. Ndị ụka abịala wee dufuo ọtụtụ mmadụ. Ọ bụghị naanị ndị ogbenye na ndị osu soorola ha, mgbe ụfọdụ otu akajiakụ sokwara ha. Onye dị otu ahu bụ Ogbuefi Ugonna, nke bụ onye chirila echichi abụọ. O mere ka onye ara, gbubusie aka echichi ya, tufuo ya wee soro ndị ozioma ahụ. Onye oziọma nwa bekee ahụ hụrụ ya n’anya nke ukwu. Ọ bụkwa otu n’ime ndị Umụọfia mbụ natara oriri nsọ. Ogbuefi Ugonna weere oriri nsọ ahụ naanị n’ụzọ oriri na ọṅụṅụ nke dị nsọ karịa nke ndị obodo. Ya mere o tinyere mpi mmanya ya n’ime akpa ajị ya wee gawa oriri nsọ ahụ.

E wezuga ụlọ ụka, ndị bekee ewetakwala otu usoro ọchịchị. Ha ewuola ụlọikpe ebe nwa D.C na-anọ ekpe ikpe na-aghọtaghị aghọta. O nwere ndị ‘kotọma’ bụ ndị na-akpụta ndị mmadụ n’ụlọ ikpe. Ọtụtụ n’ime ndị kọtọma ahụ sitere n’Ụmụrụ nke dị n’akụkụ oke osimiri ahụ bụ ebe ndị bekee bu ụzọ bịarute ọtụtụ afọ gara aga ma bụrụkwa ebe ha rụrụ ụlọ ụka ha, ịzụ ahịa nakwa ọchịchị ha. Ndị Ụmụọfịa dum kpọrọ ndị kọtọma a asị n’ihi na ha bụ ndị ọbịa, ha na-eme isi ike ma nweekwa aka ntagide. A naara akpọ ha kọtọma, ma site ka uwe ha si acha ntụ ntụ, ha nwere aha ọzọ bụ ‘ike ntụ’. Ọ bụ ha na-echedo ụlọ mkpọrọ nke ụmụ nwoke ndị dara ịwu nwa bekee jupụtara. Ụfọdụ n’ime ha bụ ndị tufurula ụmụ ejima ha, ụfọdụ bụ ndị kparịrịla ndị ọziọma ahụ. Ndị kọtọma ahụ naara apịa ha ihe n’ụlọ mkpọrọ ahụ ma meekwa ha ka ha rụọ ọrụ kwa ụtụtụ site n’ibọchasị ụlọ gọmentị nakwa ịkpara nwa D.C. na ndị kọtọma ndị ahụ nkụ. Ụfọdụ n’ime ndị mkpọrọ ahụ bụ ndị chiri echichi, ndị na-ekwesighi ịrụ ụdịrị ọrụ ahụ. Iwe were ha nke ukwu maka mkparị ahụ ha natara, ha rikwara uju maka ubi ha nke ha hapụrụla. Ha na-asụ ahịhịa n’ụtụtụ, ụmụ okorọbịa ana-agụ egwu a ka ya na ụda mma ha na-adakọ ọnụ:

“Kọtọma ike ntụ,

Onye ‘elebra’ ka ya mma.

Nwa bekee enweghị uche,

Onye ‘elebra’ ka ya mma.”

Ọ naghị adị ndị kọtọma ahụ mma n’obi ka a na-akpọ ha ‘ike ntụ’ n’ihi ya ha na-apịa ndị mkpọrọ ahụ ihe. Ma egwu a gbasara n’Ụmụọfịa dum.

Obi jọrọ Okonkwọ njọ mgbe Obierika naara akọrọ ya ihe ndi a.

Okonkwọ sịrị ya: “E leghị anya, anọtere m aka ebe ahụ m gara. Ma, enweghị m ike ịghọta ihe ndị ị na-akọrọ m. Ọ bụ gịnị merela ndị obodo anƴi? Ọ bụ gịnị mere ha jirila tụfuo ike ha ji alụ ọgụ?”

Obierika jụrụ ya sị: “Ị ka nụbeghị otu nwa bekee siri gbuchapụ ndị Abame?”

Okonkwọ sịrị ya: “Anụla m ya. Anụkwala m na ndị Abame bụ ndị umengwu na ndị ịberibe. Ọ bụ na ha enweghị egbe na mma? Anyị ga-abụ ndị ụjọ iji onwe anyị tụnyere ndị Abame. Ndị nna ha ochie anwabeghị mbụ iguzo n’ihu ndị nna anyị ochie. Anyị ga-alụsọ ndị a agha wee chụpụ ha n’ala anyị.”

O bierika jiri obi ilu sị ya: “Oge agaala. Ọ dịkwaghị ihe anyị pụrụ ime ugbu a. Ndị nwoke anyị na ụmụ anyị abanyela n’otu onye ọbịa a. Ha esorola usoro okpukpe ya ma nyekwa aka ịkwado usoro ọchịchị ya. Ọ gaghị adirị anyị mfe ma anyị nwaa ịchụpụ ndị bekee n’Ụmụọfịa. Ha dị naanị abụọ. Ma, kedukwanụ maka ndị nke anyị bụ ndị na-eso ụzọ ha, ndị ha nyerela ike? Ha ga-aga Ụmụrụ gaa kpọta ndị agha ha, anyị ewee dị ka ndị Abame.”

Mgbe o mechichara ọnụ ya ọtụtụ oge, ọ sịrị: “Agwara m gị otu ha siri kpọgbụo Aneto n’oge ikpeazụ ahụ m bịara Mbanta.”

Okonkwọ jụrụ ya ọzọ sị: “Gịnị meziri ala ahụ na-ese okwu?”

“Ụlọikpe nwa bekee kpebiri na ọ ga-abụ nke ezinaulọ Nnanna bụ ndị nyerela ndị kọtọma na ndị nkọwa okwu nwa bekee ezigbo ego.”

“Nwa bekee, ọ maara omenala anyị?”

“Kedu otu ọ ga-esi amata ebe ọ bụ na ọ dịghị asụ asụsụ anyị? Ma, ọ sịrị na omenala anyị jọrọ njọ, ndị ụmụnna anyị bụ ndị nabatarala okpukpe ya na-asịkwa na omenala anyị jọrọ njọ. Kedu otu  i si chee na anyị ga-aga ọgụ mgbe ụmụnna anƴị tụgharịrịla imegide anyị? Nwa bekee nwere oke akọ. O jiri nwayọ n’ụzọ udo weta okpukpe ya. Iberibe ya tọrọ anyị ọchị, anyị wee hapụ ya ka ọ nọrọ. Ugbu a, ọ kpọrọla ndị ụmụnna anyị, obodo anyị agaghịkwa eme ihe n’otu. O tinyela mma n’udọ ahụ jikọtara anyị ọnụ ,anyị wee dasasia.”

Okonkwọ jụrụ ya sị: “Kedu ka ha si nweta Aneto wee kpọgbuo ya?”

Mgbe  o gburu Ọduche n’ọgụ ha lụrụ banyere ala ahụ, ọ gbagara n’Anịnta iji gbanahụ iwe nke Ala. O mere nke a n’ihe dị ka abalị asatọ ha lụchara ọgụ ahụ n’ihi na Ọdụche anwụghị otu ihu ahụ o meruchara ahụ. O bụ na abalị nke asaa ka ọ nwụrụ. Onye ọ bụla matara na ọ ga-anwụ, ya mere Aneto jiri chịkọta ngwongwo ya ịgbapụ. Ma, ndị otu Kristi ahụ agwala nwa bekee maka mmerụ ahụ ahụ, o wee dupu ndị kọtọma ya ka ha gaa nwude Aneto. Ha tụrụ ya na ndị ndu ezinaụlọ ha dum mkpọrọ. N’ikpeazụ, Ọdụche nwụrụ, ha wee kpụrụ Aneto gaa Ụmụrụ gaa kpọgbuo ya. Ha hapụrụ ndị ọzọ, ma ruo ugbu a, ha ahụbeghị ọnụ ha jị akọ ahụhụ ha tara ebe ahụ.”

Ka e mechara, ndi nwoke abụọ ndị a nọrọ ogologo oge na-ekwughị okwu ọ bụla.

   Edited by Onyeabọ

  

IGBO AMAKA

ỤLỌAKWỤKWỌ IGBO

MỤTA IGBO

CULTURAL DANCE

MASQUERADE

EGWU DI YA

EDEMEDE IGBO

ONYE NKUZI IGBO

OLU ỤMỤ IGBO

IGBO MADE EASY

Learn In Igbo in 1 day

Learn In Igbo

Copyright � 2018-2020. Mother Tongue Academy. All Rights Reserved.We can be  reached  by Phone at (516) 442-9191  or by our Website  Contact  E-mail