Login and Register

Log in  \/ 
x
x
Register  \/ 
x

Home

Chap21-Isi Nke Iri Abụọ Na Otu

ISI NKE IRI ABỤỌ NA OTU

 

O nwere ọtụtụ ndị nwoke na nwanyị n’Ụmụọfịa bụ ndị ọnọdụ ọhụrụ a dị n’obodo ha anaghị ewute otu o si ewute Okonkwọ. Ọ bụ eziokwu na nwa bekee wetara okpukpe ara, ma, ọ rụọkwala ụlọ azụmahịa bụ ebe mmanụ nkwụ na akụ ya bụrụ ihe oke ọnụahịa na mbụ, nnukwu ego wee batazie n’Ụmụọfịa.

A bịa n’ihe gbasara usoro okpukpe ahụ, ndị mmadụ bidoro chewe na e leghị anya, ọ dị ihe ọma dị n’ime ya, na-abụghị ara ahụ ha chere.

Echiche dị otu  bidoro batawa ha n’obi. Site n’akparama agwa Mazị Brọwn, bụ onye oziọma bekee nke kwụ chim n’igbochu ndị otu ya ịkpasu ndị obodo iwe. Ma, otu onye n’ime ha rara ya ahụ ijikọta. Aha ya bụ Enọkụ. Nna ya bụ onyeisi na-elekọta agwọ ụmụ agbara ahụ. Akụkọ kọrọ sị na Enọkụ egbuola ma riekwa Eke agbara ahụ, ya mere, nna ya jiri bụọ ya ọnụ.

Mazị Brọwn katọrọ ụdịrị akparama agwa dị otu ahụ. Ọ gwara ndị otu ya na e nwere ike ime ihe dum, ma, na ọ bụghị ihe dum bara uru. Nke a mere ka mmadụ dum, ma ndị obodo, na-akwanyere ya ugwu n’ihi na o ji nwayọ na-eso usoro nkweye ndị obodo. Ya na ụfọdụ ndị ukwu nọ n’obodo abụrụla enyi. N’otu n’ime nleta ahụ ọ na-eleta obodo ndị gbara ha gburu gburu, e nyere ya mpi enyi a pịrị apị, bụ nke na-egosi ọnọdụ dị elu na ịkwanyere mmadụ ugwu. Otu n’ime ndị ukwu n’obodo ka a na-akpọ Akụna. Ọ kpọpụtara otu nwa ya nwoke ka a kụziere ya amamihe nwa bekee n’ụlọ akwụkwọ Mazị Brọwn.

Mgbe ọ bụla Mazị Brọwn gara n’obodo ahụ, ọ na-anọ ogologo oge n’obi Akụnna na-agwa ya okwu Chukwu site n’ọnụ onye nkọwa ya. Ọ dighị onye n’ime ha nwere ike ime ka ibe ya chegharịa, ma, ha mụtara ọtụtụ ihe gbasara nkwenye ha dị iche iche.

N’otu n’ime nleta ahụ, Akụnna gwara Mazi Brọwn sị: “I kwuru sị na e nwere otu Chi nke kachasị elu, bụkwa onye kere eluigwe na ụwa, anyị kwenyekwara na ya, anyị na-akpọ ya Chukwu. Ọ bụ ya kere ụwa na chi ndị ọzọ niile.” Mazị Brọwn zara ya sị: “Ọ dỊghị chi ndị ọzọ e nwere. Chukwu bụ naanị otu chị  e nwere, chi ndị ọzọ abụghị ndị ezigbo ya. Unu na-atụ osisi dị ka nke ahụ ( ọ tụrụ aka n’elu uko ebe Akụnna kowere Ikenga ya) wee kpọọ ya chị. Ma, ọ ka bụkwa mkpirisi osisi.”

Akụnna sịrị ya: “Nke ahụ bụ eziokwu, ọ bụ mkpirisi osisi. Ọ bụ Chukwu kere osisi ebe e siri tụọ ya, dị ka o siri kee chi ndị ọzọ. Ma, o mere ha ndị ozi ya ka anyị wee nwee ike isite n’aka ha gakwuru ya. Ọ dị ka gị. ị bụ onye isi ụlọ ụka gị.”

Mazị Brọwn jụrụ nke a. Ọ sịrị ya: “ Mba, onye isi ụlọ ụka m bụ Chukwu n’onwe ya.”

Akụnna gara n’ihu sị: “Ama m nke ahụ, ma, a ga-enwerịrị onye isi n’etiti ụmụ mmadụ n’ụwa a. Onye dị ka gị ga-abụ onye isi ebe a.”

“Ya bụrụ otu ahụ, onye isi ụlọ ụka m nọ n’ala bekee a na-akpọ England.”

“Nke ahụ bụ kpọm kwem ihe m na-ekwu. Onye isi ụlọ ụka gị nọ n’obodo unu. O zitere gị ebe a dị ka onye ozi ya. Gị onwe gị ahọpụtakwala ndị gị. Ka m werekwa ihe ịma atụ ọzọ, nwa D.C. bụ eze unu zitere ya.”

Onye nkọwa okwu ahụ gwara ya na nke onwe ya sị: “ Ha nwere eze nwanyị.”

“Eze nwanyị unu zitere onye ozi ya, nwa D.C. Ọ hụrụ na ọ gaghị arụli ọrụ ahụ naanị ya, o wee họpụta ndị kọtọma ka ha nyere ya aka. Otu ahụ ka ọ dịkwa Chukwu. Ọ họpụtara chi nta ndị ọzọ ka ha nyere ya aka n’ihi na ọrụ o nwere karịrị otu onye.”

Mazị Brọwn gwara ya sị: “Ị gaghị ewere Chukwu dị ka otu mmadụ. Ọ bụ n’ihi na ị na-eme otu a ka i jiri chee na ọ ga-achọ ndị enyem aka. Nke kacha njọ bụ na ụnụ na-enye chi ndị unu jiri aka unu kee ofufe niile.”

Nke ahụ abụghị eziokwu. Anyị na-achurụ obere chi ndị a aja, ọ bụrụ na ha azaghị oku, ma ọ dịghịkwa onye ọzo anyị ga-agakwuru, anyị na-agakwuru Chukwu. Nke a bụ ihe ziri ezi ime. Anyị na-agakwuru oke mmadụ site na ndị odibo ya. Ọ bụrụ na ndị odibo ya enyereghị anyị aka, anyị ewee gakwuruzie onye ahụ n’onwe ya. Ọ dị gị ka anyị na-enye obere chi ndị a oke nsọpụrụ, ma, nke a abụghị eziokwu. Anyị na-enye ha nsogbu karịa n’ihi na anyị na-atụ egwu inye nna ha ukwu nsogbu. Ndị nna anyị ha maara na Chukwu kachasị ihe dum elu, ya mere, ha nyere ụmụ ha aha dị ka ‘Chukwuka.’

Mazị Brọwn sịrị ya: “I kwuola otu ihe bara uru. Unu na-atụ Chukwu egwu. N’okpukpe m, Chukwu bụ nna ịhụnanya, n’ihi ya, ọ dịghị itụ egwu dịịrị ndị dum na-eme uche ya.”

Akụnna zaghachiri ya: “Ma, anyị ga-atụ ya egwu mgbe anyị na-adịghị eme uche ya. Onye ga-agwakwanụ anyị uche ya. Nke a bụ ihe dị ukwuu ịmata.”

N’ụzọ dị otu a ka Mazị Brọwn siri mụta ọtụtụ ihe gbasara ụsoro okpukpe chi ndị obodo ahụ. Okpebiri na ibuso ha agha otu ihu ahụ agaghị aba uru. Ya mere, o jiri rụọ ụlọ akwụkwọ na obere ụlọ ọgwụ n’Ụmụọfịa. Ọ gara n’ụlọ n’ụlọ na-arịọ ndị mmadụ ka ha kpọta ụmụ ha n’ụlọ akwụkwọ ahụ. Na mbụ, ha zigara naanị ndị ohu ha, ma ọ bụ, mgbe ụfọdụ, ụmụ ha ndị umengwụ.

MazI Brọwn rịọrọ ha arịrịọ, siere ha agụgọ ma buokwara ha amụma. Ọ gwara ha na ndị ndu obodo ha n’ọdịnihu ga-abụ ụmụ nwoke na nwanyị ndị mụtara otu e si agụ na otu e si ede. Ọ burụ na ndị Ụmụọfịa ajụ iziga ụmụ ha n’ụlọ akwụkwọ, ndị ọbịa ga-esite ebe ọzọ bịa chịwa ha. Ha nwere ike ịhụ na nke a emewelarị n’ụlọikpe ha, bụ ebe ndị ọbịa na-anụ asụsụ nwa D.C. gbara ya gburu gburu. Ọtụtụ n’ime ndi ọbịa a sitere n’Ụmụrụ nke dị n’akụkụ oke osimiri ahụ bụ ebe nwa bekee buru ụzọ bịa.

N’ikpeazụ, okwu ndị ahụ Mazị Brọwn gwara ha bidoro dịwa ire. Ọtụtụ ndị mmadụ bịara ịmụ ihe n’ụlọ akwụkwọ ya, ọ gbara ha ume site n’inye ha onyinye uwe ime ahụ nakwa akwa mmiri. Ndị niile ahụ bịara ịmụ akwụkwọ abụghị ndị na-eto eto. Ụfọdụ n’ime ha gbara iri afọ atọ ma ọ bụ karịa. Ha na-aga ọrụ ubi ha n’ụtụtụ, wee gaa akwụkwọ n’ehihie. O teghị anya, ndị obodo ebido kwuwe na ọgwụ nwa bekee na-arụ ọrụ ya ngwa ngwa. Ụlọ akwụkwọ Mazị Brọwn na-ewepụtakwa aka ọrụ ya ngwa ngwa. Naanị ịga ebe ahụ ọnwa ole na ole ezuorola mmadụ ịbụ onye kọtọma, ma ọ bụ onye ode akwụkwọ ụlọ ikpe. Ndị nọtere aka na-abụ ndị na-aga ọrụ n’ogige ubi Chukwu. A rụrụ ọtụtụ ụlọ ụka nakwa ụlọ akwụkwọ ole na ole n’obodo ndị gbara ya gburu gburu. Site na mbido ka usoro okpukpe ụka na mmụta jiri agakọta ọnụ.

Ụlo ụka Mazị Brọwn naara eto n'ike n’ike. Site na mmekọrịta ya na ndị ọchịchị ọhụrụ ahụ, o nwetara ọnọdụ  pụrụ iche n’obodo. Ma, Mazị Brọwn n’onwe ya bidoro nwewe ahụ mgbụ. Na mbụ, ọ chọghị ilebara onwe ya anya. N’ikpeazụ, ọ hapụrụ igwe atụrụ ahụ n’obi mgbawa.

………………………………………………………………………..

O bụ n’ime udu mmiri mbụ mgbe Okonkwo lọtachara n’Ụmụọfịa ka Mazị Brọwn lawara obodo ya. Ngwa ngwa ọ nụrụ na Okonkwọ alọtala n’ọnwa ise gara aga, onye ụkọchukwu ahụ gara kpọtụrụ ya. Ọ ka zipụrụ Nwoye, ọkpara Okonkwọ, bụ onye a na-akpọzi Aiziki n’ụlọ akwụkwọ ndị nkuzi dị n’Ụmụrụ. O chere na obi ga-atọ Okonkwọ ụtọ ịnụ nke a. Ma, Okonkwọ chụpụrụ ya site n’ịbara ya mba na ọ bụrụ na ọ bịa na mbara ezi ya ọzọ, na a ga-ebu ya ebu apụ.

Nlọghachi Okonkwọ n’ala nna ya adịghị ukuruku dị ka o chere. Ọ bụ eziokwu na ada ọma ya abụọ bidoro dọtawa ụmụ okorọbịa bụ ndị chọrọ ịlụ ha, mkparịta ụka gbasara ọlụlụ ha bidokwara gawa n’ihu, ma e wezuga nke a, ndị Ụmụọfịa emeghị ka ha matara na ọchịagha ahụ alọtala. Ihe mgbanwe pụrụ iche emeela n’obodo ya mgbe ahụ ọ gbapụrụ nke mere ka ha ghara ime ncheta nlọta ya. Ihe dizị n’anya nakwa obi ndị mmadụ ugbu a bụzị usoro ọchịchị na ọkpukpe ụka ọhụrụ ahụ na ụlọ azụmahịa ndị ahụ dị n’obodo. Ha ka nwere ọtụtụ ndị bụ ndị kpọrọ ihe ọgbara ọhụrụ ndị ahụ asị, ma ọ bụladị ka ha naara eche, na ekwutu ihe ndị ọzọ, ọ bụghị ihe gbasara nlọta Okonkwọ.

Afọ ahụ bụkwa afọ ọjọọ. A sị na Okonkwọ chiiri umu ya abụọ echichi ọzọ dị ka o sirila kwado, ọ gaara akpọtụ akpọtụ. Ma, ha naara eme emume ichu ọzọ ahụ otu mgbe n’ime afọ atọ n’Ụmụọfịa, ya mere, ọ ga-echere ihe dị ka afọ abụọ tupu oge emume ọzọ eruo.

Ọ naara ewute Okonkwọ nke ukwu n’ime mmụọ ya. O riiri obodo ya bụ nke na-etisasị etisa uju, o rikwara ndị dike agha Ụmụọfịa bụ ndị o nweghị ike ikọ ihe kpatara ha jị emezi ka ụmụ nwanyị ụjụ.

 

 

IGBO AMAKA

ỤLỌAKWỤKWỌ IGBO

MỤTA IGBO

CULTURAL DANCE

MASQUERADE

EGWU DI YA

EDEMEDE IGBO

ONYE NKUZI IGBO

OLU ỤMỤ IGBO

IGBO MADE EASY

Learn In Igbo in 1 day

Learn In Igbo

Copyright � 2018-2020. Mother Tongue Academy. All Rights Reserved.We can be  reached  by Phone at (516) 442-9191  or by our Website  Contact  E-mail