Login and Register

Log in  \/ 
x
x
Register  \/ 
x

Home

Chapter24

ISI NKE IRI ABỤỌ NA ANỌ

 

 

 

 

 A tọhapụrụ Okonkwọ na ndi mkpọrọ ibe ya ozugbo ha kwụchara nha ahụ. Nwa D.C. gwara ha okwu ọzọ banyere eze nwanyị ukwu ahụ, udo nakwa ezigbo ọchịchị. Ma na ndi ahụ egeghị ya ntị. Ha nọorọ nnọọ na-ele ya na ọkọwa okwu ya n’anya. N’ikpeazụ, e nyeghachiri ha akpa na ọbọ mma ha wee gwa ha ka ha lawa. Ha biliri wee hapụ ụlọikpe ahụ. Ha atụpụrụghị onye ọ bụla ọnụ,ma ọ bụ kparịtakwa ụka n’etiti onwe ha.                                                                     A rụpụrụ ụlọikpe ahụ n’akụkụ obodo dị ka ụlọụka ahụ. Ndi mmadụ adịghị akọ akọ n’okporo ụzọ ahụ jikọtara ha n’ihi na ọ bụkwa ya ka ha si echu n’iyi nke dị ma a gachaa ụlọikpe ahụ. Ụzọ ahụ ghere oghe ma juputakwa n’aja uzuzu. Otu a ka okporoụzọ ndi obodo na-adị oge ọkọchị. Ma, udummiri bịa, ahịhịa na-eruchi n’ụzọ ndi a. Ugbu a bụ oge ọkọchị.                                               Mgbe ha naara ala, ha zutere ụmụ nwanyị na ụmụntakịrị ka ha bu ite na-echu n’iyi. Ma, otu ha siri kechie ihu ha mere ka umụ nwanyị na ụmụaka ndi a ghara ikwere ha nnọọ, ka ha nyere ha ohere n’ụzọ ka ha gafere. N’ime  obodo, mmadụ ole na ole naara eso ha wee ruo mgbe ha buru ibu. Mgbe nke ọ bụla n’ime mmadụ isii ahụ rutere n’ihu be ya,ụfọdụ ndi mmadụ esoro ya banye. Obodo ahụ jiri ụzọ dị nwayọ na-agba ghara ghara.                                                                 Ezimma siiri nna ya nri mgbe ọ nụrụ kepu kepu na a ga-ahapụ ha isii. O bugaara ya nri ahụ n’obi ya. Obi nna ya nọ ebe ọzọ mgbe ọ na-eri nri ahụ. Agụụ adịghị agụ ya ; o riri  nri ahụ naanị ka obi wee dị ada ya mma.Ndi ikwu ya ndi nwoke nakwa  ndi enyi ya gbakọtara n’obi ya, Obierika naara agba ya ume ka o rie nri ahụ. Ọ dịghị onye ọzọ kwuru okwu kama ha hụrụ akara ogologo ndi ahụ gara Okonkwọ n’azụ, bụ ebe apịpịa nwa kọtọma merụrụ ya ahu.                                                                                

 

    Onye ọkụekwe ahụ gagharịkwara ọzọ n’abalị ahụ. Ọ kụrụ ogele ya wee gwa  ndi obodo na nzukọ ọzọ ga-adị n’ụtụtụ echi ya. Mmadụ dum matara na n’ikpeazụ,ndi Ụmụọfịa ga-ekwu ihe bụ uche ha n’ihe niile ndi a na-emenụ.                                                                                                    Okonkwọ ehichaghị ụra n’abalị ahụ.Iwe ahụ dị ya n’obi mekọtaziri ugbu a na nke natakịrị obi ọma na-akpa ya. Tupu ọ laba ụra n’abalị ahụ, o wetutara uwe agha ya bụ nke o mesabeghị aka kemgbe ahụ ọ lọghachiri n’obodo ya. O tichasịrị uwe agwọ ya nke tụrụla anwụrụ ọkụ,ma lezie okpu abụba ugo ogologo ya nakwa ọja ya.O chere sị na ha ka dịcha mma.                                      Mgbe o dinara n’elu akwa ogugu ya,o chere ihe banyere omume ahụ ha mesoro ya n’ụlọikpe nwa bekee, o wee ṅụọ iyi na ya ga-abọrọ ọbọ. Ọ bụrụ na Ụmụọfịa ekpebie ịga agha, ihe dum ga-adị mma. Ma ọ bụrụkwanụ na ha ahọrọ ịbụ ndi ụjọ, ọ ga-aga megwara nke nnanị ya.O chetara ihe gbasara agha na mgbe gara aga. O chere na nke  kachasị dị ebube bụ nke ahụ ha na ndi Isike lụrụ. Na mgbe ahụ, Okudo ka nọ ndụ. Okudo naara agụ egwu agha n’ụzọ  na ọ dịbeghị onye gụrụ ya mbụ. Ọ bụghị onye ọgụ ma, olu ya na-eme ka ike ọdụm bata mmadụ n'ahụ.                                                                                                                                                 Mgbe Okonkwọ chetachara ụbọchị ndi ahụ, ọ mara ọsụ wee sị: ‘’Ndi nwoke tuurula ugo anọzighị ya. Ndi Isike agaghi echefu otu anyị siri gbukpọọ ha n’agha ahụ. Anyị gburu mmadụ iri na abụọ ndi nke ha ebe ha gbutere naanị mmadụ abụọ ndi nke anyị. Ha bidoro kpewe udo tupu izu nke anọ na-agwụcha. Mgbe  ahụ buụrụla mgbe nwoke bụ nwoke.’'                                               Mgbe ọ na-eche ihe ndi a, ọ nụrụ ka ogele ahụ naara ada n’ebe dị anya.O geziri ntị nke ọma  wee nụ olu onye ọkụekwe ahụ. Olu ahụ naara ada n’ime ime.Ọ tụgharịrị n’elu akwa ya, azụ ya gburu ya mgbu. Ọ tara ikikere eze ya. Ọkụekwe ahu bịara nso nso wee ruo mgbe ọ gafere ihu ezi Okonkwọ.                                                                                                                                       Okonkwọ jiri iwe chee sị na ‘’oke ihe mgbochi dị n’Ụmụọfịa ugbu a bụ onye ụjọ ahụ, Egonwanne. Ire ụtọ ya nwere ike ime ka ire ọkụ ghọọ mmiri oyi. Mgbe ọ na-ekwu okwu, ọ na-eme ka ike gharakwa ịdị ndi nke anyị. A sị na ha hapụru amamihe ụmụ nwanyị a n’afọ ise gara aga, anyị agaraghị ịnọ n’ụdị ọnodu dị otu a.’’ Ọ tara  ikikere eze ya. ‘’Echi ọ ga-agwa ha na ndi nna anyị ha alụbeghị agha ịta ụta mbụ. Ọ bụrụ na ha gee ya ntị n’olu, aga m ahapụ ha wee chọpụta ụzọ m ga-esi ɓọrọ ọbọ nke m.’’                                                                                               Olu ọkụekwe ahụ bidokwara dawa ime ime, ogele ya adịghịkwa adasi ike site n’ebe ahụ ọ nọzi. Okonkwọ sitere n’otu akụkụ akwa ahụ wee tụgharịa na nke ọzọ ebe ihe mgbu ahụ azụ ya na-enye ya mere ka o nweta ụdị obi ụtọ ọ maghị otu ọ ga-esi kọwaa ya. ‘’Ka Egonwanne kwugodu ihe gbasara agha ịta ụta echi, ewee m gosi ya azụ m na isi m.’’ Ọ takwara ikikere eze ya.                  Ndi mmadụ bidoro juputawa na mbara ahịa ahụ ozugbo anwụ wara. Obierika naara eche n’obi ya  mgbe Okonkwọ bịara ịkpọtụrụ ya. Ọ nyaara akpa ajị ya nakwa ọbọ mma ya n’ubu ya, wee pụta soro ya. Ụlọ Obierika nọchiri ụzọ, ya mere, ọ hụrụ onye ọ bụla gafere  gawa na mbara ahịa ahụ. Ya na ọtụtụ ndi gaferela n’ụtụtụ ahụ kwekọrịtarala ekele ụtụtụ.                                                    Mgbe Okonkwọ na Obierika bịarutere ebe ahụ ọtụtụ ndi mmadụ ha ka igurube anọrọlarị anọrọ, nke na a ghalie aja elu, ọ gaghị adaru ala. Ọtụtụ ndi ọzọ sitere n’akụkụ niile nke obodo toolu ahụ ka na-abịakwa. Obi tọrọ Okonkwọ ụtọ ịhụ ọtụtụ mmadụ ha otu a. Ma o jiri anya ya na-achọ otu onye kpọm kwem, onye ahụ ọ na-atụ ire ya egwu ma kpọkwa  ya asị.                                Ọ jụrụ Obierika sị: ‘’Ị hụla ya?’’ ‘’Onye bụ onye ahụ?.’’ ‘’Egonwanne,’’ ka ọ zara, mgbe anya ya sitere n’otu akụkụ ahịa ahụ wee ruo na nke ọzọ. Ọtụtụ n’ime ndi nwoke ahụ jiiri akpụkpọ anụ  nọrọ ọdụ n’ala. Ụfọdụ n’ime ha nọrọ ọdụ n’oche ha bu bịa.                                                              ‘’Mba,’’ ka Obierika zara ya, mgbe anya ya naara aga gburu gburu igwe mmadụ ahụ. ‘’Eee,’’ lekwa ya ebe ahụ ka ọ nọ n’okpuru osisi akwụ ahụ. ‘’Egwu, ọ na-atụ gị na ọ ga-emeda anyị obi ka anyị ghara ịga ọgụ?’’ ‘’Egwu?’’ Ihe ọbụla o mere unu agbasaghị m. Akpọrọ m ya na ndi niile na-ege ya ntị n’olu asị. Naanị m ga-alụ ọgụ a ma m chọo.’’                                                                Ha kwusiri okwu ike n’ihi na ndi ọzọ naara ekwu okwu, ebe dum dịzi ka ebe a na-azụ ahịa. Okonkwọ chere n’obi ya sị: ‘’Aga m echere ruo mgbe o kwuchara okwu, mgbe ahụ ka m ga-ekwu nke m.’’                                                                                                                                      Mgbe nwa obere oge gatụrụ, Obierika jụrụ ya sị: ‘’Kedu oti i si mara na ọ ga-ekwu megide ịga agha?’’                                                                                                                                                Okonkwọ sịrị ya: ‘’Ọ bụ n’ihi na amaara m na ọ bụ onye ụjọ.’’ Obierika anụpụchaghị ihe o kwuru n’ihi na mgbe ahụkwa ka mmadụ sitere n’azụ bitu ya aka n’ubu, ọ tụgharịrị wee kwee ihe dị ka ndi enyi ya ise ma ọ bụ isii n’aka ma keleekwa ha. N’agbanyeghị na ọ ma olu ndi ahụ, Okonkwọ atụgharịghị ihu ya ebe ha nọ. Ọnọdụ ọ nọ na ya  abụghị nke ikwe ekele. Ma otu n’ime ha bituru ya aka wee jụọ ya maka ndi ụlọ ya.                                                                                         Ọ zara nke a iji mezuo iwu sị: ‘’Ahụ dịcha ha.’’                                                                                 Onye mbụ gwara ndi Ụmụọfịa okwu n’ụtụtụ ahụ bụ Ọkịka, nke sokwa n’otu n’ime mmadụ isii ahụ a tụrụ mkpọrọ. Ọkịka bụ dike  ma bụrụkwa onye ọka okwu. Ma, o nweghị olu ahụ na-ada ụda nke onye mbụ na-ekwu okwu ga-eji mee ka  a kwụsị ime ụzụ n’ọgbakọ obodo. Onyeka nwere ụdịrị olu ahụ; ya mere e jiri gwa ya ka o kelee Ụmụọfịa tupu Ọkịka ebido kwuwe okwu.            O weliri aka ekpe ya elu wee tikuo ha sị:’’Ụmụọfịa  kwenụ Ị’’                                                            Umụọfia sikwara otu ahụ zaa ya sị: ‘’Yaa Ị’’                                                                                      O chedoro ihu ya  n’akụkụ niile wee tikuokwa ha : ‘’Ụmụọfịa kwenụ Ị’’Igwe mmadụ ahụ zakwara sị: ‘’Yaa Ị’’                                                                                                                                  Ebe dum dakwara jụụ dị ka ebe e jiiri mmiri oyi wụnyụọ ọkụ.                                                          Ọkịka waliri elu wee kelee ụmụnna ya ugboro anọ. O wee bido ikwu okwu:                                  ‘’Unu dum maara ihe anyị jiri zukọọ ebe a, mgbe anyị gaara ịdị na-arụ ọba ji anyị ma ọ bụ na-emezi ụlọ anyị, mgbe anyị gaara ịdị na-edozi mbara ezi anyị. Nna m naara agwa m sị: mgbe ọ bụla ị hụrụ awọ ka ọ na-awụgharị n’ehihie, ị mara na o nwere ihe na-achọ ndụ ya. Mgbe m hụrụ unu dum ka unu siri n’akụkụ obodo anyị  dum n’ụtụtụ a na-abịa nzukọ a ka m maara na o nwere ihe na-achọ ịnara anyị ndụ anyị.’’  Ọ kwụsịtụrụ ntakịrị,wee bidokwa ọzọ:                                            ‘’Ụmụ agbara anyị niile na-ebe akwa. Idemili na-ebe akwa. Ogwugwu na-ebe akwa, Agbala na-ebe akwa, nakwa ndi ọzọ niile. Ndi nna anyị ochie ha na-ebe akwa n’ihi mkparị na ịkwa emu ha na-enweta, nakwa ihe arụ niile nke anyị jirla anya anyị wee hụ.’’Ọ kwụsịrị ọzọ ka o wee dozie olu ya nke bidorola mawa jijiji.                                                                                                              ‘’Nke a bụ ọgbakọ pụrụ iche. Ọ dịghị obodo ọzọ ga-anya isi n’ọnụ ọgụgụ ma ọ bụ ịdị ike karịa nke a. Ma ọ ɓụ anyị dum nọ ebe a? Ana m ajụ unu: Ọ bụ ụmụ okorọbịa Ụmụọfịa dum nọ  n’etiti anyị ebe a?’’ Igwe mmadụ ahụ bidoro mewe mkpọtụ.                                                                              Ọ sịrị: “ ọ bụghị ha dum nọ ebe a. Ha etisasịala obodo anyị wee gawara ụzọ nke aka ha. Anyị bụ ndi nọ ebe a n’ụtụtụ a na-erubere  ndi nna ha isi, ma ụmụnna anyị hapụrụ anyị wee gakwuru onye ọbịa imebisi ala nna anyị. Ọ bụrụ na anyị alụso onye ọbịa ahụ agha, anyị ga-emetụta ụmụnna anyị, ma e leghị anya, anyị ga-awufu  ọbara nwadiala. Ma anyị aghaghị ime ya. Ndi nna anyị ha arọtabeghị nrọ dị otu a , ha egbubekwaghị ụmụnna ha mbụ. Ma, nwa bekee abịakutebeghị ha mbụ. Ya mere, anyị ga-eme ihe nna  anyị ha agaraghị eme. Nwa nnụnụ Eneke ka a jụrụ ihe mere o ji efegharị mgbe ọ bụla, ọ zara sị: ‘’Ụmụ mmadụ mụtara a gbaa, agbajọghị,ya mere m ji mụta e fewe ebenyeghị n’osisi ọ bụla. Anyị ga-ekpochapụ ihe arụ a. Ọ bụrụ na ụmụnna anyị esoro ụzọ ọjọọ, anyị ga-ekpochapụkwa ha. Anyị ga-eme ya ugbu a. Anyị ga-akwọ mmiri a ugbu a naani ọ nọ anyị n’kpere……’’                                                                             Ugbu a, igwe mmadụ ahụ bidoro na mberede megharịwa ahụ, anya mmadụ dum ledokwara otu ebe. O nwere ebe ụzọ ahụ sitere n’ahịa a wee ruo n’ụlọikpe nwa bekee ma gaferekwa garuo n’iyi ha, gbagọrọ agbagọ nke ukwu.Ya mere, ọ dịghị onye hụrụ mgbe ndi kọtọma ise ahụ naara abịa, wee ruo mgbe ha rutere ebe ahụ ụzọ gbagọrọ agbagọ, ka ọ fọrọ nzọ ụkwụ ole na ole ka ha bịaruo ebe igwe mmadụ ahụ nọ. Okonkwọ nọkwa ebe ahụ.                                                               Ọ maliri elu mgbe ọ hụrụ ndi ha bụ. Ọ nọchiiri onye isi ndi kọtọma ahụ ụzọ, ebe iwe na ọnụma juru ya obi nke na o nweghị ike ikwu okwu o bụla. Nwoke ahụ atụghị egwu ọ bụla wee kwụrụ ebe ọ kwụ, mmadụ anọ ndi ọzọ ahụ wee guzo ya n’azụ.                                                         Na nwa mgbe nta ahụ, ọ yiri ka ụwa niile ọ kwuụrụ otu ebe na-eche nche. Ebe dum kpuuru jii. Ndi Ụmụọfịa nọcha n’azụ osisi nakwa ahịhịa ndi toro eto, na-eche ihe ga-emenụ. Onye isi ndi kọtọma ahụ bụ onye tiwara udu ikwu okwu ọzọ. Ọ bara mba sị: ‘’Chere ka m gafere Ị’’                        ‘’Kedụ ihe ị na-achọ ebe a?’’                                                                                                     ‘’Nwa bekee bụ onye ị maara ikike ya nke ọma nyere iwu sị ka nzukọ unu a kwụsị ebe a.’’  N’otu ntabi anya ahụ, Okonkwọ mịpụtara mma ya. Onye kọtọma ahụ hulatara ka o zee ya, ma, nke a enweghị isi. Okonkwọ gburu ya mma ugboro abụọ, isi ya wee tọgbọrọ n’akụkụ ahụ ya na uwe ọrụ ya.                                                                                                                                                   Ndi ahụ nọcha n’azụ osisi bidoro mewe ụzụ aghara aghara, nzukọ ahụ wee kwụsị. Okonkwọ guzoro ebe ahụ na-ele onye ahụ o gburu. Ọ matara na ndi Umụọfịa agaghị eje ọgụ. Ọ matara nke a n’ihi na ha hapụrụ ndi kọtọma ndi ọzọ ka ha gbalaga. Ha bidoro mewe ụzụ karịa igbusi ndi ọzọ ahụ. Ọ chọpụtara na ịtụ egwu dị n’ime ụzụ ahụ ha na-eme. Ọ nụrụ olu ndi naara ajụ sị: ‘’Kedụ ihe o jiri mee nke a?’’                                                                                                                   O hichara mma ya n’aja wee lawa.

 

 

IGBO AMAKA

ỤLỌAKWỤKWỌ IGBO

MỤTA IGBO

CULTURAL DANCE

MASQUERADE

EGWU DI YA

EDEMEDE IGBO

ONYE NKUZI IGBO

OLU ỤMỤ IGBO

IGBO MADE EASY

Learn In Igbo in 1 day

Learn In Igbo

Copyright � 2018-2020. Mother Tongue Academy. All Rights Reserved.We can be  reached  by Phone at (516) 442-9191  or by our Website  Contact  E-mail