Login and Register

Log in  \/ 
x
x
Register  \/ 
x

Home

Chapt23

ISI NKE IRI ABỤỌ NA ATỌ

 

 

 

Nke a bụ mbụ Okonkwọ nwere obi aṅụrị n’ime ọtụtụ afọ. O yiri ya ka oge ndị ahụ gbanwecharala mgbe ahụ ọ gbapụrụ ọsọ ndụ, ha ana alaghachi otu ha dị na mbụ.

O jirila obi ọkụ gwa ndị obodo ya okwu mgbe ahụ ha zukọtara n’ahịa ha ikpebi ihe ha ga-eme. Ha nyerela ya ugwu wee gee ntị ihe o kwuru. Ọ dịkwa ka mgbe ochie ahụ mgbe onye agha bụụrụ onye agha. N’agbanyeghị na ha ekwetaghị igbu nwa bekee ahụ, ma ọ bụ chụpụ ndị ụka ahụ, ha kwekọrịtara ime ihe a hụrụ anya. Obi tọkwara Okonkwọ ụtọ ọzọ.

              …………………………………………………………

Abalị abụọ ha mebichara ụlọ ụka ahụ, ọ dịghị ihe ọ bụla merenụ. Nwoke Ụmụọfịa ọ bụla jiri mma ma ọ bụ egbe na-aga ebe ọ bụla ọ chọrọ ịga. Ha achọghị ka a nwụde ha n’amaghị ama dị ka ndị Abame.

Nwa D.C. siri njem nleta ya wee lọta. Mazi Smith gakwuru ya otu ihu ahụ, ha wee kọọ ogologo akụkọ. Ndị Ụmụọfịa amaghị ihe banyere nke a, ma ọ bụrụgodu na ha maara, ha chere na ọ bụghị ihe dị oke mkpa. Nwa bekee naara aga mgbe dum ihụ nwanne ya nwoke, ọ dịghị ihe pụrụ iche dị na ya.

Ka abalị atọ gachara, nwa D.C. zipuru onye nkọwa okwu ya nke ire ya na-atọ ka nnu bekee ka ọ gaa gwa ndị Ụmụọfịa na ya chọrọ ịhụ ha n’ebe isi ụlọ ọrụ ya dị. Nke ahụ abụghịkwa ihe pụrụ iche. Ọ naara akpọ ha ugboro ugboro igwa ha ụdị ‘ogologo okwu’ ahụ dị ka o si akpọ ya. Okonkwọ bụ otu n’ime ndị ndu obodo isii ahụ ọ kpọrọ oku.

Okonkwọ dọrọ ndị ọzọ aka na ntị ka ha jikere nke ọma. Ọ sịrị ha: “Nwoke Ụmụọfịa ọ bụla anaghị ahapụ ịza oku a kpọrọ ya. O nwere ike jụ ime ihe a sịrị ya mee; ọ naghị ahapụ ịga ka a sị ya mee ihe ahụ.”

Ya mere, mmadụ isii ahụ weere mma ha gawa ihụ nwa D.C. Ha ebughị egbe ha n’ihi na nke ahụ agaghị abara ha uru. A kpọbatara ha n’ụlọikpe ebe nwa D.C. ahụ nọ. O jiri obi nwayọ nabata ha. Ha nyapụtara akpa agwọ ha nakwa ọbọ mma ha, dote ha n’ala ụlọ wee nọrọ ala.

Nwa D.C. bidoro ịgwa ha okwu sị: “Akpọrọ m unu ka unu bịa n’ihi ihe ahụ mere mgbe ahụ anọghị m ya. A kọọrọla m ihe ole na ole ma ekwetabeghị m wee ruo mgbe m nụrụ olu unu. Achọrọ m ka anyị dozie okwu a dị ka enyi na enyi ma chọpụtakwa ụzọ anyị ga-esi gbochie ya ime ọzọ.

Ogbuefi Ekwueme biliri ọtọ wee bido ịkọ akụkọ ihe ahụ merenụ.

Nwa D.C. sịrị ya: “Cheretu, achọrọ m ịkpọta ndị ọrụ m ka ha nụrụ ihe bụ iwe unu nakwa ịma ọkwa unu. Ọtụtụ n'ime ha sitere n’ebe tere anya bịa, n’agbanyeghị na ha na-asụ asụsụ unu, ha amaghị ihe ọ bụla banyere omenala unu. Jemis, gaa kpọta ndị ahụ.”

Onye nkọwa okwu ya ahụ hapụrụ ụlọ ikpe ahụ pụwa, na mgbe na-adịghị anya, ọ kpọọrọ ndị nwoke iri na abụọ wee lọta. Ha gara nọnyere ndị Ụmụọfịa ahụ, Ogbuefi Ekwueme wee bidokwa ịkọ akụkọ ahụ otu Enọkụ siri gbuo otu egwugwu.

Ihe mere ugbu a mere oke ngwa ngwa nke na mmadụ isii ahụ amaghị mgbe o jiri mee. Ha nwetụrụ ntakịrị ọgbaghara nke na o nyeghị ha ohere ịmịpụta mma ha n’ọbọ ya. A dọrọ mmadụ isii ndị ahụ ọkpọ, ma ọ bụ, kee ha agbụ n’aka wee kpụba ha n’ụlọ mkpọrọ.

Mgbe e mechara, nwa D.C. gwara ha okwu sị: “Anyị agaghị emerụ unu ahụ ọ bụla ma ọ bụrụ na unu ekweta inyere anyị aka. Anyị ewetarala unu na ndị obodo unu usoro ọchịchị udo ka obi wee dị unu mma. Ọ bụrụ na o nwere onye na-esogbu unu, anyị ga-abịa zọpụta unu. Ma, anyị agaghị ekwe ka unu sogbuo ndị ọzọ. Anyị nwere ụlọikpe ebe anyị na-eleba anya n’esemokwu ọ bụla ma kpeekwa ikpe ziri ezi dị ka anyị si eme ya n’obodo m n’okpuru otu nnukwu eze nwanyị. Akpọtara m unu ebe a n’ihi na unu jikọtara ọnụ na-akparị ndị ọzọ, na-agba ụlọ obibi nakwa ụlọ ụka ndị mmadụ ọkụ. Nke ahụ agaghị eme n’okpuru ọchịchị eze nwanyị nke bụ eze kachasị ike n’ụwa dum. Ekpebiela m na unu ga-akwụ narị akpa ego ayọrọ abụọ. A ga-atọhapụ unu ngwa ngwa unu kwetara nke a, ma kpebiekwa ịnakọta ndị unu nha ahụ. Kedu ihe unu nwere ikwu maka nke a?”

Ihe a enyeghị mmadụ isii ndị a ọnụ okwu, nwa D.C. hapụtụrụ ha pụọ. Mgbe ọ naara apụ n’ụlọ mkpọrọ ahụ, ọ gwara ndị kọtọma ya ka ha nye ndị ahụ ugwu ruuru ha n’ihi na ha bụ ndị ndu Ụmụọfịa. Ha sịrị ya “ooo, nna anyị ukwu!” wee gbuchaara ya.

Ngwa ngwa ahụ nwa D.C. hapụrụ, onye isi ndị kọtọma ahụ, nke bụkwa onye na-akpụ ndị mkpọrọ isi, weputara agụwa ya wee kpụchapụ ndị ahụ ntụtụ isi ha. Agbụ ahụ ka dịkwa ha n’aka, ha nọsọ ọdụ ebe ahụ na-ele n’anya ka atụrụ.

Ndị kọtọma ahụ mara ha njakịrị sị: “Kedu onye bụ eze unu?” Anyị hụrụ na onye ụkpa ọ bụla na-agba eriri ọzọ n’Ụmụọfịa. Ọnụ ahịa ya, ọ na-eru ego ayọrọ iri?”

Mmadụ isii ndị ahụ erighị ihe ọ bụla ụbọchị ahụ nakwa echi ya. Ọ bụghịdị mmiri ọṅụṅụ ka e nyere ha, n’ihi ya, ha enweghị ike ịpụ ezi gaa nyụọ mamịrị ma ọ bụ gaa n’ọhịa nyụọ nsị. N’abalị, ndị kọtọma ahụ bịara ịkọ ha ọnụ nakwa ịkụkọta ha isi ahụ ha kpụrụ ha ọnụ.

Ọ bụladị mgbe a hapụrụ naanị ha, ha ahụghị ọnụ ha ji akparịta ụka. Ọ bụ naanị n’ụbọchị nke atọ mgbe ha na-enwekwaghị ike idili agụụ na mkparị ahụ ka ha bidoro kwuwe otu ha ga-esi mee ihe ahụ.

Okonkwọ jiri iwe sị: “A sị na unu gere m ntị, anyị gaara igbu nwa bekee ahụ.”

Otu n’ime sịrị ya: “ Anyị gaara inọ n’Ụmụrụ ugbu na-eche ọnwụ anyị.”

Otu onye kọtọma nke gbatara mgbe ahụ, jụrụ ha sị: “ Kedu onye chọrọ igbu nwa bekee?” Ọ dịghị onye kwuru okwu.

“Arụ nke unu mere ejubeghị unu afọ, kama unu ga-achọ igbu nwa bekee n’elu ya.” O jiri otu apịpịa buru ibu wee piakasịa ha n’isi nakwa azụ ha. Obi iro na ọnụma ekweghị Okonkwọ megharịa ahụ.

               ………………………………………………………

Ozugbo ahụ a kpọchichara mmadụ isii ndị ahụ, ndị kọtọma gara n’Ụmụọfịa na-agwa ndị obodo na a gaghị ahapụ ndị ndu ha karịa ma ha kwụrụ nha narị akpa ego ayọrọ abụọ na iri ise.

Onye isi ha gwara ndị obodo sị: “Naanị ma unu kwụrụ nha ozugbo ozugbo, anyị ga-akpụgara nwa D.C. ndị ndu unu n’Ụmụrụ ka o gbuo ha.”

Akụkọ a gbasakwara otu ihu ahụ n’obodo dum; ọ na-aga, ha ana-etinye ya unu. Ụfọdụ sịrị na a kpụgalarị ndị a n’Ụmụrụ bụ ebe a ga-akpọgbu ha n’echi ya. Ndị ụfọdụ sịrị na a ga-akpọgbukwa ndị ezinaụlọ ha. Ndị ozọ sịrị na ndị agha nọrịị n’ụzọ ịbịa gbagbusịa ndị Ụmụofịa dị ka ha mere n’Abame.

Mgbe ahụ bụụrụ mgbe ọnwa na-apụta n’uju, ma n’abalị ahụ, a nụghị olu ụmụaka ọ bụla. Mbara ilo nke obodo, bụ ebe ha na-anọ egwu egwu ọnwa tọgbọrọ chakoo. Umụ nwanyị Iguedo ezukọtakwaghị ebe nzuzo ha ahụ ịmụ egwu ọhụrụ nke ha ga-ebupụtara ndị obodo na mgbe dị n’ihu. Ụmụ okorọbịa bụ ndị na-apụkarị ije abalị mgbe ọnwa na-eti, chedochara ụlọ ha n’abalị ahụ.

Ọ dighị onye nụrụ olu ha n’abalị ahụ n’ụzọ ọhịa obodo ha, ka ha naara aga ileta ndị enyi ha na ndị iko ha. Ụmụọfịa dizi ka anụ nke e mesuru n’ime ọhịa, nke ntị ya guzocha ọtọ, ọ na-achịchagharị anya na-amaghị ebe ọ ga-agbaga.

Mkpọtụ ndị obodo nụrụ ugbu a bụ nke onye ọkụekwe ka ọ naara akụ ogele ya. Ọ kpọkuru nwoke ọ bụla n’Ụmụọfịa, bido n’uke Akakamma gbagowe, ka ha zukọọ na mbara ahịa ma ha richaa nri ụtụtụ echị ya. Ọ gazuchara Ụmụọfịa dum. O dịghị okporo ụzọ ọ bụla ọ hapụrụ.

Ezinaụlọ Okonkwọ dị ka ebe a gbara ọsọ agha. Ọ dị ka ebe a wụrụ mmiri oyi. Ndị ezinaụlọ ya dum nọ ya, ma, ha jiri olu dị nta na-ekwurịta okwu. Ada ya Ezimma siri ebe ọ gara ije otu ọnwa n’ụlọ di ga-alụ ya lọta mgbe ọ nụrụ na a tụrụ nna ya mkpọrọ wee na achọkwa ịkwụgbu ya. Ngwa ngwa ọ lọtara ụlọ, ọ gakwuru Obierika ịjụ ya ihe ndị Umụọfịa na-achọ ime banyere ihe ahụ. Ma, Obierika anọghị n’ụlọ kemgbe ụtụtụ. Ndị inyom ya chere na ọ gara nzukọ nzuzo. Afọ juru Ezimma na o nwere ihe ndị obodo na-akwado ime.

N’ụtụtụ, mgbe onye ọkụekwe rịọchara ụmụ nwoke ndị Ụmụọfịa, ha zukọtara na mbara ahịa ha wee kpebie na ha ga anakọta narị akpa ego ayọrọ abụọ na iri na ise ahụ na-etufụghị oge, iji mee ka obi dị nwa bekee mma. Ha amataghị na akpa iri ise ga-agara ndị kọtọma ahụ bụ ndị welirila ọnụ ego ahụ maka nke akpa ha.

 

 

IGBO AMAKA

ỤLỌAKWỤKWỌ IGBO

MỤTA IGBO

CULTURAL DANCE

MASQUERADE

EGWU DI YA

EDEMEDE IGBO

ONYE NKUZI IGBO

OLU ỤMỤ IGBO

IGBO MADE EASY

Learn In Igbo in 1 day

Learn In Igbo

Copyright � 2018-2020. Mother Tongue Academy. All Rights Reserved.We can be  reached  by Phone at (516) 442-9191  or by our Website  Contact  E-mail