Login and Register

Log in  \/ 
x
x
Register  \/ 
x

Home

Chap3-Ise Nke Atọ

ISI NKE ATỌ

 

  

Okonkwọ ebidoghị ndụ ya dị ka otu ụmụ okorọbịa ndị ọzọ si ebido. Ọ dịghị ọba ji nke o ritere n’aka nna ya n’ihi na ọ dịghị nke  o nwere. Akụkọ kọrọ n’Ụmụọfịa ka nna ya bụ Ụnọka siri gakwuru agbara obodo ha ịjụ ya ihe mere na ihe ọ kụrụ n’ubi ya anaghị eme nke ọma.

 

Aha agbara ahụ bụ Agbala. Ndị mmadụ na-esi ebe tere anya bịa  ịchọpụta ihe na ya. Ha na-abia mgbe ọ bụla ha nwere ihe ọdachi ma ọ bụ mgbe ha na ndi agbata obi ha nwere esemokwu. Ha na-abịa ịchọpụta ihe ọdịnihu ha ga-abụ ma ọ bụ ịkpọku mmụọ nna ha nwụrụ anwụ.

 

Ụzọ e si aga n’ihu agbara ahụ bụ site n’otu ọnụ nke dị n’akụkụ ugwu. Ọnụ a ji ntakịrị ihe karịa ọnụ mpio n’ụlọ ọkụkọ. Ndị na-efe agbara ahụ nakwa ndị na-abịa ịchọpụta ihe na-akpụ n’ala site n’ọnụ ahụ ha ewee pụta n’otu ebe sara mbara ma gbakwa ọchịchịrị nke bụ n’ihu Agbala. Ọ dịbeghị onye hụrụla Agbala na-abụghị naanị isi nwanyị na-efe ya. Ọ dịbeghịkwa onye ọ bụla jiri afọ ya kpụruo n’ihu agbara pụta nke na-anaghị atụ ike ya egwu.

 

Eze nwanyị agbara na-eguzo n’akụkụ ọkụ dị nso nke ọ mụnyere n’etiti oghere ala ahụ bụ ebe ọ na-anọ agụpụta iwu agbara ahụ. Ọkụ ahụ anaghị eji ire ọkụ enwu. Ovoko ọkụ na-esite na nkụ ahụ na-eme ka a na-ahụchatụ onyinyo eze nwanyị ahụ.

 

 Mgbe ụfọdụ ndị nwoke na-abịa ijụ mmụọ nna ha ma ọ bụ nwanne ha nwụrụ anwụ ajụjụ. A na-asị na mgbe ọ bụla mmụọ ahụ pụtrara, onye ahụ ga-ahụ onyinyo ya n’ọchịchịrị na-anụghi okwu ya. Ndị ụfọdụ na-asị na ha na-anụ ka ndị mmụọ ahụ na-efegharị na-akụgharị nku ha ,n'elu ụlọ ahụ.Ọtụtụ afọ gara aga mgbe Okonkwọ dị na nwata, nna ya Ụnọka gara ịhụ agbala. Eze nwanyị Agbala n'oge ahụ bụ Chika. Ike ya n'ebe agbara ahụ dị buru ibu n'ihi ya ndị mmadụ naara atụ ya egwu. Ụnọka guzoro n’ihụ ya wee malite akụkọ ya.

 

Kwa afọ, tupu m bido kọnyewe ihe n’ala, ana m ebu uzọ gbuoro Anị bụ onye nwe ala dum ọkụkọ. Nke a bụ omenala nna anyị ha. Ana m egburukwa Ifejiọkụ chi nke nwe ji ọkụkọ. Ana m asụcha ọhịa, mụnyekwa ya ọkụ mgbe ihe niile kpọrọla nkụ. Ana m eji mmiri mbụ na-akọnye ji m ma na-elekọtakwa ome ha anya ma ha pulite. Ana m abọchakwa ha ahịhịa. Ihe ndị a ka o jiri obi ilu kwuo.

 

Eze nwnayị agbara ahụ gbojara ya sị, “ Kwuchie ọnụ gị. ị meghi ihe ọjọọ ọ bụla megide ụmụ agbara ma ọ bụ ndị nna gị ochie. Mgbe ọbụla mmadụ na ụmụ agbara nakwa nna ya ochie dị n’udo, mkpụrụ nke ubi ya ga-adị mma ma ọ bụ njọ site n’ike nke aka ya. Gị bụ Ụnọka, bụ onye a ma ama gburu gburu obodo anyị site n’umengwu ọgụ na mma gị. Mgbe ndị ibe  gị na-achịrị mma ha asụ oke ọhịa ọhụụ, ị na-akọ ji gị n’ala gbabọrọla agbabọ ebe anaghị ara gị ahụ ịsụcha. Ha na-agafe mmiri asaa na-arụ ọrụ ma ị na-anọ n’ụlọ na-achụrụ ala na-adịghị mma ịkọ ihe aja. Laa gaa rụwa ọrụ dị ka nwoke.”

 

Ụnọka bụ onye chi ọjọọ. Ụwa ọjọọ sooro ya laa n’ili, ma ọ bụ ruo n’ọnwụ ya n’ihi na o nweghị ili. Ọrịa gburu ya bụ ahụ ọzịza. Nke a bụ arụ n’ihu agbara nwe ala. A naghị ekwe ka onye afọ toro nakwa onye ụkwụ zara nọrọ n’ụlọ nwụọ. A na-ebufu ya n’ajọ ọhịa ka ọ nwụọ ebe ahụ. Otu nwoke isi ike ka a sịrị na ọ gaara ka onye mmanya na-egbu lọghachi n’ụlọ ya, E bughachiri ya azụ n’ọhịa ma kedokwa ya n’osisi. Ọria a bụ arụ nye ala n’ihi ya a naghị eli ndị ọrịa gburu n’ala. Ọ na-anwụ ma retọọ n’elu ala. A naghị eli ma kwaakwa  onye dị otu a. Otu a ka e mere Ụnọka. Mgbe e bufuru ya, o were ọja ya.

 

Site n’inwe nna dị ka Ụnọka, Okonkwọ ebidoghị ndụ ya dị ka otu ọtụtụ ụmụ okorọbịa ndị ọzọ siri bido. Ọ dịghị ọba ji ma ọ bụ echichi ọ bụla ọ ritere, ọ bụladị nwunye ọhụụ. Na-agbanyeghị ihe ndọghachi azụ ndi a, Okonkwọ bidoro mgbe nna ya ka nọ ndụ tọwa ntọ ala iji bie ndụ bara uru. Ọ bụ ndụ ahụhụ na ndụ na-akpụ akpụ ma na Okonkwọ were ike ya niile tinye n’ime ya dị ka onye ihe ji aka. N’ezie, ihe ji ya aka bụ egwu ndụ ure na ọnwụ ihere nke nna ya.

 

Otu nwoke bara ụba nke ukwu biri n’obodo Okonkwọ. Nwoke a nwere ọba ji atọ buru ibu, nwunye toolu na ụmụ iri  atọ. Aha ya bụ Nwakibie. O chiela otu echichi kacha ibe ya elu nke nwoke nwere ike ichi n’obodo. Ọ bụ nwoke a ka Okonkwọ rụụrụ ọrụ iji nweta ji mbụ ọ kọrọ.

 

O buuru otu ite mmanya na otu oke ọkụkọ wegara Nwakibie. Nwakibie ziri ozi ka a kpọrọ ya ndi okenye agbata obi ya abụọ n'obi ya bụkwa ebe ụmụ ya abụọ ndị torola eto nọ. O chere ha ọjị na ose ọjị n’ihu. E gosichara ya ndị dum nọ ebe ahụ ma bughachikwara ya. Ọ waara ọjị ahụ sị: “ Anyị niile ga-ebi. Anyị na-arịọ maka ndụ, ọmụmụ, ezigbo owuwe ihe ubi nakwa obi ụtọ. Ị ga-enwe ihe dị gị mma ebe mụ onwe m ga-enwekwa ihe dị m mma. Egbe bere, ugo bere, nke sị ibe ya ebela, nkụ kwaa ya.

 

Mgbe ha tachara ọjị, Okonkwọ buputara mmanya ya ebe o detere ya n’otu akụkụ ụlọ ahụ wee dote ya n’etiti ndị nọ ebe ahụ.

Ọ kpọrọ Nwakibie sị, ‘ Nna anyị, ewetaara m gị ntakịrị ọjị a. Ndi ebe anyị sị na onye na- akwanyere dike ugwu na-edozikwa ụzọ dike nke ya. Abịara m inye gị nsọpụrụ nakwa ịrịọ gị arịrịọ kama ka anyị burugodu ụzọ ṅụchaa mmanya.”

 

Mmadụ dum kelere Okonkwọ ebe ndị agbata obi ahụ weputachara iko mmanya ha site n’ime akpa ajị ha. Nwakibie weturu iko nke ya ebe o kowere ya n’uko. Nke nta n’ime ụmụ ya ahụ bụkwa onye bụkarịsịrị nwata n’ime ndị nọ ebe ahụ, pụtara n'ọgbọ were ụkwụ aka ekpe ya bulie ite mmanya ahụ wee malite ịgba ya bụ mmanya. O nyere Okonkwọ iko nke mbụ, n’ihi na ọ ghaghị ibu ụzọ ṅụtụ mmanya tupu onye ọ bụla ọzọ. Ndị ọzọ ṅụkwara mmanya ahụ bido n’onye kachasị mee okenye. Mgbe mmadụ dum ṅụrụla iko abụọ ma ọ bụ atọ, Nwakibie kpọrọ ndị nwunye ya. Ụfọdụ n’ime ha anọghị n’ụlọ. Naanị mmadụ anọ bịara.

 

Ọ jụrụ ha sị, “ Anasị, o nọghị ya?” Ha sịrị ya na ọ na-abia. Anasị bụ isi nwanyị ya, ndị ozo agaghị ebu ya ụzọ ṅụọ mmanya, n’ihi ya ha kwụụrụ na eche ya.

Anasị bụ nne nwanyị tojuru etoju ma siekwa ike. Onye ọ bụla hụrụ ya ga-ekweta na o nwere ike ịchịkọta ndị inyom ibe ya nezi na ụlọ a buru ibu ma baakwa ụba. Ọ gba ọdụ echichi di ya nke naanị isi nwanyị na-agba.

 

O garutere ebe di ya nọ ma narakwa ya mpi mmanya ahụ. O bidoro otu ikpere ya n'ala, ṅụrụtụ ntakịrị wee bunyeghachi di ya mpi ahụ. O biliri, tuo ya aha ya wee laghachị azụ nụlọ ya. Ndị nwunye di ya ndị ọzọ sikwara otu ahụ ṅụọ mmanya ahụ nusoro ha, wee pụọkwa.

 

Ụmụ nwoke ndị a gara n'ihu na-aṅụ mmanya na-akọrịkwa akụkọ. Ogbuefi Idigo naara akọ ihe gbasara Obiakọ onye diochi nke kwusịrị ikụ ngwọ na mberede.

 

O jiri azụ aka ekpe ya hichapụ ụfụfụ mmanya mesara ya nafụọnụ ya wee sị  O nwerịrị ihe kpatara ya, nihi na awọ anaghị agba osọ ehihie nefu.

 

Akụkalịa kwuru sị : “ Ụfọdụ mmadụ sịrị na Agbala dọrọ ya aka na ntị na ọ ga-esi n'elu daa ma gbuokwa onwe ya.

 

Nwakibie sịrị na: “ Obiakọ bụ onye a na-amataghị ndụ ya. Anụrụ m na ọtụtụ afọ gara aga, mgbe nna ya ka nwụrụ ọhụrụ, na ọ gara ịkpọtụrụ Agbala. Agbala gwara ya sị, “nna gị nwụrụ anwụ chọrọ ka I gbuoro ya ewu”. Unu ma ihe ọ gwara Agbala? Ọ sịrị, “ jụọro m nna m nwụrụ anwụ ma o nwere ọkụkọ mgbe ọ nọ ndụ?” Onye ọ bụla n’ime ha jiri obi ya niile chịa ọchị ma e wezuga Okonkwọ bụ onye na-achịghị n'ihi na obi anaghị adị agadi nwanyị mma ma a tụọ ilu nkirịnka nkata. O chetara nna nke ya. N’ikpeazụ nwa okorọbịa ahụ na-agba mmanya welitere otu mpi mmanya nke ike mmanya ọcha rọrọ arọ gara ọkara, wee sị: “ Ihe anyị na-eri agwụchaala.” Ndị ozọ zara sị:anyị ahụla ya.''Ọ jụrụ ha ọzọ sị “ Onye ga-aṅụ ike mmanya a?” Idigo jiri isi anya ya rọọ Igwelo diọkpara Nwakibie anya wee sị: “ Ọ bụ onye o bụla ji ọrụ n’aka.”

 

Mmadụ dum kwetara na Igwelo ga-aṅụ ike mmanya ahụ. Ọ naara nwanne ya nwoke iko ahụ ma ṅụọkwa ya. Dị ka Idigo kwuru, Igwelo ji ọrụ n’aka n’ihi na ọ ka lụrụ nwunye mbụ ya n’ime otu ọnwa ma ọ bụ abụọ gara aga. A sịrị na ike mmanya dị otu a na-adị ụmụ nwoke na-abakwuru nwunye ha mma n’ahụ. Mgbe ha ṅụchara mmanya ahụ, Okonkwọ kọsaara Nwakibie mkpa ya.

 

Ọ sịrị ya, “ Abịara m ka i nyere m aka. E leghị anya, i nwere ike ịkọta ihe ọ bụ. Asụchaala m ụbi m ma enweghi m ji m ga-akọ. Ama m ihe ọ putara mmadụ inye ibe ya ji, ọ kachasị n’oge ugbu a ụmụ okorọbịa na-atụ ụjọ ịrụ oke ọrụ. Ujọ orụ anaghị atụ m. Ngwere siri n’elu daa n’ala sịrị na ya ga-eto onwe ya ma ọbụrụ na ọ dịghị onye ọzọ toro ya. Ebidoro m lekọtawa onwe m anya mgbe ọtụtụ ndị ọzọ ka na-aṅụ nne ha ara. Agaghị m ete gị unyi n’ihu ma ọ bụrụ na i nye m ji.”

 

Nwakibie kwara ụkwara. Ọ na-atọ m obi ụtọ ịhụ nwa okorọbịa dị ka gị n’oge ugbu a ụmụ okorọbịa anyị adịkwaghị ike. Ọtụtụ ụmụ okorọbịa abịakwutela m ka m nye ha ji ma na ajụrụ m n’ihi na amatara m na naanị ihe ha ga-eme bụ ikọnye ha n’ala hapụkwa ha ahịhia gbuo ha. Mgbe m jụrụ ha, ha chere na m nwere obi ike, ma o bụghị otu ahụ. Nwa nnụnụ Eneke sịrị na ke mgbe ụmụ mmadụ jiri mụta a gbaa a gbajọghị ka ya jiri mụta e fewe e benyeghị. Amutala m inwe aka ike n’ebe ji m dị. Ma enwere m ike ịtụkwasị gị obi. Ugbu a m na-ele gị anya, amatara m nke a. Dị ka nna anyị ha kwuru, a na-ama ọka chara acha site n’udịdị ya. Aga m enye gị narị ji asatọ. Gaa n’ihu mezie ubi gị.”

 

Okonkwọ kelere ya ugboro ugboro wee jiri obi ụtọ laa. Ọ matara na Nwakibie agaghị ajụ inye ya ma ọ mataghị na ọ ga-emeru ya otu ahụ. O nweghị olile anya inata ihe karịrị narị ji anọ. Ugbu a ọ ga-akọ ubi buwanyere ibu. O nwekwara olile anya inweta narị ji anọ ọzọ site n’aka otu enyi nna ya n’Isiụzọ.

 

A rụta e kee bụ ụzọ na-akpụ akpụ mmadụ na-esi enweta ọba nke aka ya. Naanị ihe onye ahụ na-enweta bụ otu ụzọ n’ụzọ atọ n’ahụhụ niile ọ tara. Ma nwa okorọbịa nna ya na-enweghị ji, ọ dịghị ụzọ ọzọ ọ ga-esi nweta nke ya na-abụghị n’ụzọ a. Ebe nke Okonkwo siri kara njọ bụ na ọ na-esite na ntakịrị ihe ọ na-arụpụta akwado nne ya na ụmụnne nwanyị abụọ. Ikwado nne ya pụtakwara ịkwado nna ya. A gaghị ele ya anya ka ọ na-esi na-eri ma di ya ana anwụ n’agụụ. N’ihi ya, mgbe Okonkwo ka dị na nwata, bụkwa mgbe ọ na-agbalisi ike ka o nwee ọba nke ya, ọ nakwara elekọta ezi na ụlọ nna ya anya. Ọ dị ka ebe a na-awụye mkpụrụ ọka n’akpa nwere ọtụtụ ohere. Nne ya na ụmụ nne ya nwanyị na-agbalịsi ike n’ọrụ, ma na ha na-akọ mkpụrụ akụkụ ubi nke ụmụ nwanyị dị ka ede, agwa na akpụ. Ji, isi mkpụrụ ubi bụ aka ọrụ nwoke.

 

Afọ ahụ Okonkwo natara Nwakibie narị ji asatọ bụ afọ jọkarịchara njọ na ndụ ya. O dịghị ihe ọ bụla mere n’oge ya. Ma ọ bụghị na ọ gbara oke ụzọ, ọ bụrụ na o bidoghị n’oge. Ọ dizi ka ụwa ọ gbapụla ara. Mmiri mbụ ebidoghị n’oge, mgbe ọ bịara, o doro naanị obere oge. Anwụ bidokwara chawa otu ọ chabeghị mbụ wee chagbuchaa ahịhia niile jiri mmiri ahụ pụte. Ala na-ere ọkụ ka ebe a munyere ọkụ wee rekpọchaa ji niile a kọnyerela n’ala. Di ka ezigbo ndị ọrụ ubi ọzọ, Okonkwọ jiiri mmiri mbụ ahụ kọwa ji ya. Ọ kọnyela narị ji anọ n’ala tupu miri ahụ alaa anwụ wee bido chawa. Ọ naara ele anya n'elu igwe kwa ụbọchị ka ọ mara ma mmiri ọ ga-edo, ebe ọ naghịkwa arahụ ụra abalị. Kwa ụtụtụ ọ na-aga n'ubi ya ele ome ji ka ha na-akpọwụ. Ọ nwara ike ya ya iji gbochie anwụ ichagbu ha site n’iji ahịhịa emere na ndo. Ma noge anyasị, ahịhịa ndị a gaakpọwụcha site n'okpomọkụ. Ọ na-agbanwe ha kwa ụbọchị ma na-ekpekwa ekpere ka mmiri doo n’abalị. Ma ala akọrọ ahụ dịịrị ruo izu ahia asatọ wee gbuchaa ji dum.

 

Ụfọdụ ndị ọrụ aka kọnyebeghị ji ha. Ndị a bụ ndị umengwu, ndi na-adịghị ebido ikọ ihe n’oge. N’afọ a, ha abụrụla ndị amamihe. Ha meere ndị agbata obi ha ebere site n’ifufe isi ha nke ukwuu, ma n’ime onwe ha, ha nwere obi aṅụrị n’ihi ihe ha kpọrọ nleru anya ha.

 

Okonkwọ kọrọ ji ya ndi fọdụrụ mgbe mmiri lọtara n’ikpeazụ. O nwere otu ihe nkasị obi. Ji ndi ahụ ọ kọrọ tupu ala akọrọ ahụ bụ ndị nke ya bu ndị o nwetara n’afọ gara aga. Ọ ka nwere narị asatọ ahụ ọ natara Nwakibie nakwa narị anọ ahụ ọ natara enyi nna ya. N’ihi ya, ọ ga-ebido n’isi. N’ezie, ala mebiri n’afọ ahụ. Mmiri doro otu o dobeghị mbụ. Mmiri dogidesiri ike ehihie na abalị, ọtụtụ ụbọchị wee busasịa okwu ji a kọrọ akọ. O butuchara osisi ma gwuokwa olulu ebe niile. O wee belata, ma na, ọ gara n’ihu site n’ụbọchị ruo n’ụbọchị na-akwụsịghị akwụsị. Anwụ ahụ naara acha n’oge udu mmiri apụtaghị. Ji bidoro weputawa ezigbo akwukwọ ndụ ma na onye orụ ubi ọ bụla matara na ọ bụrụ na anwụ achaghị, ji ndị ahụ agaghị eru eru.

 

Owuwe ihe ubi nke afọ ahụ bụ ihe iri uju. Ọ dị ka ebe a na-eli ozu n’ihi na ọtụtụ ndị ọrụ ubi bere akwa mgbe ha naara egwupụta ji ha recharala ere. Otu onye weere akwa ya kedo n’alaka osisi wee kwụọ ụdọ.

 

Na ndụ ya niile, Okonkwọ jiiri akpata oyi cheta afọ ọjọọ ahụ. Ọ na-agba ya gharịi na ya adabaghị n’ọnwụnwa n’oge mgbu ahụ. Ọ matara na ya na-alụ ọgụ ka agụ ma ihe mere n'afọ ahụ nwere ike itiwa obi agụ.

 

Mgbe ọ bụla ọ na-asị: “ ebe m lụgburu afọ ahụ, aga m alụgbu ihe ọ bụla.” O jiri okwu a kere ekpe ya.

 

Nna ya Ụnọka nke nọ n’ute ọrịa n’oge ahụ gwara ya sị: “Adala mba. Ama m na ị gaghị ada mba n’ihi na ị bụ nwoke nwere obi ike. Mkpụrụ obi ọ bụla na-anya isi na-emeri ihe ọdachị zuru ọha ọnụ n’ihi na ọdachị dị otu a anaghị emerụ ugwu ya. Ọ na-aka njọ ma sikariakwa ike ma ọ bụrụ naanị otu onye nwere ọdịda dị otu a.”

 

Ụnọka dịrị otu a n’ụbọchị ọgwụgwụ ya. Ihunanya o nwere n'ekwurekwu bawanyere ụba site n'ọrịa nakwa ịka nka.

 

 

 

 

IGBO AMAKA

ỤLỌAKWỤKWỌ IGBO

MỤTA IGBO

CULTURAL DANCE

MASQUERADE

EGWU DI YA

EDEMEDE IGBO

ONYE NKUZI IGBO

OLU ỤMỤ IGBO

IGBO MADE EASY

Learn In Igbo in 1 day

Learn In Igbo

Copyright � 2018-2020. Mother Tongue Academy. All Rights Reserved.We can be  reached  by Phone at (516) 442-9191  or by our Website  Contact  E-mail