Login and Register

Log in  \/ 
x
x
Register  \/ 
x

Home

Chap7-Isi Nke Asaa

 ISI NKE ASAA

 

 

Afọ atọ ka Ikemefuna biri n’ụlọ Okonkwọ. O wee dịzi ka ndị ichie Ụmụọfịa echefuola ihe gbasara ya. O toro poko poko ma gbaakwa dimkpa dị ka ome ji na-epu n’udu mmiri. Ha nabatara ya nke ọma n’ezinaụlọ ọhụrụ ya. Ọ dị ka ọ bụ ya tọrọ Nwoye na nwanne. Site n’isi mbido, ọ dị ka o tinyela ndụ ọhụrụ n’ime Nwoye. O mere ya ka onye torola eto; Ha adịghịkwa anọ n’usekwu n’anyasị ele nne Nwoye mgbe ọ na-esi nri, kama ha na Okonkwọ na-anọ n’obi ya, ma ọ bụ na-ele ya anya mgbe ọ na-akụ ngwọ anyasị. Ọ dịghị ihe na-atọkarị Nwoye ugbu a ka nne ya ma ọ bụ ndị nwunye nna ya ịkpọ ya ka ọ bịa rụọrọ ha ọrụ ndị ahụ siri ike nwoke na-arụ n’ụlọ dị ka ịwa nkụ ma ọ bụ ịsụ nri. Ọ bụrụ na o nweta ụdịrị ozi a site n’aka nwanne ya nta, ọ ga-eme ka iwe ana-ewe ya ma kwuputa ntamụ ya n’ihe gbasara ụmụ nwanyị na nsogbu ha.

N’ime onwe ya, obi na-atọ Okonkwọ ụtọ ka nwa ya nwoke si etoputa. Ọ matara na ọ bụ Ikemefuna kpatara nke a. Ọ chọrọ ka Nwoye bụrụ nwa okorọbịa gbasiri ike nke ga-enwe ike ịchịkọta ezinaụlọ nna ya mgbe ya nwụrụ wee lakuru ndị nna nna ya ha. Ọ chọrọ ka ọ bụrụ onye bara ụba nwekwa ọtụtụ ji n’ọba ya ka o wee nwee ike ịna-achụrụ ndị nna ya ochie aja mgbe ọ bụla. Ya mere obi ji adị ya ụtọ mgbe ọ bụla ọ nụrụ ka Nwonye na-atamu gbasara ụmụ nwanyị. Nke a gosiri na mgbe oge ruru, ọ ga-enwe ike ịchịkọta ụmụ nwanyị. Na-agbenyeghị ka nwoke siri baa ụba, ọ bụrụ na o nweghị ike ịchịkọta ndị inyom ya na ụmụaka ya (ọ kachasị ndị inyom ya), ọ bụghị nwoke n’ezie. Ọ dị ka nwoke a na-agụ n’egwu nke nwere ndị inyom iri na otu ma ọ naghị enwe ofe na-ezuru ya nri.

Ya mere Okonkwọ na-akwado ụmụaka ahụ ka ha na-anọdebe ya n’obi ya. Ọ na-akọrọ ha akụkọ gbasara ala ha, akụkọ ụmụ nwoke gbasara ọgbaghara na ịwụfu ọbara. Nwoye matara na o kwesiri ka nwoke ọ bụla gbasie ike ma mewekwa gara gara, ma ka o sina dị ọ ka na-ewerekwa akụkọ ndị ahụ nne ya na-akọ, bụkwa nke ọ ka na-akọrọ ụmụnne ya ndị obere, akụkọ banyere mbekwu na ụzọ aghụghọ ya, akụkọ banyere eneke ntị ọba bụ onye rịorọ ụwa niile mgba ma nwamba ewee tụọ ya n’ala. O chetara akụkọ ọ na-akọrọ ha mgbe ụfọdụ banyere esemokwu eluigwe na ala na mgbe gara aga, otu eluigwe siri kpọchie mmiri ozuzo afọ asaa, mkpụrụ akụkụ niile wee kpọọ nkụ ma nwụsia nakwa otu ala nkume siri na-agbajicha ọgụ ndị mmadụ nke mere ka ha gharakwa ịna-eli ndị nwụrụ anwụ. N’ikpeazụ, e dupuru udele ka ọ gaa rịọ eluigwe ma medakwaa ya obi site n’ịgụrụ ya egwu gbasara ahụhụ ụmụ mmadụ na-ata. Mgbe ọ bụla nne ya gụrụ egwu a, ọ na-adị Nwoye ka ọ nọ n’eluigwe ebe udele, onye ozi ala, na-agụ egwu obi ebere a. N’ikpeazụ, eluigwe nwere ọmịịko wee nye udele mmiri o jiri mpoto ede wee kechie. Ka udele na-alọta, o jiri ọnụ ogologo ya tufuọ akwụkwọ ede ahụ, mmiri wee zoo otu o zebeghị mbụ. Mmiri a masiri udele ike nke mere na ọ lọtakwaghị bịa zie ozi ya kama o fegara n’otu obodo dị anya ebe ọ hụrụla ọkụ. Mgbe o ruru ebe ahụ, ọ chọpụtara na ọ bụ otu nwoke naara achụ aja. Ọ nyakọrọ onwe ya n’ọkụ ahụ ma riekwa ụmụ irighiri ihe sitere n’aja ahụ.

Ụdị akụkọ a ka Nwoye chọrọ. Ma ugbu a, ọ matara na ha bụ akụkọ ụmụ nwanyị na ụmụaka. Ọ matakwara na nna ya chọrọ ka ọ bụrụ nwoke. Ya kpatara o ji mee ka a ga-asị na ọ chọkwaghị akụkọ ụmụ nwanyị. Mgbe o mere nke a, ọ chọpụtara na obi tọrọ nna ya ụtọ, na ọ dịghị kwa abara ya mba ma ọ bụ ikụ ya ihe.

N’ihi ya, Nwoye na Ikemefuna na-ege ntị n’akụkọ Okonkwọ na-akọrọ ha gbasara mba na mba nakwa otu o si gbute isi mmadụ mbụ o gburu. Ka ha nọ n’ọchịchịrị ma ọ bụ n’aga ọkụ akọ akụkọ, ha  na-echekwa ka ndị nwanyị sichaa nri ha. Mgbe ha sichara, nwanyị ọ bụla ga-ebutere dị ya efere akpụ na ofe ya. Ha mụnyere ọkụ oriọna. Okonkwọ na-eritucha nri atọ ndị ahụ ma burukwa abụọ n’ime ha bunye Nwoye na Ikemefuna.

Otu a ka ọtụtụ ọnwa na echere siri gafee. Igurube wee bịa. Ha abịabeghị n’ime ọtụtụ afọ gara aga. Ndị okenye sịrị na igurube ndị a na-abịa otu mgbe n’ime otu ọgbọ, pụtaghachi kwa afọ wee ruo afọ asaa, ha ewee laa kpata kpata. Ha na-ala n’ime ọgba ha n’otu obodo dị anya ebe ụmụ akpụda na-eche ha nche. Mgbe ọtụtụ afọ gachara, ụmụ akpụda ndị a ga-emeghere ha ọgba, ha ewee bịa n’Ụmụọfịa.

Ha bịara n’oge ụgụrụ mgbe e mecharala owuwe ihe ubi, ha wee richapụ ahịahịa ukwu ndị na-eto n’ubi.

Okonkwọ na ụmụaka abụọ ahụ naara arụ ọrụ n’ahụ aja uhie mpụta ụlọ ha. Nke a bụ otu n’ime ọrụ ndị ahụ dị mfe ha na-arụ mgbe ha mechara owuwe ihe ubi. Ha na-ewere igu nkwụ kpuchie ahụ aja ndị a wee chedo ha maka udu mmiri ọzọ na-abịa. Okonkwọ  rụrụ na mpụta ebe ụmụaka ahụ rụrụ n’ime ime. E nwechara ntakịrị oghere na mgbago ahu aja ahụ bụ ebe Okonkwọ si enyefe ha eriri. Ha na-ewere ya gafee n’elu osisi ndi na-ejide igu ndị ahụ ma nyefekwa ya Okonkwọ. N’ụzọ dị otu a ka ha si ekegide igu ndị a n’ahụ aja.

Ndị inyom ya gara n’ọhịa ịkpata nkụ ebe ụmụntakịrị ha gakwuru ndị agbata obi ha igwuri egwu. Oyi ụgụrụ dị n’ikuku wee na-eme ka ọ na-atụ ndị ụwa ụra. Okonkwọ na ụmụaka a ekwughị okwu ọ bụla mgbe ha na-arụ ọrụ a. Naanị mkpọtụ ha nụrụ bụ mgbe ha tụkwasịrị igu nkwụ ọhụrụ n’elu ahụ aja, ma ọ bụ mgbe ọkụkọ na-achọ nri bọsara akwụkwọ kpọrọ nkụ.

N’otu ntabi anya ahụ, otu onyinyo dakwasịrị ụwa o wee dịzi ka oke alụlụọ okpuchiela anyanwụ. Okonkwọ lelitere anya ya elu wee chee ma mmiri ọ na-achọ ido n’ụdịrị oge a n’afọ. Otu ihụ ahụ mkpu ọṅụ siri ebe niile daa. Ụmụọfịa niile bidokwara megharịwa ahụ.

Ha jiiri ọṅụ na-eti mkpu ebe dum na-asị : “Igurube na-ada.” Ụmụnwoke, ụmụnwanyị na ụmụntakịrị hapụrụ ọrụ ha ma ọ bụ egwuregwu ha gbagawa na mbara ebe ahụ ịhụrụ ihe a pụrụ iche. Igurube ndị a abịabeghị n’ime ọtụtụ afọ gara aga. Naanị ndị okenye hụrụla ha mbụ. Na mbido, ndị bịaranụ ebughị ibu. Ha bụ ndị ọgbaama e dunyere ka ha gaa mara otu ala dị. E mesịa elu niile wee chie dị ka alụlụọ jị nwayọ nwayọ na-abịarute Ụmụọfịa. Mgbe na-adịghị anya, ha nọchiri ọkara eluigwe, e wee site na ha na-ahụ ihe dị ka ebe kpakpando na-acha. Ọ mara mma ile anya n’ihi na o juputara n’ike na ebube.

Mmadụ dum ji obi ụtọ na-ekwu ma na-ekpekwa ekpere ka igurube ndị a hie ụra n’Ụmụọfịa. Na-agbanyeghị na igurube adabeghị n’Ụmụofịa n’ime ọtụtụ afọ gara aga, mmadụ dum mara na ha dị mma oriri. N’ikpeazụ, Igurube ndị a wee daa. Ha beere n’elu osisi nakwa ahịhịa dum; ha bekwaara n’elu ụlọ nakwa ala nkịtị. Ọtụtụ alaka osisi gbajichara maka ha, ebe ododo niile na-achazi aja ụpa, aja ụpa site n’agwa igurube agụụ ndị a tụrụ.

Otụtụ ndị mmadụ buuru ekete ha gawa ijide ha ma ndị okenye dụrụ ọdụ ka ha chere ruo oge abalị. Ha kwuru eziokwu. Igurube ndị bedochara n’ọhịa nku ha wee dee mmiri site n’ijiriji tụrụ ha. Ụmụọfịa niile pụtara na-agbanyeghị oyi ụgụrụ. Onye ọ bụla gbujuchara akpa na ite ha. N’ụtụtụ echi ya, ha jiri ọkụ ghee ha ma gbasakwa ha n’anwụ ka ha kpọọ nkụ ma chakwa uhie. Ha jiri mmanụ rie nri a pụrụ iche ọtụtụ ụbọchị.

Okonkwọ, Ikemefuna na Nwoye nọ n’obi ya na-atapịa igurube ha ma na-aṅụkwa mmanya mgbe Ogbuefi Ezeudu bịara. Ezeudu bụ onye tọchara mmadụ dum n’ọgbe a n’Ụmụọfịa. Ọ bụụrụ dike na-adịghị atụ egwu n’agha n’oge ya, ugbu a a na-akwanyere ya ugwu pụrụ iche n’obodo ha niile. Ọ jụrụ iri nri ahụ ma rịọkwa Okonkwọ ka ya hụ ya n’ezi. Ha abụọ sooro pụọ ka agadi nwoke ahụ ji mkpọ ya na-akwado onwe ya. Mgbe ha pụrụ n’ebe ntị ọzọ agaghị anụ ihe ha na-ekwu, ọ sịrị Okonkwọ: “Nwa ahụ na-akpọ gị nna ya. Etinyekwala aka gị n’ọnwụ ya.” Ihe a gbara Okonkwọ gharịị. Ọ chọrọ ikwu okwu ma agadị nwoke ahụ gakwara n’ihu: “ N’ezie Ụmụọfịa ekpebiela na ha ga-egbu ya. Agbara Ogwugwu ekwuola ya. Ha ga-akpọpụ ya n’Ụmụọfịa dị ka omenala siri dị wee gbuo ya ebe ahụ. Achọghị m ka i tinye aka gị na ya n’ihi na ọ na-akpọ gị nna ya.”

N’echi ya, ndị okenye ụfọdụ sitere n’isiama toolu ahụ dị n’Ụmụọfịa bịara n’ụlọ Okonkwọ n’isi ụtụtụ. Tupu ha ebido iji olu dị ala kwuwe okwu, ha chụpụrụ Nwoye na Ikemefuna. Ha anọteghị aka ma mgbe ha lachara, Okonkwọ dụnyere aka n’agba ya wee nọrọ otu ahụ ogologo oge. Ka ụbọchị ahụ gatụrụ, ọ kpọrọ Ikemefuna gwa ya na a ga-akpọla ya ụlọ echi ya. Nwoye nụrụ nke a wee bewe akwa. Nke a mere nna ya jiri kụọ ya ihe dị egwu. Ikemefuna n’onwe ya amaghị ihe ọ ga-eme. Ka ụbọchị gawara, o jiri nwayọ na-echefu obodo ya. Ọ hụbekwaghị nne ya na nwanne ya nwanyị, n’ihi ya, obi ga-atọ ya ụtọ ihụ ha. O metụrụ ya n’ahụ, o wee mata na ya agaghị ahụ ha. O chetara otu mgbe ahụ nna ya na ụmụ nwoke jiri olu dị ala kparịta ụka, o wee dịzi ya ka ụdị ihe ahụ na-emekwa ọzọ.

Ka e mechara, Nwoye gara n’ụlọ nne ya gwa ya na Ikemefuna na-achọ ịla obodo ha. Ngwa ngwa, nne ya tụhapụrụ ọdụ o ji asụ ose wee jikọọ aka ya maa ọsụ sị: “ebere, nwa m.”

N’echi ya, ndị nwoke ahụ buuru ite mmanya bịahachi. Ha yicha uwe ka a ga-asị na ha naara aga nzụkọ ukwu obodo ma ọ bụ na ha naara aga ileta otu obodo ndị agbata obi ha. Ha kefere akwa ha n’okpuru aka nri ha ma nyarakwa akpa ajị na ọbọ mma ha n’ubu aka ekpe ha. Okonkwọ kwadoro ngwa ngwa, ha na Ikemefuna wee kpọpụ ije ebe o butere ite mmanya ahụ. Ebe niile jụrụ oyi n’ezinaụlọ Okonkwọ. Ọ dịcha ka ụmụntakịrị matachara ihe na-emenụ. N’ụbọchị ahụ niile, Nwoye nọọrọ n’ụlọ nne ya na-ebe akwa.

Na mbido ije a, ndịikom Ụmụọfịa kparịrị ụka ma chịakwa ọchị gbasara igurube ndị ahụ, ụmụ nwanyị ha na nwoke ha ndị ụjọ ekweghị iso ha gaa. Ma mgbe ha gafere Ụmụọfịa, ha niile mechichara ọnụ ha.

Anwụ jiri nwayọ waa n’etiti eluigwe, aja uzuzu dị n’ụzọ ahụ ha na-aga bidoro wepụtawa okpomọkụ. Ụmụ nnụnụ na-ebegharịkwa n’ọhịa gbara gburu gburu. Ụmụ nwoke ndị a na-azọta ahịhịa kpọrọ nkụ n’aja ahụ. Mmadụ niile mechiri ọnụ ha. Ha bidoro nụwa ụda ekwe na-ada ebe dị anya. Ikuku na-ebu ya abịa. Ọ bụ egwu udo ka ha na-agba ebe ahụ.

Ndị nwoke ahụ kwuritara n’etiti onwe ha sị na ọ bụ egwu ọzọ. Ma ọ dịghị onye maara ebe o si abịa. Ufọdụ n’ime ha sịrị na o sitere n’Ezemili, ndị ọzọ sịrị na ọ bụ Abame ma ọ bụ Anịnta. Ha rụrịtara ụka a nwa obere oge wee mechiekwa ọnụ ha, ebe ikuku gakwara n’ihu na-ebute ụda ekwe ahụ. N’otu ebe, otu nwoke jiiri egwu na oke ememme na-echi otu n’ime echiche obodo ya.

Ụzọ ọhịa a ha na-aga bidoro dịwanye wara wara n’etiti oke ọhịa a. Ha bidoro hụwa oke osisi nakwa ahịhịa ukwu ndị ọzọ bụ ndị ọkụ na-agba ma ọ bụ egbugbu emesabeghị n’ahụ kemgbe ha siri puo. Ihe ndị a nọchịziri anya obere osisi ndị a na-ahụ ebe ndị obodo bị. Anwụ sitere n’alaka nakwa akwụkwọ ha na-enye ndo n’ụzọ ahụ.

Ikemefuna nụrụ ụzụ e medobere ya nso n’azu wee tụgharịa n’ike. Nwoke mere ụzụ a kwusiri okwu ike wee gwa ndị ọzọ ka ha gasiwe ike.

Ọ sịrị na ebe ha na-aga tere anya. Ya na otu nwoke ọzọ wee gafee Ikemefuna ma gasiwekwa ike.

Ya mere ndị nwoke Ụmụọfịa nyaara ọbọ mma ha na-aga n’ụzọ a. Ikemefuna bukwanụ ite mmanya n’isi na-aga n’etiti ha. N’isi mbido, egwu tụrụ ya ma ugbu a, egwu anaghịkwa atụ ya. Okonkwọ na-eso ya n’azụ. O nweghị ike icheta na Okonkwọ abụghị nna ya. Ọ dịghị mbụ hụ ezi nna ya n’anya, ya mere, ugbu a afọ atọ gacharala, ọ naghị echetakwa ya ọzọ.

Ma, nne ya na nwanne ya nwanyị dị afọ atọ nke ga-adị afọ isii ugbu a, ọ ga-amatakwa ya ugbu a? Ọ ga-etochala. Nne ya ga-ebe akwa ọṅụ ma keleekwa Okonkwọ otu o siri lekọtaa ya anya nke ọma wee kpọlatakwa ya. Ọ ga-achọkwa ịmatacha ihe niile merela ya n’ime afọ atọ ndị a. Ọ ga-echetachakwa ha niile? Ọ ga-akọrọ ya gbasara Nwoye na nne ya, nakwa ihe gbasara igurube ndị ahụ. Otu mgbe ahụ, otu echiche batara ya n’obi. E leghị anya ọ bụrụ na nne ya anwụọla. Ọ gbalịrị na nkịtị ka o chefuo ụdịrị echiche dị otu a, Ọ gbalịrị ka o mechie okwu a dị ka o si emechi ụdịrị ya mgbe ọ dị na nwanta. Ọ ka chetara egwu ahụ:

Eze elina, elina!

Sala

Eze ilikwa ya

Ị kwaba akwa oligholi

Eze Danda na-echi eze.

Ebe uzuzu na-ete egwu

Sala.

Ọ gụrụ ya n’ime obi ya ma sorokwa ụda ya na-aga ije. Ọ bụrụ na egwu ahụ ebie n’ụkwụ aka nri ya, ọ maara na nne ya ka nọ ndụ. O biekwanụ n’ụkwụ aka ekpe ya, ọ mara na ọ nwụọla, mba ọ nwụbeghị ma na ahụ adịghị ya mma. Egwu ahụ bịrị n’ụkwụ ọma ya, o kpebie na nne ya ka nọ ndụ n’ahụike. Ọ gụrụ egwu ahụ ọzọ, o wee bie n’ụkwụ ọjọọ ya. Ma, ọ gaghị ewere egwu nke ugboro abụọ a. Ụmụaka na-asị na okwu mbụ bụ okwu na-aga n’ụlọ Chukwu. Ikemefuna were onwe ya ka nwatakịrị ọzọ. Ọ ga-abụ site n’echiche na ya na-alakwuru nne ya.

Ikemefuna lere anya n’azụ ya ma nwoke ahụ gwara ya ka ọ na-aga n’ihu na-eleghị anya n’azụ. Otu o si kwuo okwu a mere ka egwu baa Ikemefuna n’ahụ. Aka bidoro mawa ya jijiji n’elu ite ojii ahụ o bu. Ọ bụ gịnị kpatara Okonkwọ jiri laa azụ? Ụkwụ Ikemefuna anaghị kwa ekwe ya gaa ije. Egwu ekweghị ya ile anya n’azụ.

Mgbe nwoke ahụ kwacharala akpịrị ya seliri mma ya, Okonkwọ lefuru anya ya. Ọ nụrụ ụda mma ahụ. Ite ahụ dara n’aja uzuzu ahụ wee waa. Ọ nụrụ ka Ikemefuna bere akwa sị: “nna m, ha egbuola m oo!”. Ka ọ na-agbakwute ya, Okonkwọ jiiri egwu selie mma ya wee gbutuo ya. Ọ chọghị ka a sị na ọ bụghị dike.

Ozugbo nna ya batara n’abalị ahụ, Nwoye matara na e gbuola Ikemefuna. Ọ dịzi ya ka ọ nwere ihe pụrụ ya n’ahụ. O nweelarị ụdịrị echiche a na mgbe na-adịghị anya gara aga, bụ mgbe ha mere owuwe ihe ubi ha nke ikpeazụ. Nwantakịrị ọ bụla hụrụ oge owuwe ihe ubi a n’anya. Ndị ahụ torurula iji obere nkata ebute ji ole na ole, na-esoro ndị dimkpa gaa n’ubi. Ọ bụrụ na ha enweghị ike inye aka gwuputa ji ndị a, ha ga-afụnwuli ọkụ ịhụ ji ndị a ga-eri n’ubi. Ọ dịghị ihe tọkarịrị ji a a na-ahụ n’ubi ma jirikwa mmanụ nkwụ rie ya. Ọ bụ otu ụbọchị mgbe ha rụchara ụdịrị ọrụ a n’ubi ka Nwoye nwere ụdịrị ihe mere ya ugbu a na mbụ. Ha bu abọ ji ha na-alọta ọrụ site n’otu ubi ha tere anya n’ofe iyi ha mgbe ha nụrụ ụmụ nwanyị ahụ naara ekwu okwu, ha wee gasiwe ike. Nwoye anụla na a na-etinye ụmụ ejima n’ime ite aja wee tụfuo ha n’ime ọhịa ma na ọ hụtụbeghị ha mbụ. Akpata oyi wụrụ ya n’ahụ. Isi mere ka o buru ya dị ka nke otu onye ije nke gafere otu ajọ mmụọ n’ụzọ n’abalị. Ihe wee si ya n’ahụ pụọ. O mekwara ya ọzọ n’abalị ahụ mgbe nna ya lọtara ka o gbuchara Ikemefuna.

 

 

IGBO AMAKA

ỤLỌAKWỤKWỌ IGBO

MỤTA IGBO

CULTURAL DANCE

MASQUERADE

EGWU DI YA

EDEMEDE IGBO

ONYE NKUZI IGBO

OLU ỤMỤ IGBO

IGBO MADE EASY

Learn In Igbo in 1 day

Learn In Igbo

Copyright � 2018-2020. Mother Tongue Academy. All Rights Reserved.We can be  reached  by Phone at (516) 442-9191  or by our Website  Contact  E-mail