Login and Register

Log in  \/ 
x
x
Register  \/ 
x

Home

Chap8-Isi Nke Asatọ

ISI NKE ASATỌ

 

 

Okonkwọ erighị nri ọ bụla ruo abalị abụọ Ikemefuna jiri nwụọ. Ọ ṅụrụ mmanya site n’ụtụtụ ruo abalị, anya wee na-acha uhie dị ka nke oke ọnya mara n’ọdụdụ, o wee na-agbagharị ala ụlọ dum. Ọ kpọrọ Nwoye nwa ya ka ọ bịa nọnyere ya n’obi ya. Ma Nwoye tụrụ ya egwu, n’ihi ya, o jiri ọsọ mịpụ ngwa ngwa ọ hụrụ na nna ya ehiwela ụra.

Okonkwọ anaghị ehi ụra n’abalị. Ọ gbalịrị ka o chefuo ihe gbasara Ikemefuna, ma na o kweghị ya n’ihi na ọ sị ka ya kwụsị, o bido chewanyesie ihe gbasara ya ike. Otu mgbe, o siri n’akwa ya bilie wee gagharịa gburu gburu ụlọ ya. Ụkwụ ekweghị ya aga ije n’ihi na ike gwụchara ya. O yiri odogwu ṅụjuru mmanya afọ ma jiri ụkwụ anwụta na-aga ije. Ọ nọtụ ntakịrị, akpata oyi esite n’isi wụruo ya ala.

N’ụbọchị nke atọ, ọ gwara Ekwefi, nwunye ya nke abụọ, ka ọ hụọrọ ya ụkam. Ekwefi jiri ụgbaa na azụ mezie ya otu ọ chọrọ.

Ka  Ezimma nwa ya butere ya nri ahụ, ọ gwara ya na o ribeghị nri ọ bụla n’ime abalị abụọ gara aga, n’ihi ya  ọ ga-ericha nri ahụ. Mgbe ọ na-ele ada ya gbarala afọ iri anya, o chere sị na ọ gaara abụ nwoke. O nyetụrụ ya azụ.

“Gaa kutere m mmiri,” ka ọ gwara ya. Ezimma wee gbapụ ọsọ, tara azụ ya, gaa n’ite mmiri nne ya kutere ya mmiri jụrụ oyi.

Okonkwọ naara ya mmiri ahụ wee jiri ike ṅụọ ya. O riri ụkam ole na ole ọzọ ma bupụkwa efere ahụ.

Okonkwọ gwara Ezimma ka o butere ya akpa ya. Ezimma gara n’otu ụsọ ụlọ ahụ wee butere ya akpa ajị ya. Ọ chọrọ mkpọ anwụrụ ya n’ime ya. Akpa ahụ dị omimi. Ọ na-achọ iricha aka ya ma o tinye ya na ya. Ihe ndị ọzọ dịkwa n’ime akpa ahụ na-abụghị naanị mkpọ anwụrụ ya. Mpi mmanya na ebele mmanya bụ ndị na-akụkọta ọnụ mgbe ọ naara achọ mkpọ anwụrụ a. Mgbe o wepụtara ya, ọ kụtụrụ ya ugboro ole na ole tupu ọ wụpụta anwụrụ n’ọba aka ekpe ya. O chetara na ya ewepụtabeghị ngaji anwụrụ ya. Ọ chọkwara ya n’ime akpa ahụ wee wepụta otu obere ngaji na-acha nzụ nzụ bụ nke o ji ekunye anwụrụ n’imi ya.

Ezimma jiri otu aka para efere nri ahụ, jiri aka nke ọzọ para iko ahụ mmiri na-adịghị n’ime ya wee gawa n’ụlọ nne ya. Okonkwọ kwukwara n’ime obi ya ọzọ sị, “ Ọ gaara abụ nwa nwoke.” Obi ya gbagakwara ọzọ ebe Ikemefuna nọ, ahụ wee maa ya jijiji. Ọ bụrụ na o nwere ike ịchọta ọrụ ọga-arụ, o nwere ike ichefu ihe dum. Ma ugbu a bụ oge ezumike ahụ na-adị n’etiti owuwe ihe ubi na mbido ọrụ ubi ọzọ. Naanị ọrụ ndị nwoke na-arụ n’oge a bụ iji igu nkwụ ọhụrụ kpuchie aja ụlọ ha. Okonkwọ emeelarị nke a. O mechara nke a ụbọchị ahụ igurube ndị ahụ bịara, bụ ụbọchị ọ nọrọ n’otu akụkụ aja ahụ. Nwoye na Ikemefuna nọrọ n’akụkụ nke ọzọ na-arụ ọrụ.

Okonkwọ jụrụ onwe ya sị: “ Kedu mgbe i bidoro bụrụ agadị nwanyị ọma jijiji, gịnwa bụ dike a ma ama n’agha n’isiama toolu anyị niile? Kedu ka nwoke gburula dimkpa ise n’agha ga-esi dasasịa n’ihi na o tinyekwara otu nwantakịrị n’ọnụ ọgụgụ ha? Okonkwọ, ị bụrụla nwanyị nezie.”

O biliri ozugbo, nyara akpa ya wee gawa ikpọtụrụ enyi ya Obierika.

Obierika nọ na ndo ukwu oroma n’ezi na-adụ atanị. O kelere Okonkwọ wee duru ya gaa n’obi ya.

“ Anaara m achọ ịbịa hụ gị ngwa ngwa m mechara ihe a m na-eme,” ka o kwuru mgbe ọ na-etichapụ aja dị ya n’apata ụkwụ.

Okonkwọ jụrụ ya sị, “ Ọ dịkwa mma?”

Obierika zara sị: “ Eee. Ndị di ada m nwanyị na-abịa taa. Anyị ga-akpa ihe gbasara akụ nwanyị, n’ihi ya, achọrọ m ka ị nọrọ na ya.”

Otu mgbe ahụ, Madụka nwa Obierika siri n’ezi bata n’obi kelee Okonkwo wee pụwakwa.

Okonkwọ sịrị ya: “ bịa kwee m n’aka. Mgba ahụ ị gbara ụbọchị  a nyere m nnukwu aṅụrị.” Ọ chịrị ọchị, kwee Okonkwọ n’aka wee pụwa.

Okonkwọ kwuru sị: “ Nwa a ga-akpa ike dị egwu. A sị na m nwere ọkpara dị ka ya, obi ga-adị m ụtọ. Uche na-eche m ebe Nwoye nọ. Efere akpụ nwere ike ịtụ ya n’ala na mgba. Enwere m ike ịgwa gị Obierika na ụmụ m eyighị m. Kedukwanụ osisi unere ndị ga-epute ọhụrụ mgbe nne ha nwụrụ? A sị na Ezimma bụ nwoke, obi gaara ịdị m ụtọ karịa. O nwere agwa ọma.”

Obierika gwara ya sị :” Ị na-echegbu onwe gị n’efu. Ụmụaka  gị ka dịcha obere.”

“ Nwoye etoruola ịtụnye nwanyị ime. Ebidoro m mgbe m ha ka ya lekọtawa onwe m anya. Ekweghị m, enyi m, Nwoye abụzighị nwanta. A na-amata ọkụkọ ga-abụ oke site n’ụbọchị a bụrụ ya n’akwa. Anwaala m otu ike m ha ka Nwoye bụrụ nwoke ma na oyiyi nne ya karịrị ya n’ahụ.”

Obierika chere n’ime obi ya na o yikarịrị nna ya ochie, Ụnọka, ma na o kwuputaghị ya. Ụdirị echiche ahụ batakwara Okonkwọ n’ahụ. Ma, o teelarị o chefuru ihe gbasara ya. Mgbe ọ bụla echiche gbasara umengwu na efulefu nna ya batara ya n’obi, ọ na-ekpochapụ nke a site n'iche ihe gbasara ike na ọganihu nke ya onwe ya. Otu ahụ ka o mere ugbu a. Echiche ya gbagara n’ihe ikpeazụ a o mere iji gosi na ya bụ nwoke.

Ọ sịrị Obierika: “ Aghọtaghị ihe kpatara na ị soghị anyị gaa gbuo nwantakịrị ahụ.”

Obierika jiri ọnụ nkọ sị: “ Achọghị m ịbịa n’ihi na enwere m ihe ndị ọzọ ka mkpa  m chọrọ ime.”

“ Ọ dị ka a ga-asị na ị na-agbagha ike Agbara nke kwuru na ọ ga-anwụ.”

“ Mba, onye ka m bụ ime otu a ? Ma na ọ bụghị m ka agbara gwara ka o mejupụta mkpebi ya.”

“ Ma otu onye aghaghị ime nke a. Ọ bụrụ na anyị dum tụwa egwu ọbara, a gaghị eme ya. Mgbe ahụ, kedu ihe i chere na agbara anyị ga-eme?”

“Okonkwọ, ị makwa nke ọma na m anaghị atụ ọbara egwu. Onye ọ bụla gwara gị na m na-atụ ya egwu bụ onye asị. Kama ka m gwa gị enyi m, a sị na abụ m gị, agara m ịnọ n’ụlọ. Ihe a i mere agaghị adị ala mma. Ụdịrị ihe a bụ ụdịrị ihe ala ji ekpochapụ ọtụtụ ezinaụlọ.”

“Ala enweghị ike ịta m ahụhụ n’ihi na m rubere ozi ya isi. Ji nne nwanta  gụnyere ya n’aka anaghị ere ya ọkụ.”

Nke a bụ eziokwu, ma ọ bụrụ na agbara asị na ọkpara m ga-anwụ, agaghị m agbagha ya, ma agaghị m abụ onye ga-egbu ya,” ka Obierika kwuru.

A sị na Ọfọedu abịaghị mgbe ahụ, ha gaara aga n’ihu n’arụmarụ a. Ka Ọfọedu si eme anya ya gosiri na o ji akụkọ dị mkpa bịa. Ọ gaghị adị mma ka ha mee ya ka ọ kọọ ya ọsịịsọ. Obierika nyere ya otu ibe ọjị ahụ ya na Okonkwọ warala. Ọfọedu jiiri nwayọ taa ọjị ahụ ma kọọkwa ihe gbasara igurube ndị ahụ. Mgbe ọ tachara ọjị, ọ sịrị:

“ Ihe ndị na-eme ugbu a dịzi egwu.”

Okonkwọ jụrụ ya sị: “ Ọ bụ gịnị mere?”

Ọfọedu sịrị ya: “ Ị maara Ogbuefi Ndulue?”

Obierika na Okonkwọ kwuru otu mgbe sị: “ Ogbuefi Ndulue nke Ire.”

Ọfọedu gwara ha na, “ ọ nwurụ n’ụtụtụ a.”

Obierika sịrị: “ Nke a abụghị ihe na-ahụbeghị mbụ. Ya bụụrụ onye ka mee okenye  n’Ire.”

“ I kwuru eziokwu ma ị gaara ajụ ihe kpatara na a kụbeghị ekwe iji gwa Ụmụọfịa na ọ nwụọla.” Otu a ka Ọfọedu kwuru.

Obierika na Okonkwọ jụkọrọ ọnụ sị: “ Ọ bụ gịnị kpatara ya?̂” ''Nke ahụ bụ ihe dị iche dị na ya. Unu matara isi nwanyị ya nke ahụ na-eji mkpọ aga ije?''

“Eee, a na-akpọ ya Ọzọemena.”

“Nke ahụ bụ eziokwu. Unu maara na Ọzọemena emeela okenye nke ukwuu nke na o nweghị ike ilekọta di ya anya n’ute ọrịa. Ndị nwunye ya ndị na-akabeghị nka bụ ndị mere nke a. Mgbe Ogbuefi Ndulue nwụrụ n’ụtụtụ a, otu n’ime ndị nwunye di ya a, gara n’ụlọ Ozọemena ịgwa ya. O sitere n’ute ya bilie, sụrụ mkpọ ya garute n’obi ahụ. O gburu ikpere n’ala ma dotekwa aka n’ute ebe ahụ e nyiwere di ya wee kpọọ ya aha ‘Ogbuefi Ndulue’ ugboro atọ ma laghachikwa n’ụlọ ya. Mgbe ọdụdụ nwunye di ya bịara ịkpọ ya ọzọ ka ọ nọrọ mgbe ha ga-asa di ha ahụ, ọ hụrụ ya ka o dina n’ute wee ghọọ onye nwụrụ anwụ.”

Okonkwọ sịrị : N’ezie ihe a bụ ihe a na-ahụbeghị mbụ. Ha ga-akwụsịgodu ili ya tupu ha elichaa nwunye ya.”

“Nke a kpatara na a kụbeghị ekwe iji gwa Ụmụọfịa.”

Obierika kwuru sị: “Mgbe ọ bụla ndị mmadụ na-asị na Ndulue na Ọzọemena nwere otu obi. Echetara m mgbe m bụ nwata na o nwere egwu a naara agụ banyere ha abụọ. O nweghị ike ime ihe ọ bụla na-agwaghị ya.”

Okonkwọ sịrị: “Amaghị m nke a. Echere m na ọ bụ nwoke gbasiri ike site n’okorọbịa ya.”

“Ọ bụụrụ nwoke siri ike n’ezie,” ka Ọfọedu sịrị.

Okonkwọ fere n’isi na-ekwetachaghị ihe a Obierika gwara ya: “ Nwoke a duru Ụmụọfịa n’agha na mgbe ochie.”

Okonkwọ ebidola nwetawakwa onwe ya ọzọ. Naanị ihe ọ chọrọ bụ ihe ọ ga na-eme mgbe dum. A sị na o gburu Ikemefuna oge ịkọ ọrụ ubi ma ọ bụ oge owuwe ihe ubi, ọ gaaraghị adị njọ otu a n’ihi na obi ya niile gaara adị ebe ọrụ ya dị.

Okonkwọ abụghị onye oke uche kama onye na-achọ ihe ọ ga na-eme mgbe ọ bụla. Ma ọrụ adịghị, ịkọ akụkọ abụrụ ihe na-anọchi ya.

Ka  e mechara, Ọfọedu lara,Okonkwọ wee buliekwa akpa ya ka ọ laa.

Ọ sịrị: “ Aghaghị m ịla gaa tee nkwụ ehihie.”

Obierika jụrụ ya sị: “Onye na-etere gị nkwụ gị ndị toro ogologo?”

“ Ọ bụ Umezurike”, ka Okonkwọ zara.

Obierika wee sị: “Mgbe ụfọdụ ọ na-adị m ka ya bụrụ na m echighị echiche ọzọ. Ọ na-ewute mmụọ m ịhụ ka ụmụ okorọbịa ndị a si egbusi osisi nkwụ anyị sị na ha na-ete ya ete.”

Okonkwọ sịrị: “Nke a bụ eziokwu. Ma anyị aghaghị idobe iwu obodo anyị.”

Obierika wee sịkwa: “ Amaghị m otu anyị siri nweta iwu ahụ. N’obodo ndị ọzọ, a naghị amachibido ndị chiri echichi ịrị elu nkwụ. Ebe a anyị sịrị na o nweghị ike ịrị ndị ahụ toro ogologo elu ma na o nwere ike iguzo n’ala wee tee ndị ahụ dị mkpụmkpụ. Ihe a dịka Dimaragana bụ onye na-enweghị ike ịgbazinye mma ya ka e were gbuo anụ nkịta n’ihi na ọ na-asọ ya nsọ, ma na o wepụtara eze ya iji mee ya.”

“Echere m na ọ dị mma ka obodo anyị na-akwanyere echichi ọzọ ugwu ruuru ya. N’obodo ndị ọzọ ahụ ị kpọrọ aha, ọzọ enweghị ugwu ọ bụla n’ihi na ọ bụladị onye arịrịọ nwere ike ichi ya.” Ihe ndị a ka Okonkwọ kwuru.

Obierika sịkwara: “Ana m ama naanị njakịrị. N’Abame na Anịnta, echichi a  erughị ego ayọrọ abụọ. Onye ọ bụla na-agba eriri ọzọ a n’ụkwụ ya. Ọ naghị etufu ya ọ bụladị mgbe o zuru ohi.”

Ka Okonkwọ biliri ka ọ lawa, ọ sịrị: “N’eziokwu, ha emebiela aha ọzọ a.”

Obierika gwara ya: “ Ọ gaghị ete aka ndị ọgọ m ebido bịawa.”

Okonkwọ lere ebe anyanwụ nọ anya wee sị: “ Aga m abịaghachi mgbe na-adịghị anya.”

 

 

Mmadụ asaa nọ n’ụlọ Obierika mgbe Okonkwọ lọghachịrị. Ọgọ Obierika a bụ nwa okorọbịa gbara ihe akarịghị afọ iri abụọ na ise. Nna ya na nwanne nna ya sokwa ya bịa, N’akụkụ nke Obierika bụ ụmụnne ya nwoke abụọ ndị tọrọ ya nakwa Madụka ọkpara ya gbara afọ iri na isii.

Obierika gwara Madụka sị: “Gwa nne Akụeke ka o wetara anyị ọjị.” Madụka jiiri ọsọ gbaba n’ime ụlọ. Mkparị ụka ha bidoro ozugbo ahụ bụrụ ebe ọ nọ. Mmadụ niile kwetara na ọ bụ nwanta dị gara gara.

“Echere m na ọ dịfere gara gara ya oke. Ọ raka ahụ ka ị hụ ya ebe ọ na-aga ije. Mgbe ọ bụla, ọ na-adị ya ngwa ngwa. I dunyewe ya ozi, ọ gbapụlarị tupu ọ na-anụrụ ọkara ihe ị na-ezi ya.” Ihe a ka Obierika kwuru.

Nwanne ya nwoke tọrọ ya wee sị: “ Gị onwe gị dịịrị otu ahụ. Dị ka ndị obodo anyị kwuru, nne ewu  na-ata agba, nwa ya a na-ele ya anya n’ọnụ. Madụka naara ele gị anya n’ọnụ.”

Mgbe ọ na-ekwu nke a, Madụka na nwanne ya, Akụeke sooro lọghachị. Akụeke bu ọkwa ose nke mkpụrụ ọjị atọ na ọseọjị dị n’ime ya. O bunyere nwanne nna ya ọkwa ahụ wee were anya ihere kwee di ya na umụnne ya n’aka. Ọ gbara afọ iri na isii bụ mgbe kwesiri ka ọ lụọ di. Di ya na ụmụnne ya ahụ jiiri anya okenye lezie ahụ ya anya iji kweta n’onwe ha na ọ mara mma ma tozuokwa oke.

Ọ kpachara isi ya nke ọma wee chịkọọ ya n’etiti isi ya. O jiri uli chọo ahụ ya niile mma. O yi ihe olu ojii nke gara ya n’olu ugbo atọ wee wụkwasị n’elu ara ya. Ọ gba ọdụ na-acha uhie na edo n’aka ya ma yirikwa jigida nke gara ya gburu gburu ugboro ise n’ukwu.

Mgbe ha kwechara ya n’aka, ọ laghachiri azụ n’ụlọ nne ya inyere ya aka n’isi nri. Mgbe ọ gara n’akụkụ ọkụ iwe akaọdụ nke dị n’ahụ aja, nne ya dọrọ ya aka na ntị sị: “buru ụzọ yipu jigida gị;  kwa ụbọchị ka m na-agwa gị na jigida na ọkụ abụghị enyị, ma ị naghị anụ. Otu ụbọchị jigida gị ga abanye ọkụ n’ukwu gị, mgbe ahụ ka ị ga-amata.”

Akụeke gara n’otu ime ụlọ iyipu jigida ndị ahụ. Ọ ga-eji nwayọ yipu ha otu otu, ma ọ bụghị otu ahụ, ọ ga-adọbi, e wee bido n’isi ganyewekwa ha ọzọ. O jiri aka ya na-agbụda ha otu otu ka ha gafee ike ya wee dapụ n’ụkwụ ya n’ala.

Ndị nwoke ndị a nọ n’obi ebidolarị ṅụwa mmanya ahụ di Akụeke butere. Ọ bụ ezigbo mmaya siri ike n’ihi na na-agbanyeghị na e tinyere mkpụrụ nkwụ n’ọnụ ite ka ọ ghara ịgbọ ụfụfụ, ụfụfụ sitere n’ọnụ ite ahụ na-agbọfụsi n’ala.

Okonkwọ kwuru sị na mmaya a bụ aka ọrụ ezigbo diochi. Nwa okorọbịa ahụ na-achọ ilụ nwanyị nke ahụ aha ya bụ Ibe chịrị nnukwu ọchị wee sị nna ya : “ Ị nụrụ ihe e kwuru?”. O wee sị ndị ọzọ: “ Nna m agaghị ekweta na abụ m ezigbo diochi.”

Nna ya Ukegbu wee sị: “ O tegburu nkwụ m atọ ndị kacha mma ha nwụọ.”

“Nke ahụ bụ afọ ise gara tupu m amụta otu e si ete nkwụ,” ka Ibe kwuru mgbe o bidorola ịgbapụta mmanya ahụ. O gbajuru iko nke mbụ wee bunye nna ya. O bidoziri gbanyere ndị ọzọ. Okonkwọ wepụtara mpi mmanya ukwu ya site n’akpa ya, fụọ ya ọnụ iji wepu uzuzu ọ bụla nwere ike ịdị n’ime ya, wee nye ya Ibe ka ọ gbajuoro ya.

Ka ndi nwoke ndị a ṅụrụ mmanya ahụ, ha kpara ụka banyere ihe dum ma e wepu ihe ha kwere maka ya gbakọta ebe ahụ. Ọ bụ naanị mgbe ha ṅụchara mmanya ahụ ka nna Ibe kwachara akpịrị ya wee kwuo ihe ha ji bịa.

Obierika nyere ya ntakịrị ukwu azịza. Ukegbu gụrụ ha ọnụ.

Ọ jụrụ sị: “ ha dị iri atọ?”

Obierika kwere ya n’isi.

Ukegbu sịrị: “Ugbu a anyị ebidola ụka.” Ọ tụgharịrị gwa nwanne ya na nwa ya nwoke ka ha pụọ n’ezi gaa gbaa izu. Ha atọ wee pụọ n’ezi. Mgbe ha lọghachiri, Ukegbu nyeghachiri Obierika ukwu azịza ahụ. Ọ gụrụ ha, kama iri atọ ha dịzi iri na ise. O nyere ha ọkpara nne ya, Machi, onye gụkwara ha wee sị: “ Anyị ebughị n’obi ime ihe ọ bụla dị nta karịa iri atọ. Ma dị ka nkịta sịrị, ‘ danyere m ka m danyere gị bụ egwuruegwu.’ Ọlụlụ di na nwanyị bụ egwuregwu, ọ bụghị ọgụ. N’ihi ya, anyị na-agbadata ala ọzọ. O tinyekwuru iri na nke ahụ o ji n’aka wee nyeghachi Ukegbu ukwu azịza ahụ.

Otu a ka ha siri gbubie ọnụ akụ ọlụlụ Akụeke n’isi ego ayọrọ iri atọ. Chi ejielarị mgbe otu abụọ ndị a mere nkwerikọta a.

Obierika gwara nwa ya Madụka ka ọ gaa gwa nne Akụeke na ha emechaala. Otu ihu ahụ, nwanyị ahụ butere otu efere ụtara akpụ buru ibu. Nwunye Obierika nke abụọ butere ite ofe ebe Madụka butere ite mmanya.

Ndị nwoke ndị a kọrọ akụkọ banyere omenala ndị agbata obi ha mgbe ha na-eri nri.

Obierika sịrị: “Naanị n’ụtụtụ a ka mụ na Okonkwọ naara akọ ihe gbasara Abame na Anịnta ebe ndị chiri echichi na-arị elu osisi na-asụkwara nwunye ha ụtara.”

“Omenala ha niile kpọdoro isi n’ala. Ha anaghị eji mkpụrụ azịza ekpebi akụ nwanyị dị ka anyị na-eme ebe a. Ha na-ekwe ya ọnụ dị ka ha na-azụ ewu ma ọ bụ ehi n’ahịa.”

Nwanne Obierika sịrị: “ Nke ahụ jọgburu onwe ya. Ma, na ihe mara mma n’otu ebe jọrọ njọ n’ebe nke ọzọ. N’Ụmụnsọ, ha adịghị ekwe ọnụ ncha, ọ bụladị iji mkpụrụ azịza. Onye ahụ na-alụ nwanyị na-aga n’ihu iweta isi ego ayọrọ wee ruo mgbe ndị ọgọ ya ga-agwa ya ka ọ kwụsị. Ọ bụ ajọ omenala n’ihi na ọ na-ebuta esemokwu.”

Okonkwọ wee sị: “ Ụwa a ebuka. Anụrụ m n’ebe ụfọdụ na ọ bụ nwanyị na ndi ikwu ya nwe ụmụ ọ bụla di ya mụrụ.”

Machi sirị: “Nke ahụ enweghị ike ime. Ị ga-asịkwa na ọ bụ nwanyị na-anọ n’elu nwoke mgbe ha na-achọ ịmụta ya bụ ụmụ.”

Obierika weliri otu ogbe nzụ nke nwoke ọ bụla na-edote n’obi ya, bụkwa nke ọbịa ya ji adọ akara n’ala tupu ha ataa ọjị, wee sị: “ Akụkọ a dị ka akụkọ ndị bekee bụ ndị a sịrị na ha na-acha ka nzụ a. A sịkwara na ndị bekee a enweghị mkpịsị ụkwụ.”

Machi jụrụ ya sị: “ Ị hụbeghị ha mbụ?”

Obierika jụrụ Machi sị: “Ị hụọla ha?”

Machi zara ya sị: “Otu n’ime ha na-agafe ebe a mgbe dum. Aha ya bụ Amadị.”

Ndị matara onye Amadị bụ chịrị ọchị. Amadị bụ onye ọrịa ọcha. Aha iruro e jiri mara ọrịa ọcha bụ ‘ahụ ọcha.’

  

IGBO AMAKA

ỤLỌAKWỤKWỌ IGBO

MỤTA IGBO

CULTURAL DANCE

MASQUERADE

EGWU DI YA

EDEMEDE IGBO

ONYE NKUZI IGBO

OLU ỤMỤ IGBO

IGBO MADE EASY

Learn In Igbo in 1 day

Learn In Igbo

Copyright � 2018-2020. Mother Tongue Academy. All Rights Reserved.We can be  reached  by Phone at (516) 442-9191  or by our Website  Contact  E-mail