Login and Register

Log in  \/ 
x
x
Register  \/ 
x

Home

Chap10-Isi Nke Iri

ISI NKE TOOLU 

  

Nke a bụ mbụ Okonkwọ hiri ụra n’ime abalị atọ gara aga. O tetara n’ime etiti abalị obi ya wee gbaga n’ihe ahụ mere n’ime abalị atọ ndị a, ma na o meghị ya ka ọ tụọ egwu ọ bụla. O bidoro jụwa onwe ya ihe mere ya jiri nwee obi ezughị ike nke mbụ. Ọ dị ka nwoke nọ n’ehihie na-eche  ihe kpatara nrọ ọ rọrọ n’abalị jiri tụọ ya oke ụjọ.

O megharịrị ahụ ya wee kọọ ọkọ n’ụkwụ ya ebe anwụnta tara ya mgbe ọ na-ehi ụra. Anwụnta ọzọ nọ n’ebe n’akụkụ ntị aka nri ya. Ọ mara onwe ya ụra na ntị ahụ wee nwee nchekwube na ya egbuola ya. Ọ bụ gịnị kpatara na ha na-aga na ntị mmadụ? Mgbe ọ dị na nwanta, nne ya kọọrọ  ya akụkọ banyere ya. Ma, o weere ya dị ka akụkọ nzuzu niile ụmụ nwanyị na-akọ. Nne ya gwara ya na anwunta rịọrọ ntị ka ọ lụọ ya. Nke a mere ntị jiiri ọchị daa n’ala. Ọ jụrụ anwụnta sị: “Afọ ole ọzọ ka ọ dị gị ka ị ga-ebi ọzọ ugbu a ị bụụrụla ọkpụkpụ ọkpụkpụ. Anwụnta jiiri ihere wee pụọ. Ya mere mgbe ọ bụla ọ gafere ebe ntị nọ, ọ na-agwa ya na ya ka nọkwa ndụ.

Okonkwọ tụgharịrị n’otu akụkụ wee hiri ụra. Ihe metere ya n’ụra n’ụtụtụ bụ aka mmadụ naara akụrụ ya n’ọnụ ụzọ. Ọ bara mba sị: “Onye ahụ bụ onye?” Ọ matara na ọ ghaghị ịbụ Ekwefi. N’ime ndị nwunye ya atọ, naanị Ekwefi nwere ike ikụ aka n’ọnụ ụzọ ya.

Ekwefi jiri obi mwute nakwa obi akwa gwa ya na “Ezimma na-anwụ anwụ.”

Okonkwọ siri n’elu akwa ya malie, gbahee ụzọ ya wee gbaga n’ụlọ Ekwefi.

Ezimma dina n’ute na-ama jijiji n’akụkụ ọkụ nke nne ya mụnyere ka ọ na-enwu abalị ahụ niile.

“Ihe a bụ ịba”, ka Okonkwọ kwuru mgbe o weere mma ya baa n’ọhịa igbute ahịhịa nakwa azụ osisi ndi ọ ga-eji sie ọgwụ ịba.

Ekwefi gbudoro ikpere n’ala n’akụkụ onye ọrịa ya ahụ na-ebedo ya aka n’ihu ya na-ajụ oyi ma na-erekwa ọkụ.

Ezimma bụ otu anya ji isi ụgwọ ma bụrụkwa ebe ụwa nne ya niile hiwere isi. Mgbe ụfọdụ, ọ bụ ya na-ekwu nri nne ya ga-esi. Ekwefi na-enye ya ihe ụtọ ụfọdụ dị ka akwa bụ nke a naghị ekwe ka ụmụaka rie n’ihi na ọ ga-eme ka ha zuo ohi. Otu ụbọchị Ezimma naara ata akwa mgbe Okonkwọ siri n’ụlọ ya bata na mberede.  O wutere ya nke ukwu, o wee ṅụọ iyi na ya ga-akụpụ Ekwefi ajụ n’anya ma ọ bụrụ na ọ nwa anwa nye nwa ahụ akwa ụbọchị ozọ. Ma, ọ bụghị ihe ga-ekwe mee ịhapụ inye Ezimma ihe ọ bụla ọ chọrọ.  Ka nna ya bachara ya mba ka agụụ ịta akwa bidoro gụwanye ya. Ihe na-atọkarị ya ụtọ ugbu a bụ ụzọ nzuzo o ji ata ha. Nne ya na-akpọba ya n’ime ụlọ wee gbachie ụzọ.

Ezimma anaghị akpọ nne ya ‘Nne’ dị ka ụmụaka niile ozọ. Ọ na-akpọ ya Ekwefi dị ka nna ya  na ndị ọzọ toro eto si eme. Mmekọrịta dị n’etiti ha abụghị nke nne na nwa. Ọ mụọla ụmụ iri, toolu n’ime ha anwụọla mgbe ha ka bụ ụmụntakịrị na-erubeghị afọ atọ. Ka ọ naara eli ụmụ ntakịrị ndị a ka ọ na-ewepụ obi ya n’ihe gbasara inwe nwa wee site na ya tinyekwa uche ya n’otu ọ bụla o siri masị chi ya. Ọmụmụ nke na-abụrụ nwanyị ihe oke oṅụ bụụrụ Ekwefi ihe ahụhụ nke na-enweghị olile anya. Emume ịgụ nwa aha mgbe izu asatọ gachara bụụrụ ya ihe ịkwọcha aka tiere ọkụkọ akụ. Enweghị ntụkwasị obi ya a n’ebe inwe nwa nọ putawanyere ihe n’aha ọ na-enye ụmụ ya. Otu n'ime ha bụ akwa arịrịọ - ‘Ọnwụmbiko’, ma na ọnwụ egeghị ntị. Ọnwụmbiko nwụrụ mgbe ọ gbara otu afọ na ọnwa atọ. Nke ozọ bụ nwanyị -‘Ọzọemena’. Ọ nwụrụ mgbe ọ gbara ọnwa iri na otu. Abụọ ndị ọzọ sokwa ya n’azụ. Ekwefi atụghị ụjọ ọ bụla wee gụọ nwa ya nke ọzọ ‘Ọnwụma’. Ọnwụ wee meekwa otu ọ masịrị ya.

Mgbe nwa Ekwefi nke abụọ nwụchara, Okonkwọ gara n’ụlọ dibịa na-agba afa ka ọ chọpụta ihe butere ọnọdụ ọjọọ a. Nwoke ahụ gwara ya na nwa ahụ bụ ọgbanje, otu n’ime ụmụaka arụrụ ala ndị ahụ na-abụ ha nwụọ, ha abanye n’afọ nne ha ka a mụọ ha ọzọ.

Ọ gwara Okonkwọ sị: “Nwunye gị dị ime ọzọ ekwela ka o hie ụra n’ụlọ ya. Kwe ya ka ọ lakwuru ndị nwe ya. Otu a ka ọ ga-esi gbanahụ nwa a na-esogbu ya ma kwụsịkwa ọbịbịa na ọnwụnwụ ya.”

Ekwefi mere otu a gwara ya. Ngwa ngwa ọ dịịrị ime, ọ gara binyere nne ya n’obodo ọzọ. Ebe ahụ ka ọ mụrụ nwa ya nke atọ ma biekwa ya ugwu n’abalị nke asatọ ọ mụchara ya. Ọ lọtara n’ụlọ Okonkwọ mgbe ọ fọdụrụ abalị atọ ka ha gụọ nwa ahụ aha. Aha nwa ahụ bụ Ọnwụmbiko.

E lizighị Ọnwụmbiko elizi mgbe ọ nwụrụ. Okonkwọ kpọtara onye dibịa ọzọ a mara nke ọma n’ihi amamihe ya n’ebe ụmụ ọgbanje nọ. Aha ya bụ Ọkagbue Ụyanwa. Ọkagbue bụ nwoke topuru etopu, gbaa afụ ọnụ ma nweekwa isi nkwọcha. Ọ dị ọcha. Anya ya na-acha ọbara ọbara ma na-atụkwa egwu. O na-ata ikikere eze ya mgbe ọ bụla ọ na-eleta ndị bịara ịkpọtụrụ ya. Ọ jụrụ Okonkwọ ajụjụ ole na ole banyere nwa ahụ nwụrụ anwụ. Ndị agbata obi na ndi ikwu na ibe niile bịara ịgba mkpe gbara ha gburu gburu.

Ọ jụrụ sị: “Kedu ụbọchị ahịa a mụrụ nwa a?”

Okonkwọ zara: “Oye.”

“O wee nwụọ n’ụtụtụ a?”

Okonkwọ sịrị, eee, ma cheta nke mbụ, otu mgbe ahụ na nwa ahụ nwụrụ n’otu ụbọchị ahịa ahụ a mụrụ ya. Ndị agbata obi na ndị ikwu na ibe ahụ hụkwara ihe ndakọ ọnụ a wee kwuo n’onwe ha sị na nke a pụtara ihe.

Onye dibịa ahụ jụkwara sị: “Kedu ebe gị na nwunye gị na-ehi, n’obi gị, ka ọ bụ n’ụlọ ya?”

“ N’ụlọ ya.”

“N’ọdịnihu, kpọbata ya n’obi gị.”

Onye dibịa ahụ wee nye iwu na ha agaghị eriri nwa ahụ uju. O weputara otu agụba dị nkọ n’ime akpa ajị ọ nya n’ubu aka ekpe ya wee bido igburisi nwa ahụ. O buuru ya gaa ili ya n’ajọ ọhịa site n’iji ya n’ụkwụ kpụwa ya n’ala n’azụ ya.

Mgbe e mesochara ya omume dị otu a, ọ ga-eche echiche ugboro abụọ tupu ọ na-apụta ụwa ọzọ, naani ma ọ bụ otu n’ime ndị osi ọnwụ ahụ na-apụta ọzọ wee buru apa nkwarụ ha site na-enweghị otu mkpisi aka ma ọ  bụ ibu akara ojii ebe onye dịbịa kara ha agụba.

Mgbe Ọnwụmbiko nwụchara, Ekwefi abụrụla nwanyị obi ilu. Nwunye di ya nke mbụ amụọlarị ụmụ nwoke atọ ahụ sichara ike. Mgbe ọ mụchara nwa ya nwoke nke atọ n’usoro, Okonkwọ gbuuru ya ewu dị ka omenala siri dị. Ekwefi emeghị ihe ozọ karịa iroro ya iruro ọma. Ma, na chi ojọọ ya enyela ya obi ilu nke ukwu nke na ọ nweghi ike isoro ndị ọzọ ṅụrịa na chi ọma ha. Ya mere, ubọchi ahụ nne Nwoye jiiri oriri na egwu mee ememme ọmụmụ ụmụ ya atọ, naanị Ekwefi bụ onye nọ n’ọgbakọ obi ọma nke obi na-adịchaghị mma. Nwunye di ya a weere ya dị ka ekworo, dị ka otu ndị nwunye di na-eme. Kedukwanụ otu ọ ga-esi mata na Ekwefi anaghị emesara onye ọ bụla obi ọjọọ karịa naanị n’ime obi ya; na ọ naghị ata onye ọ bụla ụta maka ihu ọma ha karịa chi ọjọọ ya nke jụrụ inye ya ihe ọma ọ bụla?

N’ikpeazụ, ọ mụtara Ezimma. Na-agbanyeghị na ọ na-arịakarị ọrịa, ọ dị ka Ezimma ekpebiela na ya ga-adị ndụ. Na mbụ, Ekwefi weere ya otu ahụ o si were ndị ozọ. Ma mgbe Ezimma gbara afọ isii, nne ya bidoro ziwe ya ịhụnanya ndị nne. Ihụnanya a na obi ịnụ ọkụ na-agakọ otu. O kpebiri ịzụlite nwa a n’ahụ ike wee were ike ya niile tinye na ya. Ọ na-enweta ụgwọ ọrụ ya site na mgbe ụfọdụ Ezimma na-eto kpoko kpoko ka nwa mkpi a pịrị apị. N’oge dị otu a, ọ na-adị ka ọ gbanahụna ihe egwu dum. Ma n’otu ntabi anya ahụkwa, ọ ga-ebido rịawa ọrịa. Mmadụ dum matara na ọ bụ ọgbanje. Otu o si arịa ọrịa ma na-enwekwa ahụ ike bụ otu ha si eme. O biteela aka nke mere na ma eleghị anya, o kpebiela na ya ga-ebi. Ike na-agwu ụfọdụ n’ime ha site n’omụmụ na ọnwụwụ ọjọọ ha ndị a ma ọ bụ ha enwe ọmịiko n’ahụ nne wee biri.

Ekwefi kwetara n’ime onwe ya na Ezimma ga-ebi. O kwetara nke a n’ihi na ọ bụ naanị okwukwe na- agba ya ume o ji ebi ndụ. Okwukwe ya siwanyere ike n’ime otu afọ gara aga mgbe otu dibịa gwuputara iyi ụwa Ezimma. Mmadụ dum kwetara na ọ ga-ebi n’ihi na e gbubiela udọ ahụ jikọrọ ya na ụwa ọgbanje. E mere ka obi sie Ekwefi ike. Ka ada ya siri dị ya n’obi mere na o nweghị ike ichefucha egwu ahụ dị ya n’ahụ, Na-agbanyeghị na o kwetara na iyiụwa ahụ e gwuputara bụ ezigbo ya, o chefughi na ụmụaka arụrụ ala ụfọdụ na-eduhie ndị mmadụ ha aga gwupụta nke na-abụghị ya.

Ma na iyi ụwa Ezimma yiri nke ezigbo ya.  Ọ bụ nkume na-akwọ mụrụ mụrụ nke e jiri nkịkara akwa ruru unyi kechie. Ọ bụkwa otu Ọkagbue ahụ a ma ama n’Ụmụọfịa niile n’ihe gbasara ọgbanje gwuputakwara ya. Na mbu, Ezimma achọghị inyere ya aka. Otu ahụ ka ọ na-adị. Ọ dịghị onye ọgbanje ọ bụla na-ekwuputa ihe ụwa ya ọsịịsọ. Otụtụ n’ime ha anaghị ekwuputa n’ihi na ha na-anwụ mgbe ha bụ ụmụntakịrị mgbe e nweghị ike ịjụ ha ajụjụ.

Ọkagbue jụrụ Ezimma sị: “Kedu ebe i liri iyi ụwa gị?” Ọ gbara afọ toolu mgbe ahụ ma sikwa na nnukwu ọrịa na-agbake/na-apụta.

Ọ jụhachiri ya sị: “Gini bụ iyi ụwa.”

“ Ị ma ihe ọ bụ. I liri ya n’ala otu ebe ka i wee nwee ike ịnwụ ma pụtakwa ụwa ọzọ bịa sogbuwe nne gị”

Eziama lere nne ya anya. Nne ya weere anya obi ọjọọ na arịrịọ wụkwasị ya.

Okonkwọ bụ onye nọdebere ya nso, gbọrọ ya ụja sị: “zaa ajụjụ a ọsịịsọ”. Ndị ezinaụlọ ha dum nakwa ụfọdụ ndị agbata obi ha nọkwa ebe ahụ.

Onye dibịa ahụ jiri olu dị nwayọ gwa Okonkwọ sị: “hapụrụ m ya”. Ọ jụkwara Ezimma ọzọ sị: “Kedu ebe i liri iyi ụwa gị?”

Ọ zara ya sị: “Ebe ha na-eli ụmụaka.” Ndị niile nọ ebe ahụ wee tamurịta n’onwe ha. Onye dibịa sịrị ya: “Bịa ka i gosi m ebe ahụ.”

Ndị niile ahụ wee zọpụ ije. Ezimma du ha aga, Ọkagbue na-esochi ya n’azụ. Okonkwọ so ya n’azụ, Ekwefi na-eso ya kwa. Mgbe ọ pụtara n’okporo ụzọ, Ezimma tụgharịrị aka ekpe ya mee ka ọ na-aga n’iyi ha.

Onye dibịa ahụ jụrụ ya sị: “Ma, I kwuru na ọ bụ ebe ha na-eli ụmụntakịrị?”

Ezimma sịrị ya ‘mba’. O ziputara oke mkpa ọ dị ugbu a site n’otu o si aga ije. Mgbe ụfọdụ, o bidoro gbawa ọsọ ma kwụsịkwa na mberede. Igwe mmadụ ahụ ji nwayọ na-eso n’azụ. Ụmụ nwanyị na ụmụntakịrị bu mmiri na-alọta nọ na-eche ihe na-emenụ wee ruo mgbe ha hụrụ Ọkagbue ha wee chee na ọ ga-abụ ihe gbasara ọgbanje. Ha niile maara Ekwefi na ada ya nke ọma.

Mgbe Ezimma rutere n’ukwu osisi ukwu ụdara ahụ, ọ tụgharịrị n’aka ekpe ya wee baa n’ọhịa. Ndị ahụ sokwa ya n’azụ. Site n’otu ọ ha, ọ na-awafe okpuru osisi na ahịhịa ndị ọzọ ngwa ngwa karịa ndị a na-eso ya n’azụ. Ọhịa ahụ bidoro mewe mkpọtụ site na nzọ ụkwụ ndị ahụ n’elu ahịhịa na osisi kpọrọ nkụ nakwa alaka osisi ha na-ebigharị aka. Ezimma bamiri n’ime ọhịa ahụ ebe ndị ahụ ya na ha so, sokwara ya. Ọ tụgharịa azụ na mberede wee bidokwa pụtawa n’okporo ụzọ. Ndị ahụ nyeere efe ka ọ gafee ma sowekwa ya n’azụ.

Okonkwọ baara ya mba sị: “Ọ bụrụ na ị kpọgharịchaa anyị ebe a n’efu, aga m akụpụ gị mmụọ n’anya.”

Ọkagbue sịrị ya: “Agwago m gị ka ị hapụ ya aka. Ama m ka e si eso ha.”

Ezimma duputakwara ha n’okporo ụzọ ahụ ọzọ, lee anya n’aka nri na aka ekpe ya wee tụgharịa n’aka nri ya. Ha wee lọghachị azụ n’ụlọ ha.

Mgbe Ezimma kwụsịchara n’ihu obi nna ya, Ọkagbue jiiri olu na-agbanweghị agbanwe jụọ ya sị: “ Kedu ebe i liri iyi ụwa gị.”

“N’akụkụ ukwu oroma ahụ,” ka Ezimma sara.

Okonkwọ jiri obi iwe sị ya: “Kedu ihe mere i kwughị otụ ahụ gị nwa ọjọọ akalogoli?”

Onye dibịa ahụ egeghị ya ntị. O jiri nwayọ sị Ezimma: “bịa zi m kpọm kwem ebe ahụ.”

“E be a,” ka o kwuru mgbe ha rutere n’ukwu osisi ahụ.

Okagbue sịrị ya: “tụọrọ m ebe ahụ aka.”

Ezimma tụrụ mkpịsị aka ya n’ala wee sị: “Ọ bụ ebe a.” Okonkwọ guzoro ebe ahụ na-asụ ka egbe igwe nke ime udu mmiri.

Ọkagbue sịrị ha nye ya ọgụ.

Mgbe Ekwefi wetara ogụ ahụ, Ọkagbue edotalarị akpa ya ma yifukwa akwa ya wee yiri naani ịba ya. O bidoro ngwa ngwa igwu olulu ebe ahụ Ezimma tụrụ aka. Ndị agbata obi ha nọrọ gburu gburu na-ele olulu ahụ ka ọ na- emiwanye. O sitere n’aja ojii nke elu ala wee banye n’aja uhie nke ụmụ nwanyị ji etecha ala ụlọ nakwa ahụ aja. Ike agwụghị Ọkagbue mgbe o mechiri ọnụ ya na-egwu olulu ahụ, okpovu juputara ya ahụ. Okonkwọ guzoro n’akụkụ olulu ahụ. Ọ gwara Ọkagbue ka ọ pụta zuo ike, ka ya nyere ya aka, ma Ọkagbue sịrị na ike agwubeghị ya.

Ekwefi gara n’ụlọ ya isi ji. Di ya nyere ya ji karịa na mbụ n’ihi na onye dibịa ahụ ga-erikwa nri. Ezimma sooro ya ka o nyere ya aka isi akwukwọ nri.

Ọ sịrị na akwụkwọ nri ahụ ebuka.

Ekwefi jurụ ya sị: : Ị hụghị na ji juru ite?”

“Ị matakwara ka akwụkwọ nri a si epe mpe ma e sichaa ha.”

Ezimma sịrị na nke ahụ bụ eziokwu. Ọ bụkwa ya kpatara orughuru jiiri gbuo nne ya.

“Nke ahụ bụ eziokwu n’ezie”, ka Ekwefi kwuru.

Ezimma wee sịkwa: “O nyere nne ya abọ akwụkwọ nri asaa ka o sie. N’ikpeazụ, ihe ọ hụrụ bụ naanị abọ atọ. O wee gbuo nne ya.”

“Ọ bụghị ebe ahụ ka akụkọ a kwusịrị.”

“ O ho!! Echetala m ugbu a. O wetara abọ akwụkwọ nri asaa ọzọ wee sie. N’ikpeazụ, ihe ọ hụrụ bụkwa naanị abọ atọ. O wee gbuokwa onwe ya.”

Na mbara obi ahụ, Ọkagbue na Okonkwo naara egwu olulu ahụ iji chọpụta ebe Ezimma liri iyi ụwa ya. Ndị agbata obi ha nọkwara gburu gburu na-elepụrụ anya. Olulu ahụ emiela nke ukwuu nke na ha adịghịkwa ahụ onye na-egwu ya. Ihe ha na-ahụ bụ naanị aja uhie ọ na-atụpụta ka ọ na-arị elu. Nwoye guzoro n’akụkụ olulu ahụ n’ihi na ọ chọrọ ịmatacha ihe niile na-eme.

Ọkagbue anarakwala Okonkwọ igwu olulu ahụ. Ndị agbata obi ha na ndị nwunye Okonkwọ na-ekwu okwu ugbu a. Ụmụ aka echefuola ihe gbasara ya wee na-egwuri egwu.

Na mberede, Okagbue wụpụtara n’elu ala ka agụ.

Ọ sịrị ha: “Ọ dịwala nso ugbu a. Ebetula m ya aka.”

Nke a mere ka ndị niile nọ ebe ahụ wee nwee obi aṅụrị ma biliekwa ọtọ.

Ọ gwara Okonkwọ ka ọ kpọọ nwunye ya na nwa ya, ma Ekwefi na Ezimma anụlarị mkpọtụ ahụ wee gbara bịa ka ha mara ihe ọ bụ.

Ọkagbue baghachiri n’ime olulu ahụ bụ nke ndị mmadụ gbarala gburu gburu ugbu a. Ka o kuputachara aja ole na ole, o gwutara iyi ụwa ahụ. O kpachapụrụ anya jiri ọgụ ahụ kulie ya elu wee tụpụta ya n’elu ala. Ụmụ nwanyị ụfọdụ tụrụ egwu gbaa ọsọ mgbe ọ tụpụtara ya. Ma ha lọghachiri, mmadụ dum wee nọrọ ebe tere anya na-ele nkịrịnka akwa ahụ. Ọkagbue pụtara gaa n’akpa ya na-ekwughị okwu ọ bụla ma ọ bụ ile ndị dum nọ ebe ahụ anya. O wepụtara ahịhịa abụọ wee bido ịtarị ha. Mgbe o lochara ha, o welitere nkịrịnka akwa ahụ n’aka ekpe ya wee bido itọpe ya. Nkume ahụ na-akwo mụrụ mụrụ wee si n’ime ya dapụta. O welitere ya.

Ọ jụrụ Ezimma sị: “Ihe a, ọ bụ nke gị?”

Ọ zara ya sị: “eee!” Ụmụ nwanyị dum nọ ebe ahụ tiri mkpu ọṅụ n’ihi na nsogbu Ekwefi niile abịala na ngwụcha n’ikpeazụ.

Ihe ndị a mere n’ihe karirị otu afọ gara aga. Kemgbe ahụkwanụ, Ezimma ariabeghị ọrịa ọ bụla. Na mberede ugbu a, o bidoro mawa ahụ jijiji n’ime abalị. Ekwefi kpọgara ya n’usekwu, tọọ ute n’ala wee munye ọkụ. Ma na ọnọdụ ya jọwanyere njọ. Ekwefi kpọkuru chi ya ugboro ugboro ka o gburu ikpere n’akụkụ Ezimma wee bido ya aka n’ihu ya nke jụrụ oyị ma na-erekwa ọkụ. Na-agbanyeghị na ndị nwunye di ya naara asị na ọ bụ naanị ịba, o geghị ha ntị.

………………………………………………………………………………

Okonkwọ siri n’ọhịa ahụ lọta buru ukwu ahịhịa mgbọrọgwụ na ahụ osisi ndị e ji eme ọgwụ n’ubu aka ekpe ya. Ọ gara n’ụlọ Ekwefi dote ibu ahụ wee nọrọ ọdụ.

Ọ gwara Ekwefi sị: “Weputara m otu ite ma hapụkwa nwa ahụ aka.”

 Ekwefi gara iwetara ya ite ahụ. Okonkwọ họpụtara ndị kachasị mma site n’ukwu ọgwụ ahụ dị ka ha siri hara, we gburusie ha. Ọ wụnyere ha n’ite ahụ. Ekwefi wee wụnye ya mmiri.

“O zuola?”, bụ ihe ọ jụrụ mgbe ọ wụnyerela ihe dị ka ọkara iko mmiri.

“Tinyekwuo ntakịrị… Asịrị m ntakịrị. Ntị,  o chiri gị?”, ka Okonkwọ gbọrọ ya n’ụja.

O sinyere ite ahụ n’ọkụ, Okonkwọ weere mma ya ilaghachi n’obi ya.

            Mgbe ọ na-aga, ọ gwara ya: “Ị ga-akpachapụrụ ite ahụ anya, ekwela ya ka ọ gbọfee. O mee otu a, ike ya niile ga-efusi.” Ọ gara n’ulọ ya. Ekwefi bidoro ile ite ọgwụ anya ka a ga-asị na ọ bụkwa onye ọrịa. Mgbe dum anya ya na-esite ebe Ezimma nọ wee ruo ebe ite ogwụ ahụ si n’ọkụ.

Okonkwọ lọghachiri mgbe o chere na ọgwụ ahụ adila mma. O lere ya anya wee sị na o gheela. Ọ sịrị: “Weta otu nnukwu ute ma butekwara Ezimma otu ochie dị ala.” Ọ fọturu ite ahụ wee dote ya n’ihu oche ntakịrị ahụ. O kulitere Ezimma, kusa ya n’ochie ahụ, gbasaa ya n’elu ite ahụ na-ekusi ọkụ. O jiiri nnukwu ute ahụ kpugide ya. Ezimma gbalịrị otu ọ ga-esi azọrọ onwe ya site n’ukuru ọkụ ahụ nke na-egbochi ya ume, ma na nna ya kpugidere ya ebe ahụ. O bidoro bewe akwa.

Mgbe e kpuliri ute ahụ n’ikpeazụ, okpovu juru ya ahụ. Ekwefi jiiri akwa hichaa ya ahụ. O dinara ala n’ute ọzọ wee rahụ ụra.

  

IGBO AMAKA

ỤLỌAKWỤKWỌ IGBO

MỤTA IGBO

CULTURAL DANCE

MASQUERADE

EGWU DI YA

EDEMEDE IGBO

ONYE NKUZI IGBO

OLU ỤMỤ IGBO

IGBO MADE EASY

Learn In Igbo in 1 day

Learn In Igbo

Copyright � 2018-2020. Mother Tongue Academy. All Rights Reserved.We can be  reached  by Phone at (516) 442-9191  or by our Website  Contact  E-mail