Login and Register

Log in  \/ 
x
x
Register  \/ 
x

Home

Chap14-Isi Iri Na Anọ

ISI NKE IRI NA ANỌ            AGBA NKE ABỤỌ

 

 

Ndị ikwunne Okonkwọ nabatara ya nke ọma na Mbanta. Okenye nabatara ya bụ onye nne ya tọrọ nke bụkwa onye tọchara mmadụ dum ugbu a n’ezinaụlọ ahụ. Aha ya bụ Uchendụ. Ọ bụkwa ya nabatarala nne Okonkwọ n’iri afọ atọ gara aga bụ mgbe e siri Ụmụọfịa bulata ya ili ya n’ebe a mụrụ ya.

Okonkwọ ka bụrịị nwantakịrị mgbe ahụ. Uchendụ ka na-echeta otu o si beere nne ya akwa nọdụ nke ọma ọdịnala: “Nne m, nne m, nne m alawala.”

Nke ahụ mere ọtụtụ afọ gara aga. Taa, Okonkwọ anaghị ebulata nne ya ụlọ ha ili ya ebe ahụ. Ọ kpọọrọ ndị nwunye ya atọ na ụmụ ya iri na otu ịbịa izere ndụ n’ikwunne ya. Mgbe Uchendụ hụrụ ka ihu dị ya na ndị ya, ọ kọtara ihe merenụ, n’ihi ya, ọ jụghị ha ajụjụ ọ bụla. Naanị n’echi ya ka Okonkwọ kọọrọ ya ihe merenụ. Okenye a tọrọ ntị ya n’ala nụrụcha akụkọ a. N’ikpeazụ, o kudara ume wee sị: “Nke a bụ ọchụ nwanyị.” N’ihi ya, ọ kwadochara mmemme na aja niile a na-achụ maka ya.

O gosiri Okonkwọ ala ebe ọ ga-arụ ụlọ ya, ma gosikwa ya ala abụọ ọzọ ebe ọ ga-arụ ọrụ n’oge ọrụ ubi na-abịanụ. Site n’enyem aka ndị ikwunne ya, ọ rụtaara onwe ya obi, ma rụtara ndị nwunye ya ụlọ atọ. O webatara chi ya nakwa ihe ndị ọzọ na-anọchi anya ndị nna ya nwụrụ anwụ. Nke ọ bụla n’ime ụmụ ise Uchendụ tụkọtaara nwanne ha a narị jị atọ  ka o wee nwee ike ibido ọrụ ubi n’ihi na ọrụ ga-ebiri ọkụ ngwa ngwa mmiri mbụ bidoro. N’ikpeazụ, mmiri ozuzo bịara. Ọ bịara na mberede mee dịkwa egwu. N’ime ọnwa abụọ ma ọ bụ atọ, anyanwụ naara achasi ike wee ruo mgbe ọ dịzi ka ọ wụkwasịrị ọkụ ya n’elu ụwa. Ahịhịa niile akpọọla nkụ, aja werezie na-ata ọkụ ka ọ bụ icheku ọkụ. Uzuzu tapachara n’elu osisi ndị ahụ na-adịghị agbụsị ahiahịa ha. Ụmụ nnunu niile dara jụụ n’ọhịa, okpomọkụ wee na-egbusi ụmụ ụwa. Egbe igwe wee gbaa. Ọ gbara dị ka ala ga-agbawa agbawa, na-abụghị otu ahụ ọ na-adị n’ime udummiri.Nnukwu ikuku bidoro kuwe wee busasịa uzuzu ebe dum. Osisi nkwụ naara emegharị ahụ mgbe ikuku a naara ebugharị igu ha dị ka ebe e kere isi pụrụ iche.

Mgbe mmiri ozuzo bịara n’ikpeazụ, ọ bụụrụ mkpụrụ mmiri buru ibu nke ndị obodo kporọ ‘akụ mmiri igwe’. Ha siri ike ma na-afụkwa ụfụ n’ahụ mgbe ha na-ada, ma ụmụaka jiri obi ụtọ na-agbagharị atụtụrụ akụ ndị a jụrụ oyi na-atụnye n’ọnụ ha ka ha gbazee.

Ahịhịa bidokwara pute ọzọ n’ala, ebe ụmụ nnụnụ nọ n’ọhịa bido kwara na-efeghari na na-awụgharị n’obi ụtọ. Isisi ahịhịa ndụ juputakwara ebe dum. Mgbe mmiri ahụ bidoro jiiri nwayọ na-edo, ụmụaka ndị a gbabara n’ime ụlọ ha. Ha nwere obi aṅụrị, ha gbadochara ahụ ma kelee kwa ọbasị dị n’elu.

………………………………………………………………………

Okonkwọ na ndị ezi na ụlọ ya rụsịrị ọrụ ike inweta ubi ọhụrụ. Ọ dị ka ebe a na-ebido ndụ ọhụrụ n’enweghị ike na ndụ okorọbịa, dịkwa ka ebe a na-amụ aka ekpe na nka. Irụ ọrụ adịghịkwa eme ya obi ọma dị ka o si eme ya na mbụ. Mgbe o nweghị ọrụ ọ ga-arụ, ọ na-anọ nwayọ wee hiwe ụra.

Otu ihe naarala anụ Okonkwọ ọkụ n’obi na ndụ ya niile- ịbụ otu n’ime ndị isi obodo. Ihe a bụrụla ihe o bu pụta ụwa. Ọ fọdụrụ ntakịrị ka o mezuchaa nke a. N’otu mgbe, ihe dum wee tisasịa. A chụpụla ya n’ala ya dị ka azụ a gupụtara na mmiri. O doola ya anya na chi ya abụghị maka ihe ndị siri ike. Mmadụ agaghị agafe ihe chi ya kwadoro ya. Okwu ahụ ndị okenye na-ekwu sị na ‘ onye kwe, chi ya ekwe’ abụghị eziokwu. Nke a bụ nwoke chi ya jụrụ ajụ n’agbanyeghị na o kwere ekwe.

Okenye ahụ bụ Uchendụ ahụla na Okonkwọ adaala mba n’ihe dum, ya mere o jiri wute ya nke ukwu. O kpebiri na ya ga-agwa ya okwu mgbe ha mechara emume ịsa ifi.

Amikwu, onye bụ ọdụdụ n’ime ụmụ nwoke ise Uchendụ, naara alụ nwanyị ọhụrụ. Ọ kwụchaala ụgwọ isi ya, naani ihe fọdụrụ bụ ememme ikpeazụ. Amikwu na ndị ebe ha bugarala ndị ọgọ ha mmanya n’ihe dị ka ọnwa abụọ tupu Okonkwọ abịaruo Mbanta. Ugbu a bụ oge emume nkwupụta ikpeazụ a.

Ndị ụmụada ezinaụlọ ahụ niile nọ ebe ahụ, ụfọdụ n’ime ha sitere n’ụlọ ha tere anya wee bịa. Onye bụ isi ada Uchendụ siri obodo ya bịa, nke bụ ebe a na-eji ọkara ụbọchị agaru. Ụmụada ndị nwanne Uchendụ nọchakwa ebe ahụ. Ọ bụurụ ọgbakọ ukwu nke ụmụada dị ka otu ha ga-esi gbakọọ ma ọ bụrụ na mmadụ nwụrụ n’ezi na ụlọ ha. Ha dị iri abụọ na abụọ.

Ha nọrọ ọdụ gburu gburu n’ala, nke ahụ a na-alụ jiri ọkụkọ n’aka nri ya wee nọrọ ha n’etiti. Uchendụ ji ọfọ nke ezinaụlọ ha wee nọkwute ya. Ndị nwoke ndị ọzọ guzoro ha n’azụ wee na-elepụrụ anya. Ndị nwunye ha nọkwa ebe ahụ elepụrụ anya. Ọ bụ mgbe anyasi mgbe anwụ naara ada.

Njide, onye bụ isi ada Uchendụ, jụrụ ajụjụ ndị a. O bidoro sị: “Ị ga-echeta na ọ bụrụ na i kwughị eziokwu, ị ga-ata ahụhụ ma ọ bụ nwụokwa mgbe ị ga-amụ nwa. Ụmụ nwoke ole ka gị na ha labarala kemgbe ahụ nwanne m nwoke buuru ụzọ gosi mmasị na ya chọrọ ịlụ gị?”

Nwa ahụ zara sị: “O nweghị.”

Ụmụ nwanyị ndị ọzọ gwara ya ka o kwuokwa eziokwu.

Njide jụrụ ya ọzọ: “Ị sị na o nweghị?”

“O nweghị,” ka ọ zara.

Uchendụ sịrị ya: “Were ọfọ nna anyị a dụọrọ anyị isi.”

Nwa ahụ sịrị ya: “ Emere m otu ahụ.”

Uchendụ naara ya ọkụkọ ahụ, were mma dị nkọ chabie ya olu ma werekwa ọbara ya fesa n’ọfọ ya ahụ.

Site n’ụbọchị ahụ, Amikwu kpọrọ nwa agbọghọ ahụ baa n’ụlọ ya, o wee bụrụ nwunye ya. Ụmụada ndị ahụ alaghachighị azụ n’ụlọ ha otu ihu ahụ, kama ha na ndị ikwu ha nọrọ abalị abụọ ma ọ bụ atọ.

N’ụbọchị nke abụọ, Uchendụ kpọkọtara ụmụ ya niile, ma ndị nwoke ma ndị nwanyị, nakwa nwa nwanne ya nwanyị-Okonkwọ. Ndị nwoke wepụtara ute akpụkpọ anụ ha nke ha jiri nọrọ n’ala, ebe ndị nwanyị  jiri ute nkịtị nọrọ n’aja a wụlịtere elu.

Uchendụ jiri nwayọ dọọ afụ ọnụ ya na-acha awọ awọ aka, na-atakwa ikikere eze ya. O wee bido ikwu okwu. O jiri nwayọ, kpachapụrụ anya n’ihe niile ọ naara ekwu.

“Ọ bụ Okonkwọ ka m bu n’obi ịgwa okwu, ma achọrọ m ka unu dum gee ntị n’ihe m ga-agwa ya. Abụ m okenye ma unu dum bụ ụmụaka. Ama m ihe banyere ụwa a karịa onye ọ bụla n’ime unu. Ọ bụrụ na o nwere onye n’ime unu chere na ya ma karia, ya kwuo.” O mechiri ọnụ ya, ma ọ dịghị onye kwuru okwu.

“Kedu ihe kpatara anyị na Okonkwọ jiri nọrọ taa” Ebe a abụghị obodo ya. Anyị bụ naanị ndị ikwunne ya. Ọ bụghị onye ebe a. Ọ gbatara ọsọ ndụ e kpebiri na ọ ga-anọ, na ọ ga-ebi n’ala ndị ọzọ afọ asaa. N’ihi ya, ọnụma jupụtara ya obi. Ma, ọ ga–amasị m ijụ ya otu ajụjụ. Okonkwọ, i nwere ike ịgwa m ihe kpatara na otu n’ime aha ndị anyị na-agụkarị ụmụaka bụ Nneka? Anyị niile maara na nwoke bụ di nwe ụlọ, ndị nwunye ya na-eme ihe ọ bụla ọ chọrọ. Nwa ọ bụla bụ nke nna ya n'ezinaụlọ ya, n’abụghị nke nne ya na ezinaụlọ ya. Nwoke ọ bụla na-ebi n’ala nna ya n’abụghị n’ikwunne ya. N’agbanyeghị nke a, anyị na-asị Nneka. Ọ bụ gịnị kpatara ya?”

Mmadụ dum mechichara ọnụ ha. Uchendụ wee sị: “Achọrọ m ka Okonkwọ saa m ya.”

Okonkwọ zara ya sị: “Amaghị m ya.”

“Ị sị na ị maghị ya? Ị hụla na ị bụ nwanta. Ị nwere ọtụtụ ndị inyom na ụmụaka, karịa ụmụaka ndị nke m. Ị bụ onye a ma ama n’obodo gị, ma ị ka bụ nwanta, nwa m. Gee ntị aga m agwa gị. O nwere otu ajụjụ ọzọ m ga-ajụ gị. Kedu ihe kpatara na nwanyị nwuo e bulata ya ụlọ ha ili ya n’ebe ndị nwe ya? A naghị eli ya n’ebe ndị di ya. Ọ bụ gịnị kpatara ya?

E bulatara m nne gị, anyị wee lie ya. Ọ bụ gịnị kpatara ya?”

Okonkwọ fufere isi ya.

Uchendụ sịrị: “Ọ makwaghị nke ahụ, ma lee ka iri uju juputara ya ahụ maka na ọ bịara ibi n’ikwunne ya afọ ole na ole.” Ọ chịrị ọchị eze mmanụ wee tụgharịa ebe ụmụ ya nọ. “Ọ dị onye n’ime unu  pụrụ iza ajụjụ ahụ?̂“

Ha niile fufere isi ha.

Ọ kwachara olu ya wee sị ha: “ Geenụ m ntị. Ọ bụ eziokwu na nwa bụ nke nna ya. Ma, mgbe nna kụrụ nwa ya ihe, ọ na-agbakwuru nne ya. Nwoke na-ebi n’ala nna ya mgbe ihe dị mma, ụwa na-atọkwa ụtọ. Ma mgbe ihe mgbu na iri uju pụtara, ọ na-agbaga ọsọ ndụ n’ikwunne ya. Nne gị nọ ebe a ichedo gị. E liri ya ebe a. Ya mere anyị ji asị na nne ka. Ọ ga-adị mma na gị bụ Okonkwọ ga-ebutere nne gị ihu ike wee hapụ inwe obi ọma?. Kpachara anya gị ka ị ghara imejọ onye nwụrụ anwụ. Ọrụ gị ugbu a bụ ime ka obi dị ndị nwunye gị na ụmụ ha mma, ka i wee durukwa ha laghachi azụ n’obodo unu mgbe afọ asaa gachara. Ma ọ bụrụ na i kweta ka obi ọjọọ wetuo ma gbuokwa gị, ha niile ga-anwụsị n’ala ndị ọzọ.” O mechiri ọnụ ya ogologo oge. “ Ndị a bụ ndị ikwu gị.” Ọ tụrụ ụmụ ya aka. “I chere na ahụhụ nke gị kacha n’uwa a. Ị ma na ndị ụfọdụ ndị na-etufu ji ha dum nakwa ụmụ ha? Ọ dị mgbe m nwere ndị inyom isii. Ugbu a enweghị m onye ọzọ karịa nwa agbọghọ ahụ na-amaghị aka nri na aka ekpe ya. Ị ma ụmụ ole m lirila- ụmụ ndị m mụrụ n’okorọbịa mgbe m nwere ike?

Iri abụọ na abụọ. Akwugbughị m onwe m, aka nọ m ndụ. I chee na ahụhụ nke gị kachaa n’ụwa, jụọ Akueni, ada m ụmụ ejima ole ọ mụrụla  tụfuo. Ị nụbeghị egwu ahụ a na-agụ ma mmadụ nwụọ?”

“Onye ka ọ dịịrị mma, onye ka ọ dịịrị mma?

Ọ dịghị onye ọ diirị mma.”

“O nweghị ihe ọzọ m ga-agwakwa gị.”

 

IGBO AMAKA

ỤLỌAKWỤKWỌ IGBO

MỤTA IGBO

CULTURAL DANCE

MASQUERADE

EGWU DI YA

EDEMEDE IGBO

ONYE NKUZI IGBO

OLU ỤMỤ IGBO

IGBO MADE EASY

Learn In Igbo in 1 day

Learn In Igbo

Copyright � 2018-2020. Mother Tongue Academy. All Rights Reserved.We can be  reached  by Phone at (516) 442-9191  or by our Website  Contact  E-mail