Login and Register

Log in  \/ 
x
x
Register  \/ 
x

Home

Chap16-Isi Iri Na Isii

ISI NKE IRI NA ISỊỊ 

 

N’ihe dị ka afọ abụọ ọzọ mgbe Obierika gara kpọtụrụ enyi ya nwoke ahụ gbapụrụ n’ala ndị ọzọ, ọ bụchakwaghị nke obi ọma. Ndị oziọma abịala n’Ụmụọfịa. Ha arụọla ụlọ ụka ha ebe ahụ wee meekwa ka ụfọdụ mmadụ chegharịa. Ha naara ezipukwa ndị na-agbasa oziọma ka ha gaa n’obodo ndị gbara ha gburu gburu. Ihe a bụ ihe iri uju nye ndị ndu obodo ha, ma ọtụtụ n’ime ha nwere nchekwube na okwukwe a pụrụ iche nakwa chi nwa bekee a agaghị adịgide ebighi ebi. Ọ dịghị onye ọ bụla n’ime ndị a gbakwuru ya bụ onye a na-ege ntị n’olu na nzukọ obodo ha.

Ọ dịghị onye n’ime ha chiri echichi. Ọtụtụ n’ime ha bụ ndị ndị obodo na-akpọ efulefu: ndị na-abaghị uru. Ihe ndị obodo ji atụnyere efulefu bụ nwoke rere mma ya wee jiri naanị ọbọ ya gaa agha. Chielo, eze nwanyị Agbala, kpọrọ ndị a gbakwuru ndị ụka nsị nke obodo, wee kpọkwa okwukwe ọhụrụ ahụ nkịta ara nke bịara ịracha nsị ahụ.

Ihe mere Obierika jiri bịa ịhụ Okonkwọ bụ site n’ọhụhụ mberede ọ hụrụ Nwoye, nwa Okonkwọ, n’etiti ndi oziọma a n’Ụmụọfịa.

N’ikpeazụ mgbe ndị oziọma ahụ kwere ka o kwuoro Nwoye okwu ka o nwechara ihe mgbochu, ọ jụrụ ya sị: “Kedu ihe ị na-eme ebe a?”

Nwoye zara ya sị: “ Abụ m otu onye n’ime ha.”

Obierika, n’amaghị ihe ọzọ ọ ga-ekwu jụrụ ya sị: “Kedu maka nna gị?” Nwoye jiri obi ọjọọ sị ya: “Amaghị m. Ọ bụghị nna m.”

Ya mere Obierika jiri gaa Mbanta ịhụ enyi ya. Ọ chọpụtara na Okonkwọ achọghị ikwu ihe ọ bụla gbasara Nwoye. Ọ bụ naanị site n’ọnụ nne Nwoye ka ọ nụrụ ihe ole na ole banyere akụkọ ahụ.

………………………………………………………………………………………………

Ọbịbịa ndị oziọma a butere oke mgbagharị na Mbanta. Ha dị mmadụ isii, otu n’ime ha bụ onye bekee. Ma nwoke ma nwanyị pụtara ịhụrụ onye bekee ahụ. Akụkọ banyere ndị bekee a bawanyere ụba kemgbe ndị Abame gburu otu n’ime ha ma kedokwa ịnyịnya igwe ya n’elu osisi akwụ ha ahụ dị nsọ. Ya mere onye ọ bụla pụtara ịhụ onye bekee ahụ. Mgbe ahụ bụ mgbe mmadụ dum ji anọ n’ụlọ ha n’afọ. Ha emechaala owuwe ihe ubi.

Mgbe ha gbakọchara, onye bekee ahụ bidoro ịgwa ha okwu. Ọ gwara ha okwu site n’ọnụ otu onye Igbo, n’agbanyeghị na ụdaolu ya pụrụ iche site na nke ndị Mbanta. Ọtụtụ ndị mmadụ chịrị ọchị otu o si asụ asụsụ nakwa otu o sị akpọ okwu ha amaghị. Kama ọ ga-asị ‘mụ onwe m”, ọ naara asị ‘ike m’. Ma, ọ bụ nwoke gbara agba, ndị obodo wee gee ya ntị. Ọ gwara ha na ya bụ otu n’ime ha dị ka ha na-ahụ site n’ụcha ya nakwa asụsụ ya. Mmadụ anọ ndị ojii ndị ọzọ ahụ bụ ụmụnna ya, n’agbenyeghị na otu n’ime ha anaghị asụ Igbo. Onye bekee ahụ bụkwa nwanna ha n’ihi na ha niile bụcha ụmụ Chukwu. Ọ gwara ha ihe banyere Chukwu ọhụrụ a bụ onye kere ụwa dum na mmadụ dụm. Ọ gwara ha na ha na-efe chi ụgha, chi osisi na nkume. Mgbe o kwuru nke a, ndị mmadụ tamuritara n’onwe ha. Ọ gwara ha na Chi nke eziokwu bi n’elu igwe ebe onye ọ bụla nwụrụ anwụ ga-aga n’ihu ya ka e kpee ya ikpe. Ndị na-eme ihe ọjọọ na ndị a na-efe arụsị bụ ndị mechiri anya ha akpọ isi ala nye osisi na nkume ka a ga-atụnye n’ime ọkụ nke na-enwu ka mmanụ nkwu. Ma ndị niile na-efe ezi Chi a, ga-ebi n’ala eze ọma ya ebighị ebi. Ọ sịrị ha: “Ọ bụ Chi ukwu a zitere anyị ka anyị gwa unu ka unu hapụ ajọ ụzọ unu na chi ọjọọ unu wee bịakute ya ka e wee zọpụta unu mgbe unu nwụrụ.”

Otu onye kpara ihe ọchị wee sị ya: “Ike gị na-aghọta asụsụ anyị.” Igwe mmadụ ahụ wee dapụ n’ọchị.

Onye bekee ahụ jụrụ onye ọkọwa okwu ya sị: “gịnị ka o kwuru?”.Tupu ọ ga-asa ya, onye ọzọ jụrụ ajụjụ sị: “Kedukwanụ ịnyịnya nwa bekee?” Ndị oziọma ndị Igbo a sụkọtara isi ọnụ wee kpebie na e leghị anya, ihe nwoke ahụ bu n’obi bụ ịnyịnya igwe. Ha gwara nwa bekee, o wee chịa ọchị.

Ọ gwara ndị ozi ya sị: “gwa ha na aga m eweta ọtụtụ ịnyịnya igwe mgbe anyị na ha birichara.”

Ụfọdụ n’ime ha ga-agbakwa ịnyịnya igwe n’onwe ha.” A kọwaara ha nke a, ma ọ bụ naanị ole na ole n’ime ha nụrụ ya. Ha naara agwarịta onwe ha okwu n’ihi na nwa bekee sịrị na ya na-aga ibi n’obodo ha. Ha echebughị ihe gbasara nke ahụ.

N’ebe a otu agadị nwoke sịrị na ya nwere ajụjụ. Ọ jụrụ sị: “Kedu nke bụ chi unu a, ala, chi nke elu igwe, Amadịọha nke egbe igwe, o leghị nke ọ bụ?”

Onye nkọwa okwu a gwara nwa bekee ihe a, o nyere ọsịsa ya otu ihu ahụ. “Chi ndị a niile ị kpọrọ aha enweghị nke bụ chi ma ọlị. Ha bụ chi aghụghọ na-agwa unu ka unu gbuo mmadụ ibe unu ma bibiekwa ụmụaka na-enweghị ihe ha mere. Anyị nwere naanị otu chi onye nwe  ụwa, elu igwe, mụ na gị na anyị dum.”

Otu onye ọzọ jụrụ sị: “Ọ bụrụ na anyị ahapụ chi anyi wee sowe chi nke gị, onye ga-echodo anyị site n’iwe chi anyị na nna anyị ochie ndị a anyị hapụrụla?”

Onye bekee zara ha sị: “Chi unu ndị a adịghị ndụ, ha agaghịkwa eme unu ihe ojọọ ọ bụla. Ha bụ naanị  ike osisi na nkume.”

Mgbe a kọwaara ndị Mbanta ihe a, ha dapụrụ n’ọchị ịkwa emu. Ha sịrị n’ime onwe ha na ara na-acha ndị ahụ. Ma ọ bụghị otu a, kedu ka ha ga-esi kwuo sị na Ala na Amadịọha anaghị akpa ike ọ bụla? Ma Idemili, ma Ogwugwu kwa? Ụfọdụ n’ime ha bidoro lawa.

Ndị oziọma a bidoro bụwa abụ. Ọ bụ otu n’ime abụ utọ mgbasa oziọma nke nwere ike ịsachapụ ihe ruru inyi n’obi onye Igbo. Onye nkọwa okwu ahụ kọwaara ndị ahụ usoro abụ ndị a n’otu n’otu. Ụfọdụ n’ime ha bụ ndị nwerela mmasị. Ọ bụ akụkọ banyere ụmụnne abụọ ndị jiri egwu biri n’ọchichịrị n’amaghị ihụnanya Chukwu. Ọ kọrọ banyere otu nwa atụrụ nke kpafuru n’ugwu, site n’ọnụ ụzọ nke Chukwu nakwa site na nlekọta anya nke onye ọzụzụ atụrụ.

Mgbe ha bụchara abụ a, onye nkọwa okwu gwara ha ihe banyere okpara Chukwu a nke aha ya bụ Jesu Kristi. Okonkwọ, onye nke nọdụrụ n’ihi na ma e leghị anya ha ga-apịa ndị a ụtalị ma chụọkwa ha ọsọ, sịrị : “I jiri ọnụ gị gwa anyị na e were naanị otu chi. Ugbu a ị na-ekwu ihe banyere ọkpara ya. Ọ ga-enwenụ nwanyị.”

Igwe mmadụ ahụ kwetara nke a.

Onye nkọwa ahụ ekwusighị ike, ma na ọ sịrị: “Asịghị m na o nwere nwanyị.”

Onye ahụ na-eme ihe ọchị sịrị ya: “Ike gị kwuru na o nwere ọkpara, ya mere, ọ ghaghị inwe nwunye, ha dum aghaghịkwa inwe ike.”

Onye oziọma ahụ egeghị ya ntị ma ọ gara n’ihu ikwu ihe gbasara mmuọ nsọ. N’ikpeazụ, Okonkwọ kwetara n’ezie na ara na-acha nwoke ahụ. Ọ gbara ụwa ya nkitị wee pụwa ịga ikụ ngwọ ehihie ya.

Ma ọ dị otu nwantakịrị ihe a niile masịcharala. Aha ya bụ Nwoye, diọkpara Okonkwọ. Ọ bụghị ihe ara ahụ gbasara mmụọ nsọ masichara ya. Ọ ghọtaghị ihe ọ bụ. Ọ bụ nka okwu ndị ụka ọhụrụ a bara ya n’ụmị ọkpụkpụ. Abụ ahụ gbasara ụmụnne abụọ ndị nọọrọ n’ọchịchịrị nakwa egwu  mere ka ọ zaala ajụjụ ahụ na-adị ma na-enyekwa ya nsogbu n’obi mgbe ọ bụla - ajụjụ gbasara ụmụ ejima ndị na-ebe akwa n’ime ọhịa nakwa ajụjụ gbasara Ikemefuna bụ onye e gburu egbu. Ọ di ka e bupụrụ ya ibu arụ mgbe abụ ahụ naara aba ya na mmụọ. Okwu ndị dị n’abụ ahụ di ka ebe mkpụrụ mmiri naara agbaze n’elu ala kpọrọ nkụ. Ọ gbara mmụọ ya gharịị n’ihi aghọtaghị aghọta.

 

IGBO AMAKA

ỤLỌAKWỤKWỌ IGBO

MỤTA IGBO

CULTURAL DANCE

MASQUERADE

EGWU DI YA

EDEMEDE IGBO

ONYE NKUZI IGBO

OLU ỤMỤ IGBO

IGBO MADE EASY

Learn In Igbo in 1 day

Learn In Igbo

Copyright � 2018-2020. Mother Tongue Academy. All Rights Reserved.We can be  reached  by Phone at (516) 442-9191  or by our Website  Contact  E-mail