Login and Register

Log in  \/ 
x
x
Register  \/ 
x

Home

Chap17-Isi ke Iri Na Asaa

ISI NKE IRI NA ASAA

 

 Ndị oziọma ahụ nọrọ abalị anọ ma ọ bụ ise mbụ ha n’ọma ahịa, ha gara n’ime obodo n’ụtụtụ ịgbasa oziọma. Ha jụrụ maka onye bụ eze ndị obodo, ma, a gwara ha na ha enweghị eze. Ha sịrị: “ Anyị nwere ndị chiri echichi, ndị isi nchụ aja na ndị okenye.”

Ọ dịrịghị ha mfe inweta ndị a chiri echichi na ndị okenye ha n’ụbọchị mbụ ahụ ha bidochara. Ma, na ndị oziọma ahụ adaghị mba. N’ikpeazụ, ndị ndu Mbanta nabatara ha. Ha rịọrọ ha ala ebe ha ga-ewu ụlọ ụka ha.

Obodo ọ bụla na isiama ọ bụla nwere ‘ajọ ọhịa’ ha. N’ime ya ka a na-eli ndị niile ọrịa ọjọọ dị ka ekpenta na akpata gburu. Ọ bụkwa ebe ahụ ka a na-etufu akpa ọgwụ ndị dịbịa ike mgbe ha nwụrụ. Ya mere ụmụ mmụọ ndị na-akpa ike ọjọọ jiri jupụta n’ime ajọ ọhịa ọ bụla. Ọ bụ ọhịa dị otu a ka ndi ndu Mbanta nyere ndị oziọma ahụ. N’ezie ha achọghị ndị oziọma ahụ n’ala ha n’ihi ya ka ha jiri nye ha onyinye ahụ nke onye ọ bụla ṅụjuru ara afọ na-agaghị ana.

Uchendụ gwara ndị ụmụnna ya mgbe ha zukọtara sị: “Ha chọrọ ala iji rụọ ụlọ arụsị ha. Anyị ga-enye ha ala.” O mechiri ọnụ ya. Ndị na-ekwenyeghị n’ihe o kwuru na ndị ihe ahụ gbara gharịị bidoro tamuwe n’onwe ha. “Ka anyị nye ha otu akụkụ ajọ ọhịa ahụ. Ha nyara isi sị na ha nwere ike imeri ọnwụ, ka anyị chụpụ ha n’ọgbọ agha lee otu ha ga-esi nwe mmeri.” Ha chịrị ọchị ma kwekọrịtakwa, ha kpọwara ndị oziọma ahụ bụ ndị ha gwara ha nye ha ohere ka ha wee gbaa izu. Ha nyere ajọọ ọhịa ahụ dị ka ha si chọọ ime. Ihe tụkarịrị ha n’anya bụ na ndị oziọma ahụ kelere ha, wee bụwakwa abụ.

Ndị ndu obodo ụfọdụ sịrị: “Ha aghọtaghị, ma ha ga-aghọta mgbe ha gara n’ala ahụ n’ụtụtụ echị.”

Ha lasasịrị.

N’ụtụtụ echi ya, ‘ndị ara’ ahụ bidoro n’ezie sụchawa otu akụkụ ọhịa ahụ ma rụwakwa ụlọ ha. Ndị Mbanta dum nwere olile anya na ha ga-anwụcha n’ime abalị anọ. Abalị mbụ gafere, nke abụọ, atọ na anọ, ma ọ dighị onye n’ime ha nwurụnụ. Ihe a gbara mmadụ dum gharịị. Ha niile matara na chi nwa bekee nwere ike dị egwu. Ha sịrị na o yi enyo anya ka o wee nwee ike ịhụ ụzọ wee gwa ndị mmuọ ọjọọ okwu. Na mgbe na-adịghị anya, o nweela mmadụ atọ mbụ ndị chegharịla.

N’agbenyeghi na Nwoye nwere mmasị n’okwukwe ọhụrụ a site n’ụbọchị mbụ, o dotere ya n’onwe ya. Ọ gaghị anwa anwa agakwuru ndị ozịọma ahụ n’ihi egwu nna ya. Ma, mgbe ọ bụla ha bịara ịgbasa ọziọma n’ahịa ma ọ bụ na n’ama egwuruegwu obodo, Nwoye ga-anọ ebe ahụ. O bidola matawa ụmụ akụkọ ụfọdụ ha kọrọ.

Mazị Kiaga nke bụ onye nkọwa okwu ahụ, ma bụrụkwa onye nlekọta ọgbakọ ọhụrụ ahụ, kwụrụ sị na ha arụọla ụlọ ụka ugbu a. Nwa bekee alaghachila Ụmụọfịa bụ ebe o ji mere isi ọnọdụ ya, bụkwa ebe ọ na-esite gaa leta ọgbakọ Mazị Kiaga na Mbanta.

Mazị Kiaga kwuru sị : Ugbu a anyị arụọla ụlọ ụka, anyị chọrọ ka unu na-abia ebe a kwa abalị asaa ikpere Chi nke eziokwu.

N‘ụbọchị ụka na-eso ya, Nwoye gafere obere ụlọ aja ahụ ugboro ugboro ma o nweghị ike imejupụta mmuọ ya ịbanye. Ọ nụrụ ụda abụ, na-agbanyeghị na ọ bụ mmadụ ole na ole na-abụ ya, ọ na-adasi ike ma nweekwa nchekwube. Ụlọ ụka ha guzoro n’otu ebe ha bọchara gburu gburu nke yiri ọnụ Ajọ ọhịa mehere emehe. Onye ma ma ọ na-achọ ịkụkọta eze ya ọnụ? Nwoye lara ụlọ mgbe ọ gafechara ụlọ ụka ahụ ugboro ugboro.

O were ndị Mbanta niile anya na chi ha na ndị nna ha ochie nwere ogologo ntachị obi. N’ihi ya, ha na-ama ama hapụ onye ọ bụla na-ada iwu ha ka ọ na-eme nke a. Ma ọ bụladị n’ihe dị otu a, ha na-enye izu ahịa asaa ma ọ bụ iri abalị abụọ na asatọ dị ka mgbe ha na-enwerube ndidi. Oge a gachaa, ha anaghị ahapụ onye dị otu a ka ọ laa n’efu.

Ya mere, mmadụ dum nọ n’obodo jiri nọrọ na nche ịmata ihe ga-emenu ka izu asaa bịara kemgbe ndị oziọma ahụ rụchara ụlọ ụka ha n’ajọ ọhịa. Ndị obodo kwenyesiri ike n’ihe ojọọ ahụ ga-adakwasị ndị a. Ya mere, otu ma ọ bụ mmadụ abụọ ndị ahụ chegharịrị echegharị jiri kwụsịgodu irubere okpukpe ọhụrụ a isi.

N’ikpeazụ, ụbọchị ahụ a turu anya na ndị oziọma ga-anwụsị bịara. Ma, ha niile dịrị ndụ, na-arụkwara Mazị Kiaga, onye nkuzi ha, ụlọ aja ọhụrụ. N’izu ụka ahụ, ha nwetara ụfọdụ ndị ọhụrụ ndị batara n’ọgbakọ ha. Nke a bụkwa mbụ ha nwere otu nwanyị. Aha ya bụ Nneka, nwunye Amadị, nke bụ onye ọrụ ubi a maara aha ya. Ọ dịịrị ime.

Nneka atụọla ntụ ime anọ. Nke ọ bụla n’ime ha ka ọ mụrụ ejima bụkwa ndị a tụfuru  otu mgbe ahụkwa. Di ya na ndị ezinaụlọ ya ebidolarị katọwa ụdịrị nwanyị ọ bụ, n’ihi ya, o wuteghị ha mgbe ha chọpụtara na ọ gbakwurula ndị ụka a. Ọ bụụrụ ha ezigbo ihe ibupụ ibu arụ.

Otu ụtụtụ, Amikwu, nwa nwanne Okonkwọ siri n’akụkụ ụlọ ụka ahụ alọta n’obodo didebere ha mgbe ọ hụrụ Nwoye ka ya na ndị ụka ahụ nọ.

Ọ tụrụ ya n’anya nke ukwu, mgbe o laruru ụlọ, ọ gara n’ụlọ Okonkwọ kọọrọ ya ihe ọ hụrụ. Ụmụ nwanyị bidoro kwugharịwa okwu ma Okonkwọ emegharịghị ahụ.

Nwoye lọtara n’ime ehihie. Ọ banyere n’ime obi, kelee nna ya, ma na o gheghi ya ọnụ. Nwoye tụgharịrị ka ọ banye n’ime ezi mgbe nna ya jiiri iwe jupụtara ya obi na mberede, malie elu wee jide ya n’olu.

“E bee ka ị gara?”, ka ọ sụrụ na nsụ.

Nwoye gbalịrị ka ọ zụpụta onwe ya site na ntachi akpịrị ahụ.

Okonkwọ gbọrọ ya ụja sị: “Zaa m ihe m jụrụ gị tupu ma anyagbuo gị!”. Ọ tụtụụrụ otu mkpirisi osisi dị arụ nke tọgbọrọ n’elu obere ahụ aja wee pịa ya ihe ugboro atọ chara ọkụ.

Ọ gbọrọ ya ụja ọzọ sị: “Zaa ihe m jurụ gị !”

Nwoye kwụ ebe ahụ na-ele ya anya, na-ekwughị ihe ọ bụla. Ndi nwunye ya nọ n’ezi na-eti mkpu, egwu ekweghị ha baa ime ụlọ.

Otu olu siri na mpụta ezi sị ya: “Hapụ nwa ahụ aka ngwa ngwa! Ara, ọ na-acha gị?”

Ọ bụ Uchendụ, nwanne nne Okonkwọ.

Okonkwọ ekwughị ihe ọ bụla, ma ọ hapụru Nwoye o wee pụọ na-alọtaghị ọzọ.

Ọ laghachiri azụ n’ụlọ ụka ahụ wee gwa Mazị Kiaga na ya ekpebiela iga Ụmụọfịa bụ ebe ndị bekee ndị oziọma rụrụla ụlọ akwụkwọ iji kuziere ndị otu kristi a na-etota etota otu e si agụ na otu e si ede.

Obi bụsọ Mazị Kiaga aṅụrị. O wee sị: “Ngọzị na-adịrị onye ahụ nke na-ajụ nne na nna ya n’ihi m. Ndị ahụ na-anụrị okwu m bụ nne na nna m.”

Nwoye aghọtaghị ihe o kwuru. Ma, na obi dị ya ụtọ ihapụ nna ya. Ọ ga-alọkwute nne ya na ụmụnne ya n’ọdịnihu iduba ha n’okpukpe ọhụrụ ahụ.

Okonkwọ chere echiche banyere ihe a mgbe ọ nọ n’ime ụlọ ya n’abalị ahụ, na-ele anya n’ọkụ ọ mụnyere. Oke iwe batara ya n’obi otu ihu ahụ, ọ di ya ka ya buru mma ya, gaa n’ụlọ ụka ahụ wee kpochapụ ndị omekaome ahụ. Ma mgbe o chere echiche ọzo, ọ gwara onwe ya na Nwoye abụghị onye a na-alụrụ ọgụ. O bere akwa n’ime obi ya jụwa ihe kpatara a ga-eji bụọ ya bụ Okonkwọ ọnụ site n’inye ya ụdịrị ọkpara dị otu ahụ. O doro ya anya nke ọma na ọ bụ aka ọrụ chi ya. Ma ọ bụghị otu ahụ, kedu otu ọzọ ọ ga-esi akọwa oke ihe ọjọọ ahụ dakwasịrị ya, mgbapụ nke ọ gbapụrụ n’obodo ya, nakwa ugbu a, agwa ọjọọ a nwa ya na-akpa. Ugbu a o nwere ohere iche ihe banyere ya, arụ ọkpara ya mere ebuka.

Na mmadụ hapụrụ chi nna ya ha gaa soro ụmụ nwoke ndi umengwụ na-akpagharị ka ọkụkọ bụ ihe arụ kacha ibe ya. Gịnị ga-eme ma a sị na ya nwụọ ụmụ ya ndị nwoke ndị ọzọ ekpebie isoro ụkpụrụ Nwoye wee chefuọ ndị nna ha ochie? Akpata oyi wụrụ Okonkwọ n’ahụ n’udi echiche dị otu a, echiche mkpochapụ. Ọ hụrụ onwe ya na ndị nna ya ha ebe ha gbakọrọ n’ihu arụsị ha na-eche n’efu ka ha chụorọ ha aja ma kpọọkwa isi ala nye ha, naanị ihe ha hụrụ bụ ntụ nke ụbọchị ndị garala aga, n’otu mgbe ahụkwa, ọ hụrụ ụmụ ya ka ha na-ekpere chi nwa bekee ahụ. A sị na ụdirị ihe ahụ ga-eme eme, ọ ga-ekpochapụ ha dum n’elu ụwa a.

Aha a na-akpọkarị Okonkwọ bụ ‘ọkụ na-agba ọzara’. Ka ọ na-ele ọkụ ahụ ọ mụnyere anya, ka o chetara aha ahụ. Ọ bụ ire ọkụ. Kedukwanụ ka ọ ga-esi amụta dịọkpara umengwu dị ka Nwoye? E leghị anya, ọ bụghị ọkpara ya. Mba! O nweghị ike ibụ. Ọ ga-abụ na nwunye ya gwuru ya wayo. Ọ ga-egosị ya. Ma, Nwoye yiri nna ya ochie Ụnọka, bụ nna okonkwọ. Ya nwa bụ Okonkwọ bụ ọkụ na-agba ọzara. Kedu otu ọ ga-esi amụta nwanyị sị na ọ bụ ọkpara ya?” Mgbe Okonkwọ dị n’ọgbọ Nwoye, a marala ya rị amara n’Ụmụọfịa niile site na mgba ya nakwa atụghị egwu ya.

Ọ mara nnukwu ọsụ. Okụ ahụ makwara ọsụ dị ka a ga-asị na ọ na-emere ya ebere. Otu mgbe ahụ, anya Okonkwọ meghere, o wee huzie ihe dum nke ọma. Okụ dị ndu na-amụta ntụ jụrụ oji nke na-enweghị ike ọ bụla. Ọ mara ọsụ ọzọ.

 

 

IGBO AMAKA

ỤLỌAKWỤKWỌ IGBO

MỤTA IGBO

CULTURAL DANCE

MASQUERADE

EGWU DI YA

EDEMEDE IGBO

ONYE NKUZI IGBO

OLU ỤMỤ IGBO

IGBO MADE EASY

Learn In Igbo in 1 day

Learn In Igbo

Copyright � 2018-2020. Mother Tongue Academy. All Rights Reserved.We can be  reached  by Phone at (516) 442-9191  or by our Website  Contact  E-mail