Login and Register

Log in  \/ 
x
x
Register  \/ 
x

Home

Chap18-Isi Iri Na Asatọ

ISI NKE IRI NA ASATỌ

 

Ụlọ ụka ọhụrụ ahụ dị na Mbanta nwere nsogbu ole na ole n’isi mbido. Na mbụ, ndị obodo nwere olile anya na ọ gaghị adịgịde. Ma, ọ gara n’ihu wee digide ma jirikwa nwayọ na-esiwanye ike. Ihe a wutere ndị obodo, ma o weteghị ha nke ukwu. O bụrụ na ndị otu efulefu ekpebie ibi n’Ajọ Ọhịa, nke ahụ bụ okwu aka ha. Ọ bụrụ na e chezie ya nke ọma, Ajọ Ọhịa bụ ebe kwesiri ndị a a jụrụ ajụ. Ọ bụ eziokwu na ha na-azọpụta ụmụ ejima site n’ime ọhịa, ma ha akakpọbatabeghị ha n’ime obodo. N’uche ndị obodo, ejima ndị ahụ ka nọkwa ebe ahụ e tufuru ha. N’ezie, Ala agaghị eji mmehie nke ndị oziọma ndị a bịa leta ndị obodo na-adịghị ihe ha mere.

N’otu mgbe, ndị oziọma ahụ chọrọ imebiga ihe oke. Mmadụ atọ ndị ahụ chegharịrịlanu gara n’ime obodo na-anya isi ‘hoo haa’ na-asị na agbara ndị obodo niile nwụrụ anwụ, na ha enweghị ike ọ bụla, n’ihi ya na ha dị njikere imerụ ha site n’ịgba ụlọ ha niile ọkụ.

Otu onye isi nchụ aja gwara ha sị: “Gaanụ kpọọ ike nne unu ọkụ.” Ha jidere ndị ahụ kụọ ha ihe wee ruo mgbe ọbara gbapụtara ha n’ahụ. Mgbe nke a mechara, ọ dịghịkwa ihe ọzọ mere n’etiti ndị ụka a na ndị obodo wee ruo ogologo oge.

Ma akụkọ ebidolarị rịwa elu na nwa bekee ewetala usoro okpukpe nakwa usoro ọchịchị ọhurụ.

A sịrị na ha arụọla ụlọ ikpe n’Ụmụọfịa iji chedo ndị na-eso ụzọ okpukpe ọhụrụ ahụ. A sịkwa na ha akwụgbuolarị otu nwoke bụ onye gburu otu onye oziọma.

N’agbanyeghị na a na-akọ akụkọ ndị a ugboro ugboro, ha yiri akụkọ ifo na Mbanta n’ihi na ha emefụtabeghị mmekọrịta ụlọ ụka ohụrụ a na ndị obodo. Ọ dịghị ihe ga-ebute igbu onye oziọma ebe a n’ihi na n’agbenyeghị ara na-acha Mazị Kiaga, ọ naghị enye nsogbu ọ bụla. N’ebe ndị otu ya nọ, ọ dịghị onye ọ bụla ga-egbu ha ghara ịgbapụ n’obodo, n’ihi na n’agbanyeghị na ọ dịghị uru ha bara, ha ka bụkwa ndị obodo ahụ. Ya mere, ọ dịghị onye chere ezi echiche banyere ọchịchị nwa bekee ahụ ma ọ bụ ihe na-eso ogbugbu ndị otu Kristi ahụ. Ọ bụrụ na ha enyewe nsogbu karịa otu ha na-eme ugbu a, ihe a ga-eme bụ ịchụpụ ha n’obodo.

Na mgbe ahụkwa, obere ụlọ ụka ahụ nwere ọtụtụ nsogbu chere ya n’ihu karịa iga chọwa ndị obodo okwu. Nke a bidoro site n’okwu banyere ịnabata ndị osu n’ụlọ ụka ha.

Mgbe ndị osu ndị a hụrụ na usoro okpukpe ọhụrụ ahụ nabatara ụmụ ejima na ihe arụ ndị dị otu a, ha chere na o nwekwara ike ịnabata ha. Ya mere, otu ụbọchị ụka, mmadụ abụọ n’ime ha gara n’ụlọ ụka ahụ. E bidoro mewe mkpọtụ otu ihu ahụ, ma na okpukpe ọhụrụ ahụ arụọla oke ọrụ n’ebe ndị ahụ nabatarala ya nọ, ya mere na ha apụghị n’ụlọ ụka ahụ otu ihu ahụ ndị osu ahụ batara. Ndị ha nọdebere nso hapụrụ oche ha gaa nọrọ n’ọzọ. Ọ bụụrụ ihe iriba ama. Ma, nke nọgidere ruo naanị mgbe ha gbasara ụka. Ndị ụka niile mere mkpesa gbasara ya ma chọwakwa ịchụpụ ndị ahụ, naanị mgbe Mazị Kiaga gbochuru ha, o bidoro kọwara ha sị: “N,ihu Chukwu, enweghị onye ohu ma ọ bụ nwadiala. Anyị niile bụ ụmụ Chineke, ya mere anyị ga-anabata ndị a dị ka ụmụnna anyị.”

Otu n’ime ndị ọhụrụ ahụ sịrị ya: “Ị mataghị ihe na-emenụ. Kedu ihe ndị ọgọ mmuọ ga-ekwu ma ha nụ na anyị nabatara ndị osu n’etiti anyị. Ha ga-achị anyị ọchị.”

Mazị Kiaga zara ya sị: “Hapụ ha ka ha chịwa. Chineke ga-achị ha ọchị n’ubọchị ikpe. Kedu ihe ụwa ga-eji wee iwe, ndị mmadụ enwee ọchịchọ ihe efu? Onye ahụ bi n’elu igwe ga-achị ha ọchị. Chukwu ga-eji ha mee ihe ọchị.”

Onye ahụ gara n’ihu sị ya: “Ị ghọtaghị. Ị bụ onye nkuzi anyị, ị nwekwara ike ikuziri anyị ihe banyere okwukwe ohụrụ a. Ma, ihe nke a bụ ihe anyị maara nke ọma.” Ọ kọwaara ya ihe osu bụ.

Osu bụ onye e nyere agbara, ihe e mefurụ emefu, ihe a na-asọ asọ ruo ebighị ebi, ya na umụ ụmụ ya. Nwadịala enweghị ike ịlụ ya, ọ gaghịkwa alụ nwadịala. N’ezie, ọ bụ onye a chupurụ achụpụ, ọ na-ebi n’akụkụ obodo nọdebere ihu oke arụsụ ahụ.

Osu enweghị ike ịbịa nzukọ ndị amaala, ndị amaala n’onwe ha enweghị  ike ịba n’ụlọ ya. O nweghị ike ichi echichi ọ bụla n’ime echichi anọ nke ndị obodo,  mgbe  ọ nwụrụ, ndị otu ya na-eli ya n’Ajọ Ọhịa. Kedu ka onye dị otu a ga-esi bụrụ onye na-eso ụzọ Kristi?”

Mazị Kiaga sịrị ya: “Ya onwe ya chọrọ Kristi karịa mụ na gị.”

Onye ahụ sịrị: “Mgbe ahụ, aga m alaghachị n’obodo.”

O wee laa.

 Mazị Kiaga guzosiri ike n’ihe o kwuru. O bụkwa ngosi ike ya a zọrọ ụlọ ụka ọhụrụ ahụ. Ndị ahụ chegharịrị ọhụrụ nwetara oke mgbado ume na ntụkwasị obi site n’okwukwe ya a. Ọ gwara ndị osu ahụ ka ha kpụchapụ isi dada ha. Na mbụ, ha tụrụ egwu na ha nwere ike ịnwụ ma ha mee otu ahụ.

Mazị Kiaga gwara ha sị: “Agaghị m anabata unu n’ụlọ ụka a ma ọ bụrụ na unu akpụchapụghị ihe ịrịba ama ọgụgọ mmuo unu. Unu na-atụ egwu na unu ga-anwụ. Gịnị kpatara nke ahụ ga-eji mee? O leghị ihe dị iche n’ime unu na ndị ọzọ na abọcha isi ha? Otu Chukwu ahụ kere unu na ha. Ma, ha chụpụrụ unu dị ka ndị ekpenta. O megidere iwu Chineke bụ onye kwere ndi niile kwenyere n’aha nsọ ya nkwa ndụ ebighị ebi. Ha sịkwara na m ga-anwụ ma ọ bụrụ na m wuo ụlọ ụka m n’ala a. A nwụọla m? Ha sịrị na m ga-anwụ ma ọ bụrụ na m lekọta ụmụ ejima anya. Aka nọkwa m ndụ. Ndị ọgọ mmụọ a na-agha naanị ụgha. Naanị okwu Chi anyị bụ eziokwu.”

            Mmadụ abụọ ndị osu ahụ kpụchara isi ha, na mgbe na-adịghị anya, ha soro bụrụ ndị kachasị kwenyesie ike n’ụka ohụrụ ahụ. Ka ihe siri dịwanye, ọtụtụ n’ime osu ndị ọzọ soro nzọ ụkwụ mmadụ abụọ ndị a. Ka ihe sịrị kwụrụ, otu onye n’ime ha, site n’ịnụ ọkụ n’obi ya, tinyere ụlọ ụka ahụ na ndị obodo n’oke ọgbaghara site n’igbu eke ahụ ndị obodo na-asọ nsọ bụ nke na-anọchi anya agbara mmiri ha.

Eke ahụ dị ebube bụ anụ ndị Mbanta na ndị agbata obi ha niile naara akwanyekarị ugwu. Ha naara akpọ ya ‘nna anyị’ ma na-enyekaawa ya ohere iga ebe ọ bụla ọ chọrọ, ọ bụladị n’elu akwa ndị mmadụ. Ọ na-egbu oke n’ime ụlọ ha; mgbe ụfọdụ ọ nakwa elo akwa ọkụkọ. Ọ bụrụ na nwadịla egbuo eke dị otu a na-amaghị ama, ọ ga-achụ aja iji kwaa ala, ọ ga-emekwa emume akwam ozu dị ka nke a na-emere oke mmadụ. Ọ dịghị ntaram ahụhụ e kwuputara maka onye kpachara anya gbuo eke ahụ, n’ihi na ọ dịghị onye chere na ihe dị otu ahụ nwere ike ime.

E leghị anya o mebeghị mbụ. Otu a ka ndị obodo siri hụ ya na mbụ. Ọ dịghị onye hụrụ mgbe nwoke ahụ mere ya. Ọ bụ ndị oziọma ahụ bidoro akụkọ a n’onwe ha.

Ma, ka o sina dị, ndị isi na ndị ndu Mbanta zukọtara ikpebi ihe ha ga-eme. Ọtutụ n’ime ha jiri iwe kwuo okwu ogologo oge. Mmuọ ịga agha batara ha n’ahụ. Okonkwọ bụ onye bidorola nwewe agba n’ikwunne ya sịrị na naanị mgbe udo ga-adị n’obodo bụ mgbe ha jiri apịpịa chụsịa ndị omekaome ahụ n’obodo ha.

Ma o nwere ọtụtụ ndị sitere n’ụzọ ọzọ leba okwu ahụ anya, ọ bụkwa ndụmọdụ ha ka ndị obodo were n’ikpeazụ.

Otu n’ime ha sịrị: “Ọ bụghị omenala anyị ịlụrụ agbara anyị ọgụ. Ka ọ ghara ịdị ka anyị na-eme otu ahụ ugbu a. Ọ bụrụ na mmadụ egbuo eke ahụ na nzuzo n’ime ụlọ ya, nke ahụ bụ okwu dịịrị ya na agbara ahụ. Anyị ahụghị ya. Ọ bụrụ na anyị anọchie n’etiti agbara a na onye ahụ dara iwu ya, anyị nwere ike ịnata ntaramahụhụ nke ọ kwadooro onye ahụ. Ọ bụrụ na mmadụ ekwuhie ọnụ, gịnị ka anyị ga-eme? Anyị ga-aga kpuchie ya ọnụ? Anyị ga-ekpuchi aka anyi na ntị anyị ka anyị ghara inụ ihe ọ na-ekwu. Nke a bụ ihe kwesiri omume.”

Okonkwọ sịrị ha: “Ka anyị ghara iche echiche ka ndị na-atụ egwu. Ọ bụrụ na mmadụ abịa n’ụlọ m nyụọ nsị, gịnị ka m ga-eme? Aga m emechi anya m? Mba!, Aga m ewere osisi kụwaa ya isi. Ihe a ka nwoke na-eme. Ndị a na-ete anyị unyi n’ahụ kwa ụbọchị. Okeke nọrọ ebe a na-asị na anyị ga-eme ka anyị anaghị ahụ ya.” Okonkwọ mere ụzụ iji gosi na ihe ahụ amasịghị ya. O chere n’obi ya sị na ebe a bụ obodo ụmụ nwanyị. Ụdịrị ihe a enweghị ike ime n’ala nna ya, Ụmụọfịa.

Otu nwoke ọzọ gwara ha sị: “Okonkwọ ekwuola eziokwu. Anyị ga-emerirị ihe. Anyị ga-ekewapụ ndị a n’ala anyị. Mgbe ahụ, ọ dịghị onye ga-ejide anyị maka ihe arụ a ha mere. Onye ọ bụla nọ n’ọgbakọ ahụ kwuru okwu. N’ikpeazụ, ha kpebiri na ha ga-ekewapụ ndị ụka ahụ. Okonkwọ tara ikikere eze ya iji gosi iwe ya.

N’abalị ahụ, onye ọkụekwe gara gburu gburu Mbanta dum ịgwa ndị mmadụ na bido mgbe ahụ na ha ekewapụla ndị niile kwenyere ndị oziọma ahụ site na ndụ nakwa ihe oma niile nke ndị obodo.

Ugbu a, ndị oziọma ahụ ebuwanyela ibu n’ọnụ ọgụgụ, ha aghọkwaala nwa obere obodo nke ndi nwoke, ndị nwanyị na ụmụaka bụ ndị nwere nchekwube na olile anya, bi. Mazị Brown bụ onye oziọma nwa bekee, naara abịa eleta ha mgbe dum. Ọ gwara ha sị: “Mgbe m chetara na ọ bụ naanị ọnwa iri na asatọ gara aga ka a kụrụ mkpụrụ oziọma mbụ a n’etitii unu, ọ na-agba m gharịị bụ ọrụ ebube Chineke rụrụla.

Ọ bụ n’ụbọchị nke atọ n’ime izu ụka ahụ dị nsọ ka Mazị Kiaga gwarala ụmụ nwanyị ka ha weta aja uhie, nzụ na mmiri iji dozie ụlọ ụka ahụ maka ncheta ibilite n’ọnwụ Kristi, ụmụ nwanyị ahụ ekeela onwe ha ụzọ atọ ime nke a. Ha biliri n’isi ụtụtụ ahụ, ụfọdụ n’ime ha bu ite ha chuwe n’iyi, ụfọdụ ji ọgụ na nkata ha gawa n’ebe ndị obodo na-akọta aja uhie, ndị ọzọ gawara n’ebe ha na-egwute nzụ.

Mazị Kiaga naara ekpe ekpere n’ime ụlọ ụka ahụ mgbe ọ nụrụ ụmụ nwanyị ahụ ka ha naara ekwusi okwu ike. O kpechara ekpere ya wee gawa ịmata ihe na-emenụ. Ụmụ nwanyị ahụ buuru ite nke mmiri na-adịghị n’ime ha lọta n’ụlọ ụka ahụ. Ha sịrị na ụfọdụ ụmụ okorobịa jiri ụtalị chụlaga ha n’iyi ahụ.

Mgbe nwa obere oge gachara, ndị ahụ gara ịkọta aja uhie bukwaara nkata ha n’efu lọta. Ụfọdụ n’ime ha ka a pịara ihe nke ukwu. Ndị ahụ gara igwuta nzụ lọtakwara wee kọọ otu akụkọ ahụkwa.

            Mazị Kiaga, bụ onye iwe juputara obi, jụrụ ha sị: “ Gịnị ka ihe ndị a niile putara?”

Otu n’ime ụmụ nwanyị ahụ gwara ya sị: “Ndị obodo ekewapụla anyị. Onye okụekwe ahụ kwuru ya n’abalị ụnyaahụ. Ma, ọ bụghị omenala anyị igbochu onye ọ bụla ichu ịyị ma ọ bụ iga ebe ahụ a na-egwuta nzụ.”

Otu nwanyị ọzọ kwuru sị: “Ha chọrọ igbusi anyị. Ha ekwuola sị na ha agaghị ekwe anyị gaa ahia.”

Mazị Kiaga naara achọ izipu ozi n’ime obodo ka a kpọọrọ ya ndị otu ya ndị nwoke mgbe ọ hụrụ ha ka ha naara abịa na nke onwe ha. Ha anụlarị ihe ọkụekwe ahụ kwuru ma ha anụbeghị na ndụ ha, na ndị ahụ na e gbochuru ụmụ nwanyị ichu n’iyi.

Ha gwara ndị nwanyị ha sị: “Bịanụ, anyị na unu ga-eso gaa zute ndị ụjọ ahụ.” Ụfọdụ n’ime ha jicha mkpaka buru ibu, ndị ọzọ ji mma ha.

Mazị Kiaga gbochiri ha iga. Ọ chọrọ iburu ụzọ mata ihe mere e jiri kewapụ ha n’obodo.

Otu nwoke sịrị ya: “Ha sị na Okolie gburu eke ahụ ha na-asọ nsọ.”

Onye ọzọ kwuru sị: “Nke a bụ okwu asị. Okolie gwara m na ọ bụ asị.”

Okolie anọghị ebe ahụ ịzara ọnụ ya. Ọ dara n’ọrịa n’abalị gara aga, tupu chi abọọ, ọ nwụọla. Ọnwụ ya ziputara na ụmụ agbara ka nwere ike ịlụ ọgụ dịirị ha. Ya mere, ndị obodo enwekwaghị ihe a ga-ekwe maka ya kparịwa ndị oziọma ahụ.       

 

 

IGBO AMAKA

ỤLỌAKWỤKWỌ IGBO

MỤTA IGBO

CULTURAL DANCE

MASQUERADE

EGWU DI YA

EDEMEDE IGBO

ONYE NKUZI IGBO

OLU ỤMỤ IGBO

IGBO MADE EASY

Learn In Igbo in 1 day

Learn In Igbo

Copyright � 2018-2020. Mother Tongue Academy. All Rights Reserved.We can be  reached  by Phone at (516) 442-9191  or by our Website  Contact  E-mail