Login and Register

Log in  \/ 
x
x
Register  \/ 
x

Home

Chap22-Isi Iri Abụọ Na Abọụ

ISI NKE IRI ABỤỌ NA ABỤỌ

 

Onye nọchiri anya Mazị Brọwn bụ Ụkọchukwu James Smith bụkwa onye omume ya pụrụ iche. Ọ katọrọ hoo haa usoro Mazị Brọwn jiri anabata ma kwenyekwara n’ihe ụfọdụ ndị obodo na-eme. Ọ hụrụ ihe dum dị ka ịdị ọcha na ịdị oji. Ihe dị oji bụ ihe arụ. Ọ hụrụ ụwa a dị ka ọgbọ agha ebe ụmụ nke ihe na ụmụ nke ọchịchịrị na-egburịta onwe ha. N’ịgbasa oziọma ya, ọ naara ekwu ihe gbasara ewu na atụrụ, ọka na ata. O kwenyere n’ikpochapụ ndị amụma Baal.

O wutere ya nke ukwu na ọtụtụ n’ime ndị otu ya amaghị ihe dị ka atọ n’ime otu-Chineke nna, Chineke Ọkpara, Chineke mmụọ nsọ, nakwa oriri nsọ. Nke a zipụtara naanị na ha bụ mkpụrụ ndị ahụ a kụrụ n’ala nkume. Ọ dịghị ihe ọ bụla ọzọ Mazị Brọwn bu n’obi na-abụghị ọnụ ọgụgụ. Ọ gaara amata na alaeze eluigwe agbanyeghị n’igwe mmadụ. Onye nwe anyị n’onwe ya kọwara mkpa ọ dị ịdị naanị ole na ole. Wara wara ka ụzọ ahụ dị, ole na ole ka ọnụ ọgụgụ ha dị kwa. Iji ndị na-ekpere arụsị, ndị na-achọ naanị ihe iriba ama kpojuo n’ụlọ ukwu Chukwu bụ ime ihe nzuzu nke na-adị ruo ebighị ebi. Onye nwe anyị jiri apịpịa ya naanị otu mgbe na ndụ ya - iji chụpụ igwe mmadụ ahụ n’ụlọ ụka ya.

N’ime izuuka ole na ole ọ biara n’Ụmụọfịa, Mazị Smith kwụsịrị otu nwanyị ịbịa ụlọ ụka n’ihi na ọ naara awụnye mmanya ọhụrụ n’ime akarama ochie. Nwanyị a kwere ka di ya, onye ọgọ mmụọ, bọkasịa nwa ya nwụrụ anwụ. Ha sịrị na nwa ahụ bụ ọgbanje nke naara ata nne ya ahụhụ site n’ịnwụ nakwa ịbanye n’afọ ya ka ọ mụọ ya ọzọ. Ugboro anọ ka nwa a putarala ụwa. Ya mere, ha jiri bọkasịa ya ka ọ ghara ịlọghachi.

Iwe were Mazị Smith nke ukwu mgbe ọ nụrụ ya. O kweghị n’akụkọ ahụ nke ọ bụladị ndị ahụ kwenyesiri ike n’otu ya, siri na ọ bụ eziokwu, akụkọ ụmụaka ọchọnganoko bụ ndị mbọkasị ahụ anaghị adọghachi azụ, ha ewee buru apa ndị ahụ puta ụwa  ọzọ. Ọ zara ha sị na ọ bụ ekwensu gbasara akụkọ ndị ahụ iji duhie ndị mmadụ n’ụwa a. Ndị kwenyere n’ụdị akụkọ ndị a ekwesighị ịnọ n’ọgbakọ Chukwu.

Ndị Ụmụọfịa na-ekwu sị na ka onye si agba egwu bu ka e si akụrụ ya nkwa. Mazị Smith jiiri iwe zọọ ụkwụ egwu, ara wee gbapụ ndị na-akụ nkwa. Ndị ahụ nchegharị ha naara agba ha ara, bụkwa ndị dajụrụ n’aka mgbochu Mazị Brọwn, nwezi ohere ime otu o si masi ha n’uju ugbu a. Otu n’ime ha bụ Enọkụ, diọkpara onyeisi eke agbara ahụ, bụkwa onye e kwetara na ọ bụ ya gburu ma riekwa eke agbara ahụ. Ka Enọkụ siri buru usoro okpukpe ohụrụ a n’obi dị ka ọ karịrị nke Mazị Brọwn nke mere ka ndị obodo kpọọ ya ‘mbịara mbịa bekara ndị nwe ozu n’akwa’.

Enọkụ dị mkpụmkpụ, ọ na-aga ije dị ka a ga-asị na ọ dị ya ngwa ngwa mgbe dum. Ụkwụ ya dị mkpụ mkpụ ma saakwa mbara. Ọ pịara ụkwụ, n’ihi ya, o guzoro ọtọ, ma ọ bụ gawa ije, ikpere ya na-akụkọta ọnụ, ụkwụ ya abụọ ewe dị ka ha sere okwu, nke ọ bụla na-achọ igawara nke ya. Otu a ka ike jiri jupụta n’obere ahụ Enọkụ nke mere na mgbe dum na-abụ ya esemokwu na ọgụ kwa ụbọchị ụka ọ bụla, ọ na-adị ya ka e kwuo okwu Chukwu megide ndị  iro ya. Ọ burụ na ọ nọdebere otu n’ime ha, ọ ga na-ele ya anya ugboro ugboro dị ka ọ ga-asị ya, ‘agwara m gị otu ahụ’. Ọ bụ Enọkụ kpasuru ọgbaghara ahụ nke na-erugharị n’etiti ndị ụka na ndị Ụmụọfịa kemgbe Mazị Brọwn lara. Nke a mere n’oge ememme ahụ ndị obodo na-eme  kwa afọ iji kwanyere Ala ugwu. N’oge dị otu a ka ndị nna ha ochie ndị e lirila n’ala n’ọnwụ ha naara esite n’ọnụ ahụhụ apụta ozọ dị ka egwugwu.

Otu arụ kachasị ibe ya mmadụ nwere ike ime bụ ikpughe egwugwu ihu ya n’ihu oha, ma ọ bụ ikwu ma ọ bụ mee ihe ọ bụla nke ga- ewetu ugwu anwụghị anwụ egwugwu ndị a n'anya ndị na-echighị echichi. Ihe a ka Enọkụ mere.

Emume afọ a e ji ekpere Ala danyere ụbọchị ụka, ọtụtụ mmọnwụ nakwa akpagharị. Ụmụ nwanyị ndị gara ụka ụbọchị ahụ enweghị ike ịla ụlọ ha. Ụfọdụ n’ime ha ndị nwoke ha gara rịọ egwugwu ndị ahụ ka ha pụtụ obere ka ụmụ nwanyị ndị ahụ wee gafee. Ha kwetara ma nọrọkwa n’ụzọ ụla mgbe Enọkụ turu ọnụ sị na ha agaghị anwa anwa bitu onye otu Kristi aka. Ha dum laghachiri azụ mgbe ha nụrụ nke a. Otu n’ime ha piara Enọkụ ezigbo ụtalị ahụ ọ na-eji mgbe dum. Enọkụ dakwasịrị ya n’elu wee dọkaa mmọnwụ ya. Ngwa ngwa ahụ, egwugwu ndị ọzọ gbara onye otu ha ahụ e merụrụla emerụ gburu gburu iji kpuchie ya n’anya ndị nwanyị na umụaka, wee dulaa ya. Enọkụ egbuola otu n’ime mmuọ ndị nna ya ochie, ọgbaraghara wee jupụta n’Ụmụọfịa.

N’abalị ahụ, nne ụmụ mmụọ ndị ahụ gara gburu gburu obodo ha dum na-ebere nwa ya ahụ e gburu egbu akwa. Oke egwu tụrụ n’abalị ahụ. Ọ bụladị onye ahụ mekarịchara okenye n’Ụmụọfịa anụbeghị ụdịrị akwa ahụ pụrụ iche ma na-atụkwa egwu, a gaghịkwa anụ ụdịrị akwa ahụ ọzọ. Ọ dị ka a ga-asị na mkpụrụ obi nke obodo ahụ bere akwa maka oke ihe egwu nke naara abịa - ọnwụ ya onwe ya.

N’echi ya, egwugwu Ụmụọfịa dum zukọtara n’ahia ha. Ha sitere n’ogbe dum dị n’obodo ha nakwa n’obodo ndị gbara ha gburu gburu bịa.

Ọtakagụ ahụ a na-atụ egwu sitere n’Imo bịa, Ekwensu bụ nke nya okeọkpa n’azụ ya sitere n’Uli bịa. Ihe a bụ ọgbakọ naara atụ egwu.

Ụzụ pụrụ iche nke mmọnwụ ndị a naghị agụta ọnụ naara eme, ụda ataṅụ ndị naara akụkọta ọnụ n’azụ ụfọdụ n’ime ha , nakwa ụda mma ha ka ha na-agbagharị na-ekele onwe ha, mere ka egwu tụọ mkpụrụ ọbi ọ bụla. Nke a bụ mbụ ha naara anụ ụdịrị mkpu ahụ n’ehihie na ndụ ha.

Site n’ahịa ahụ, mmọnwụ ndị a iwe juputara n’obi gawara na mbara ezi Enọkụ. Ụfọdụ ndị ndu nke obodo bụ ndị ji ọgwụ na ekike ndị ọzọ ha ji echedo onwe ha, sooro ha gaa. Ndị a bụ ndị aka siri ike n’ọgwụ. Umụ nwoke na ụmụ nwanyị ndị ọzọ nọrọ n’ụlọ ha na-ege ntị.

Ndị ndu ndị ụka ahụ zukọtara n’ụlọ Mazị Smith n’abalị ụnyahụ ya. Mgbe ha naara akparịta ụka ka ha nụrụ nne mmụọ ahụ ka ọ naara ebe akwa nwa ya. Akwa arịrị a metụtara Mazi Smith, nke mere ka ọ dị ka ọ tụrụ egwu nke mbụ.

Ọ jụrụ ha sị: “ Ọ bụ gịnị ka ha na-achọ ime?” Ọ dịghị onye maaranụ n’ihi na ụdị ihe a emebeghị mbụ. Mazị Smith gaara akpọ nwa D.C na ndị kọtọma ya, ma ha gara njem nleta n’ụnyahụ ya. Mazị Smith wee kwuo sị: “Otu ihe ka anyị maara nke ọma. Anyị agaghị alụsọ ha ọgụ. Ike anyị dị n’aka Chukwu.” Ha niile gbukọrọ ikpere n’ala wee rịọ Chineke ka ọ zọpụta ha.

Mazị Smith tiri mkpu sị: “ Chineke zọpụta ndị nke gị.”

Ndị ọzọ zara sị: “Ma gọziekwa ihe nrita  gị.”

Ha kpebiri na ha ga-ezo Enọkụ n’ụlọ Mazị Smith otu abalị ma ọ bụ abụọ. O wutere Enokụ n’onwe ya nke ukwuu mgbe ọ nurụ ya n’ihi na o chere na agha dị nsọ naara abịa; o nwekwa ndị ụka ole na ole ọzọ ndị nwere udị echiche ahụ. Ma ha zipụtara amamihe n’etiti ndị a nwere okwukwe, ya mere ha jiri zọputa ndụ ọtụtụ ndị mmadụ.

Ndị otu egwugwu ahụ gawara na mbara ezi Enọkụ di ka ọkụ na-agba ọzara wee jiri mma na ọkụ mebichaa ebe dum. Ha sitere n’ebe ahụ gawa n’ụlọ ụka ahụ ebe mmebi ihe naara egbu ha ka mmanya.

Mazị Smith nọ n’ulọ ụka ya mgbe ọ nụrụ mmọnwụ ndị ahụ ka ha na-abia. O jiri nwayọ gaa guzo n’ọnụ ụzọ nke esi abata n’ụlọ ụka ahụ. Ọ fọrọ ntakirị  ka ọ gbalaga mgbe egwugwu atọ ma ọbụ anọ mbụ bịarutere na mbara ụlọ ụka ahụ. Egwu purụ ya n’ahụ, karịa ịgbalaga, o sitere n’ọnụ uzọ ụlọ ụka  ahụ wee gakwuruwe mmọnwụ ndị ahụ na-abianụ.

Ha wabatara n’ike wee kwatucha osisi ogugu ahụ ndị uka  jiri gbaa ọka n’ụlo ụka ha.

Ataṅụ naara ada aghara aghara, mma kụkọtakwara onụ, ebe etum(uzuzu) nakwa mkpọtụ juputara ebe dum. Mazị Smith nụrụ ụda nzọ ụkwụ n’azụ ya. O tụgharịrị n’azụ ya wee hụ Okeke onye nkọwa okwu ya. Okeke na nna ya ukwu adịchaghị na mma kemgbe ahụ ọ katọchara akparamagwa ọjọọ Enọkụ ahu n’ime nzukọ ndị ndu ụka ahụ ha mere n’abalị. Okeke gara n’ihu kwuo sị na a gaghị ezo Enọkụ n’ime ụlọ Mazị Smith n’ihi na ọ ga-ebute naanị iwe na ọnụma ndị obodo n’ebe onye nkuzi ahụ nọ. Mazị Smith jiri olu ike bara ya mba, n’ihi ya, ọ chọghị ndụmọdụ ya n’ụtụtụ ahụ. Ma ugbu a, mgbe ọ bịakwutere ya, ha abụọ wee guzo n’ihu mmụo ndi iwe na-ewe, Mazị Smith lere ya anya wee chịa ọchị. Ọchị a erijughị afọ ma obi ọma jupụtara ya n’ahụ.

Na nwa mgbe nta, egwugwu ndị a laghachitụrụ azụ site n’otu mmadụ abụọ ndi a si kwuru otu ebe, bụ nke ha na-atụghị anya ya. Ma nke a anoteghị aka, ọ dị ka nwa obere ohere ahu na-adị tupu egbe igwe agbaa. Mwabanye nke abụọ ha a, karịrị nke mbụ ha. Ha nọchichara mmadụ abụọ ahụ. Mgbe ahụkwa ka olu ahụ a mara nke ọma lara elu n’ime mkpọtu niile ahụ ebe dum wee daa jụụ otu ihu ahụ. Ha nyere ohere n’etiti mmadụ abuọ ahụ, Ajohịa(AjọfIa) wee bido ikwu okwu.

Ajọfia bụ egwugwu nke na-edu ndị ọzọ n’Ụmụọfịa. Ọ bụ onye isi ma bụrụkwa onye nkwupụta okwu n’ime ndị nna ochie toolu ahụ bụ ndị na-ekpe ikpe n’obodo. A ma olu ya nke ọma, ya mere o jiri nwee ike ime ka udo dị otu ihu ahụ n’etiti mmụọ ndị ọzọ ahụ a kpasurula iwe. Ọ gwara Mazị Smith okwu, mgbe ọ naara ekwu okwu a, anwuru ọkụ siri ya n’isi na-apụta.

O jiri olu ndị mmụọ ji agwa ndị mmadụ okwu wee sị ya: “Ahụ nwa bekee, ekelee m gị.”

Ọ jụrụ sị: “Ahụ nwa bekee, ị ma onye mbụ?”

Mazị Smith lere onye nkọwa okwu ya anya, ma Okeke, bụ onye sitere n’Ụmụrụ nke tere anya, aghọtakwaghị ihe o kwuru.

Ajọfịa jiri olu ọjọọ ya ahụ chịa ọchị. Ọ sịrị: “Ha bụ ndị ọbịa, ha amaghị ihe a naakọ. Ma, anyị  ga-ahapụ nke ahụ.” Ọ tụgharịrị ebe ndị otu ya nọ wee kelee ha, kpọọkwa ha nna ndi Ụmụọfịa. Ọ sụnyere oji ya n’ala wee na- ayọgharị ya. Ọ tụgharịkwara ọzọ ebe nwa bekee na onye nkọwa okwu ya nọ.

Ọ gwara onye nkọwa okwu ahụ sị: “Gwa nwa bekee na anyị agaghị emerụ ya ahụ ọ bụla. Gwa ya ka ọ hapu anyị wee laghachi n’ụlọ ya. Ihe nwanne ya nwoke nke biiri ebe a na mbụ masịrị anyị nke ukwu. Ọ dara iberibe, ma na ihe ya masịrị anyị, n’ihi ya anyị agaghị emerụ nwanne ya nwoke ahụ. Ma anyị ga-emebi ụlọ arusị a ọ rụrụ. Anyị agaghị ahapụkwa ya ka ọ nọrọ n’ebe a ọzọ. O buterela anyị ihe arụ dị iche iche, n’ihi ya, anyị biara iwepụ ya.”  Ọ tụgharịrị ebe ndị otu ya nọ sị: “nna ndị Ụmụọfịa, ekelee m ụnụ.” Ha niile jikwara otu olu ahụ zaa ya. Ọ tugharịkwara ọzọ ebe nwa bekee nọ sị: “I nwere ike ibinyere anyị ma ọ bụrụ na otu anyị si ebi ndụ masịrị gị. I nwere ike na-efekwa chi gị. Ọ dị mma ka mmadụ na-efe chi na mmụọ ndi nna ya ochie ha. Laghachi azụ n’ụlọ gị ka anyị ghara imeru gị ahụ. Iwe anyị dị ukwuu,ma anyị melatara ya ka anyị wee nwee ike ikwuru gị okwu a.”

Mazị Smith gwara onye nkọwa okwu ya sị: “Gwa ha ka  ha si ebe a pụọ. Ihe a bụ ụlọ Chukwu, n’ihi ya, agaghị m anọ ndụ hu na ha meruru ya.”

Okeke jiri ụzọ akọ kọwara mmọnwụ na ndị Ụmụọfịa ndị ahu ihe ahụ. Nwa bekee sị na obi dị ya ụtọ otu unu siri bịa kọsara ya iwe unu, dị ka ndị enyi. Ọ ga-adị ya obi ụtọ ma ọ bụrụ na unu ahapụrụ ya okwu ahụ ka o kpezie.”

“Anyị agaghị ahapụrụ ya okwu a n’ihi na ọ maghị omenala anyị, di ka anyi onwe anyị amaghị nke ya. Anyị sịrị na ọ bụ onye nzuzu n’ihi na ọ maghị omenala anyị, e leghi anya, ọ sịkwa na anyị bụ ndị nzuzu n’ihi na anyị amaghị nke ya. Anyị chọrọ ka ọ pụọ ebe a.”

Mazị Smith guzosiri ike ebe ọ nọ, ma o nweghi ike izọputali ụlo ụka ya. Mgbe egwugwu ndị ahụ lara, ụla ụka aja uhie ahụ Mazị Brọwn rụrụ aghọọla okpụrụkpụ aja nakwa ntụ. Mgbe ahụkwa ka obi mmụọ ndị obodo jụụru.

 

 

IGBO AMAKA

ỤLỌAKWỤKWỌ IGBO

MỤTA IGBO

CULTURAL DANCE

MASQUERADE

EGWU DI YA

EDEMEDE IGBO

ONYE NKUZI IGBO

OLU ỤMỤ IGBO

IGBO MADE EASY

Learn In Igbo in 1 day

Learn In Igbo

Copyright � 2018-2020. Mother Tongue Academy. All Rights Reserved.We can be  reached  by Phone at (516) 442-9191  or by our Website  Contact  E-mail