Login and Register

Log in  \/ 
x
x
Register  \/ 
x

Home

Chapter25

 ISI NKE IRI ABỤỌ NA ISE

 

 

 

 

       Mgbe nwa DC duuru ndi agha jicha egbe nakwa ndi kọtoma bịarue n’ezinaụlọ Okonkwọ, ọ hụrụ ndi nwoke ole na ole ka jiri ike ọgwụgwụ nọrọ n’obi ya. O nyere ha iwu ka ha pụtachaa n’ezi, ha mere nke a na-ekwughị okwu ọ bụla.

      O sitere n’ọnụ ọkọwa okwu ya jụọ ha sị: ‘’Kedụ onye bụ Okonkwọ n’ime unu?’’ Obierika zara ya sị: ‘’Ọ nọghị ebe a.’’                                                                                                       ‘’Kedụ ebe ọ nọ?’’                                                                                                                        ''Ọ nọghị ebe a.’’                                                         Iwe were nwa DC, ihu ya wee chaa ọbara ọbara. Ọ dọrọ ha aka na ntị sị na ọ bụrụ na ha akpọpụtaghị Okonkwọ mgbe ahụ, na ya ga-akpọchi ha dum n’ụlọ mkpọrọ. Ha tamuritara n’onwe ha, Obierika wee sịkwa.                                                                                          ‘’Anyị nwere ike ịkpọga gị ebe ọ nọ, ma e leghị anya ndi otu gị ga-enyere anyị aka.’’                      

       Nwa D.C. aghọtaghị ihe okwu ahụ Obierika gwara ya, ‘’E leghị anya ndi otu gị ga-enyere anyị aka,’’pụtara. O chere sị na otu n’ime ihe na-akpasukarị mmadụ iwe n’akparamagwa ndi obodo a bụ otu ha si agwa mmadụ okwu.                                                                                              Obierika na mmadụ isii ndi ọzọ butere ụzọ. Nwa DC na ndi otu ya bụ ndi dozicharala egbe ha, sooro ha n’azụ. Ọ gwalarị Obierika na ọ bụrụ na ya na ndi otu ya na-aghọ ha aghụghọ, na ha ga-agbagbu ha. Ha wee gawa.  Ntakịrị ọhịa dị n’azụ ụlọ Okonkwọ. Naanị ụzọ e si aga n’ọhịa a bụ nwa obere gburu gburu ohere nke dị n’ahụ aja bụ  ebe ụmụ ọkụkọ na-esi  agagharị achọ ihe ha ga-erị. Mmadụ agaghị esili n’ohere a gafere. N’ọhịa a ka Obierika dubara nwa DC na ndi otu ya. Ha gara akụkụ ụlọ akụkụ ụlọ wee gaa ezi ahụ gburu gburu. Naanị ụzụ ha mere bụ mgbe ha zọrọ ahịhịa kpọrọ nkụ ụkwụ.                         

     Ha wee garute n’osisi ahụ bụ ebe ozu Okonkwọ na-akwụgharị,ha wee guzo. Obierika sịrị nwa DC : ‘’E leghị anya, ndi otu gị nwere ike inyere anyị aka ịtọda ma liekwa ya. Anyị eziela ozi ka ndi ọbịa sitere n’obodo ọzọ bịa meere anyị nke a, ma ha nwere ike itufu oge tupu ha abịa.’’Nwa DC gbanwere otu ihu ahụ. O sitere n’ịbụ  onye ọchịchị wee bụrụzie nwa akwụkwọ nke na-amụ ihe banyere omenala ndi na-emepebeghị emepe. 

 

     Ọ jụrụ ha sị: ‘’Ọ bụ gịnị mere unu agaghị eji aka unu mee ya?’’                             Otu n’ime ha zara ya sị: ‘’O megidere omenala anyị. Ọ bụ ihe arụ na mmadụ wepụrụ ndụ ya. Ọ bụ iwu megide ala, ụmụnna enweghi ike ili onye ọ bụla mere otu a. Ozu ya bụ ihe ọjọọ, naanị ndi ọbịa nwere ike imetụ ya aka.Ya mere anyị jiri rịọ ndi gị ka ha tọtuo ya n’ihi na unu bụ ndi ọbia. Nwa DC jụkwara ha sị: Unu aga-eli ya dị ka onye ọ bụla ọzọ.?’’ ‘’                        Anyị enweghị ike ili ya. Naanị ndi ọbịa nwere ike ime otu a. Anyị ga-akwụ ndi otu gị ụgwọ ka ha meere anyị ya. Mgbe e lichara ya ka anyị ga-emere ya ihe anyị kwesiri ime. Anyị ga-achụ aja iji kpochapụ arụ ahụ merelanụ megide ala.’’                                                                     Obierika onye legidere ozu enyi ya nwoke ka ọ naara akwụgharị anya tụgharịrị na mberede  jiri obi iwe gwa nwa DC sị ya, ‘’Nwoke ahụ bụụrụla otu n’ime ndi sikarịchara ike Ụmụọfịa nwere. I mere ya ka ọ gbuo onwe ya; ugbu a, a ga-eli ya dị ka nkịta….’’ O nwekwaghị ike ikwu ihe ọzọ. Olu ya naara ama jijiji, ọ dịghịkwa okwu si na ya pụta.                                                                                                                                                Nwa DC nyere onye isi kọtọma ya iwu si: ‘’Tọtuonụ ozu ya, ma kpọrọkwa ndi a niile bia n’ụlọikpe.’’             Onye kọtọma ahụ gbuchapụụrụ ya sị: “Ooo, nna m ukwu Ị”                                              Nwa D.C. kpọọrọ ndi agha mmadụ anọ wee pụọ. N’ime ọtụtụ afọndi ahụ ọ gbalịsirila ike iweta mmepe na mpaghara Afịrịka dị iche iche, ọ mụtala ọtụtụ ihe . Otu n’ime ha bụ na nwa DC agaghị aga ihe ugwu na-adịghị n’ime ya, dị ka ịga tọtuo onye kwụrụ ụdọ n’elu osisi. Ụdịrị ihe ahụ ga-eme ka ndi obodo lelịa ya anya. Mgbe ọ naara alaghachi azụ n’ụlọikpe, o chere ihe banyere akwụkwọ ahụ. Kwa ụbọchị ka ọ na-enweta ihe ọhụrụ nke ga-dị n’ime ya. Ọ ga-atọ onye ọ bụla ụtọ ịgụ akụkọ nwoke a gburu onye kọtọma ma kwụọ ụdọ n’elu osisi. O nwere ike iji ya deta otu isi edemede. O nwere ike ọ gaghị erucha otu isi ma ọ ga-abụ nkebi edemede zuru oke. O nwere ọtụtụ ihe ndi ọzọ ọ ga-edenyekwa n’ime ya,n’ihi ya ọ ga-akpachapụ anya wepụ ihe ndi na-adịghị oke mkpa. Ọ họpụtalarị ihe ga-abụ isiokwu akwụkwọ ahụ, mgbe o chechara ogologo echiche:  ‘’Iweta Udo n’etiti agbụrụ ndi na-empebeghị emepe n’agbọ oke osimiri Niger.’’       

 

 

IGBO AMAKA

ỤLỌAKWỤKWỌ IGBO

MỤTA IGBO

CULTURAL DANCE

MASQUERADE

EGWU DI YA

EDEMEDE IGBO

ONYE NKUZI IGBO

OLU ỤMỤ IGBO

IGBO MADE EASY

Learn In Igbo in 1 day

Learn In Igbo

Copyright � 2018-2020. Mother Tongue Academy. All Rights Reserved.We can be  reached  by Phone at (516) 442-9191  or by our Website  Contact  E-mail