Login and Register

Log in  \/ 
x
x
Register  \/ 
x

Home

Chap1-Isi Nke Mbụ

 

ISI NKE MBỤ

 

 

Okonkwọ bụ nwoke a maara nke ọma n’obodo toolu ahụ niile ma gafekwaa. Ebube ya sitere n’ike niile ọ kpara. Dị ka nwa okorọbịa dị afọ iri na asatọ, o wetarala ndi obodo ya ugwu site n’ịtụ Amalịnze  nke a na-akpọ nwamba n’ala na mgba. Amalinze bụ ọkamgba ahụ nke ọ dịbeghị onye meriri ya n’ime afọ asaa site n’Ụmụọfịa ruo na Mbaịnọ. A na-akpọ ya  nwamba n’ihi na azụ ya anaghị eru ala. Ọ bụ nwoke a ka Okonkwọ tụrụ n’ala na mgba nke agadi nwoke ahụ kwetara na ọ bụ otu n’ime mgba sikarịrị ike kemgbe nna nna ha ochie bachara mmụọ ara mgba abalị asaa.

Ekwe mgba naara ada, ọja naara egbu ebe ndi nlere anya jidekwara ume ha n’aka. Amalịnze bụ onye oke akọ, ma Okonkwọ naara amị amị ka azụ nọ n’mmiri. Akwara niile dị ha n’ahụ pụtachara n’aka ha; azụ ha nakwa n’ụkwụ ha ebe ọ fọrọ ntakịrị ka ha gbajie onwe ha abụọ. N’ikpeazụ, Okonkwọ tụrụ nwamba ahụ n’ala.

Nke a mere ọtụtụ afọ gara aga: iri afọ abụọ ma ọ bụ karịa. Mgbe ahụ ebube Okonkwọ agazuola dị ka oke ọhịa na-agba ọkụ n’oge ụgụrụ. O toro ogologo ma gbakwaa agba, iku anya ya nakwa obodobo imi ya na-akwanye onye  ọ bụla egwu n’ahụ. Ọ na-eku ume ike ike, ebe a sịrị na ndi nwunye ya na ụmụaka ya na-anọ n’ụlọ nke ha anụ ka ọ na-eku ume mgbe ọ bụla o na-ehi ụra. Mgbe ọ bụla ọ na-aga ije ọ di ka ọ ga-adakwasị n’elu mmadụ ibe ya n'ihi na ọ dị ka o nwere ihe na-atụli ya elu ebe ikiri ụkwụ ya adịghị eru ala. Mgbe ụfọdụ, ọ na-abakwunye mmadụ ma ọ na-aga. Ọ na-asụ obere nsụ n’ihi ya ọ na-eji aka ya kwuo okwu mgbe ọ bụla iwe na-ewe ya ma ya enweghị ike ikwuputa okwu ngwa ngwa. Ọ naghị emere ndị efulefu ebere. O nweghị obi ebere ebe nna ya nọ.

Ụnọka onye bụ nna ya nwụrụ afọ iri gara aga. Oge ọ nọ ndụ, ọ bụụrụ onye umengwụ nke na anaghị eche echiche banyere echi. Ngwa ngwa ego ọ bụla batara ya aka, dị ka o si abịara ya mgbe ụfọdụ ọ na-ewere ya luo mmanya ma kpọkwa ndi agbata obi ya oriri. Ọ naara asị na mgbe ọ bụla ya hụrụ ọnụ onye nwụrụ anwụ na ya na-echeta iberibe onye ahụ mere site n’erighi akụ ya n’oge ọ nọ ndụ. Ụnọka bụ onye a ma ama n’iji ụgwọ. O jiri onye agbata obi ya ọ bụla ụgwọ, sitere n’ego ayọrọ ole wee ruo n’ọtụtụ ego ayọrọ.

O toro ogologo, taakwa ahụ ma hurukwa ehuru nwa obere. Ọ na-adị ka onye na-agba mkpe mgbe ọ bụla na-abụghị naanị mgbe ọ na-aṅụ mmanya ma ọ bụ egbu ọja ya. Ọ maara ka e si egbu ọja. Oge ọ na-enwekarị obi aṅụrị bụ n’ime ọnwa abụọ ma ọ bụ atọ ahụ bụ mgbe e  mechara owuwe ihe ubi ya bụ mgbe ndi egwu obodo ya ga-ebutu ngwa egwu ha nke ha kobere n’anya ọkụ. Ụnọka na-eso ha eti egwu, ihu na-abụ ya sọ udo na-aṅụrị. Mgbe ụfọdụ, ndi obodo ọzo na-arịọ Ụnọka na ndi egwugwu ha ka ha bịa nọnyere ha ma kuziekwara ha egwu ha. Ha na-aga ebe dị otu a ma nọọkwa ihe dị ka izu ahịa atọ ma ọ bụ anọ na-akụ egwu ma na-erikwa oriri. Udị nnọkọ dị otu a na-atọ Ụnọka ụtọ nke ukwu. Ụdị ugbu a n’afọ, ya bụ mgbe mmiri ozuzo kwụsịrị, anwụ ejiri ịma mma na-awa kwa ụtụtụ na-atọkwa Ụnọka ụtọ nke ukwu. Oke okpomọkụ anaghịkwa adị n’oge ahụ n'ihi na ufufe oyi ụgụrụ na-esi na mpaghara ugwu abịa.

N’afọ ụfọdụ, oyi ụgụrụ na-atụsi ike ma na-ebutekwa oke alụlụo n’elu igwe. Ndi okenye nakwa ụmụaka naara anọ ọkụ gburugburu anyakọ onwe ha. Udị ọnọdụ dị otu a na-amasị Ụnọka nke ukwu. Ọ na-amasikwa ya ịhụ egbe ndị mbụ na-eso ọkọchị alọta nakwa ụmụaka na-agụ egwu iji nabata ha. Mgbe ahụ ọ ga-echeta mgbe ọ ka bụ nwatakịrị, na otu ọ naara esi akpagharị achọ egbe na-efe n’eluigwe. Ngwa ngwa ọ hụrụ otu, ọ ga-eji obi ya niile gụwara ya egwu nnabata site n’ụzọ ije ya, ma jụwakwa ya ma o nwere akwa ọ bụla o welatara ụlọ.

Nke a mere otụtụ afọ gara aga mgbe ọ nọ na nwanta. Ugbu a o torola, Ụnọka bụ akaloghọri. Ọ bụ ogbenye,, ụmụ ya na nwunye ya anaghị ahụ ihe ha na-eri. Ndị mmadụ naara achị ya ọchị n’ihi na ọ bụ akaloghori, ha na-aṅukwa iyi na ha agaghị agbazinye ya ego ọzọ n’ihi na ọ naghị akwụghachi ha. Na-agbanyeghi nke a, Ụnọka bụ mmadụ na-enwe ike ịgbazite ego ọzọ tinyekọọ n’elu ụgwọ ndi o ji.

Otu ụbọchi, otu onye agbata obi ya aha ya bụ Okoye bịara ịhụ ya. Ọ naara ezu ike n’elu akwa aja dị n’ụlọ ya ma na-egburutu ọja ya. O biliri ngwa ngwa ma kwekwa Okoye n’aka nke bụ onye tọghasịrị ụte ajị ọ nya n’aka, ma nọrọkwa ala, Ụnọka wee baa n’otu ụlọ ya ma pụtakwa buru ọkwa ọjị, ose ọjị na ọkpụrụkpụ nzụ dị n’ ime ya. “Enweela m ọjị,” ka ọ gwara onye ọbịa ya mgbe ọ nọdụrụ ala, ma burukwa ọkwa ahụ bunye ya. “I meela. Onye wetara ọjị, wetara ndụ. Ma echere m na ọ bụ gị ga-awa ya”, ka Okoye kwuru wee bughachiri ya ọkwa ahụ.

“Mba, echere m na ọjị a bụ nke gị”, otu a ka ha siri arụmarụ nwa mgbe nta tupu Ụnọka wee kweta ịwa ọjị ahụ. Ka nke a na-aga, Okoye were ọkpụrụkpụ nzụ ahụ, kaa akara ụfọdụ n’ala, ma tejiekwa isi mkpịsị ụkwụ ya.

Mgbe ọ na-awa ọjị ahụ, Ụnọka rịọrọ ndi nna nna ha ka ha nye ha ndụ na ahụ isi ike ma na-echedokwa ha site n’aka ndị iro ha. Ka ha tachara ọjị ahụ, ha kọrọ akụkọ metụtara ọtụtụ ihe, dị ka oke mmiri ozuzo nke na-emebicha ji ha kọrọ n’ubi, omume ọdịnala ha ọzọ nakwa agha ahụ nke na-eru n’etiti ha na ndị Mbaịnọ. Obi anaghị adị Ụnọka mma n’ihe ọ bụla metutara agha. N’ezie, ọ bụ onye ụjọ n’ihi ya ọ naghị eji anya ya ahụ ọbara. Ya mere o jiri gbanwe isiokwu ha wee kọwa ihe gbasara egwu, ihu wee bụrụ ya sọ ọchị. N’ime obi ya, ọ na-anụ ụda ụtọ dị iche iche nke ekwe, udu na ogene, ọ na- anụkwa ka ọja ya na-adakọta ọnụ n’ime ha, na-edozikwa ha ka ha wee mepụta ụda egwu dị ụtọ. Ka ọ dị ugbu a, ụda egwu a dị ụtọ, ma ọ bụrụ na e wepụta ụda ọja ahụ iche ka ọ na-arị elu arịda, a ga-ahụ na ọ bụ iri uju na ọnụma juputara na ya.

Okoye n’onwe ya bụkwa oti egwu. Ọ na- akụ ogene. Ma ọ bụghị akalogholi dị ka Ụnọka. O nwere ọba ji buru ibu nke ji juputara n’ime ya ma nwekwa ndi inyom atọ. Ugbu a ọ na-akwado ichi echichi Idemili, ya bụ echichi nke atọ dịkarịsirị elu n’obodo ha. Echichi a na-efu nnukwu ego, n’ihi ya ọ na-achikọta akụ ya ọnụ. N’ezie nke a bụ ihe kpatara o jiri bịa ihụ Unọka. Ọ kwara ụkwara wee sị: “I meela maka ọjị i nyere m. E leghị anya, ị nụla maka echichi a m na-achọ ichi n’oge na-adighị anya.”

Ka o kwuchara nke a n’ụzọ dị were were, Okoye jiri ilu kwuchapụ ọkara ihe ndị ọzọ. Ndị igbo na-ewere mkparịta ụka dị ka ihe dị oke mkpa, ebe ilu bụ mmanụ ha ji eri okwu. Okoye bụ onye oke okwu n’ihi ya o kwuru okwu ogologo oge na-agbagharị okwu ya gburu gburu wee ruo n’ikpeazụ mgbe o kwuputara ihe o jiri bịa. N’igbu okwu ya nke nke, ọ na-agwa Ụnọka ka ọ kwụghachi ya narị ego ayọrọ abụọ ahụ ọ gbazinyere ya ihe karịrị afọ abụọ gara aga. Ngwa ngwa Ụnọka ghọtara ihe enyi ya nwoke na-ekwu, ọ dapụrụ n’ọchi. O jiri oke olu chịa ogologo ọchị nke mere na olu ya dị ka ogene ebe anya mmiri pụtakwara ya n’anya. Omume a tụrụ ọbịa ya n’anya nke ukwu, o nyeghịkwa ya ọnụ okwu. N’ikpeazụ, Ụnọka jisiri ike nye ya ọsịsa n’etiti oke ọchi ọhụrụ.

“Lee anya n’ahụ aja ahụ,” ka ọ gwara ya site n’itụrụ ya aka n’ahụ aja ụlọ ya nke e tere aja uhie, o wee na-amụke amụke. “Lee akara nzụ ndị ahụ,” Okoye hụrụ ọgbara obere akara ndị e jiri nzụ kaa bụ ndi nọdebere onwe ha. Ha dị ọgbara ise, nke dịkarịsịrị nta n’ime ha nwere akara iri. Unọka nke bụ onye maara otu e si eme ihe ọchị nyetụrụ nwa obere ohere bụ nke o jiri kpọọ anwụrụ, ziekwa ndụ tupu ọ na-aga n’ihu: “Otu n’ime ọgbara ndị ahụ nọchiri anya ụgwọ m ji ndị mmadụ ebe akara ọ bụla n’ime ha bụ otu narị ego ayọrọ. Ị hụla na eji m nwoke ahụ otu puku ego ayọrọ ma ọ dịbeghị mgbe o jiri ụtụtụ kụtee m maka ya. Aga m akwụ gị ụgwọ gị ma na ọ bụghị taa. Ndi okenye anyị na-ekwu sị na anwụ na-ebu ụzọ chasagodu ndị kwụ ọtọ tupu o rutere ndi nọ n’okpuru ha. Aga m ebu ụzọ kwụchagodu ụgwọ m ndi buru ibu.” Ka o kwuchara nke a, ọ kpọrọ anwụrụ ọzọ dị ka a ga-asị na ọ bụ ya bụ ibụ ụzọ kwụchapụ ụgwọ ya ndị buru ibu. Okoye fụkọtara ute akpụkpọ ewu ya wee laa.

Mgbe Ụnọka nwụrụ, ọ dịghị echichi ọ bụla o chiri, O jikwara ụgwọ buru ibu. N’ihi nke a, ọ tụghị onye ọ bụla n’anya na nwa ya Okonkwọ kpọrọ ya asị. Ka ihe siri dịrị ya mma, ndị obodo ha na-ekpe onye ọ bụla ikpe dị ka akaọrụ ya siri dị na-abụghị dị ka akaọrụ nna ya sịrị dị. Okonkwọ bụ onye a marala ama n’ime ihe siri ike. Ọ ka bụ nwa okorọbia ma o turularị ugo dị ka ọkamgba n’ime obodo toolu ndị ahụ.Ọ bụ onye ọrụ ubi a mara nke ọma. O nwere ọba abụọ nke ji juputara n’ime ha. O tebeghị aka o jiri lụta nwunye ya nke atọ. N’iji tụkwasị n’elu ihe ndị a, o chiela ụzọ echichi abụọ ma kpaakwa ike dị egwu n’ime agha mba na mba abụọ. N’ihi nke a, na-agbanyeghị na Okonkwọ ka bụ nwa okorọbia, ọ bụrụlar otu onye n’ime ndị kachasị ibe ha n'oge ya. N'obodo ya,a na-kwanyere ndi okenye ugwu ma a na-asọpụrụ ndị kparala ike asọpụrụ. Dị ka ndi okenye kwuru, ọ bụrụ na nwata akwọzie aka ya nke ọma, o nwere ike isoro eze rie nri. Okonkwọ akwọzielarị aka ya nke ọma n’ihi ya o sorokwala ndi eze na ndi okenye rie nri. Otu a ka o jiri bụrụ ya naara elekọta nwantakịrị ahụ nke ndi agabata obi Ụmụọfịa jiri chụọrọ ha aja iji gbochuo agha na ịghafu ọbara. Aha nwa chi ọjọọ ahụ bụ Ikemefuna. 

 

 

IGBO AMAKA

ỤLỌAKWỤKWỌ IGBO

MỤTA IGBO

CULTURAL DANCE

MASQUERADE

EGWU DI YA

EDEMEDE IGBO

ONYE NKUZI IGBO

OLU ỤMỤ IGBO

IGBO MADE EASY

Learn In Igbo in 1 day

Learn In Igbo

Copyright � 2018-2020. Mother Tongue Academy. All Rights Reserved.We can be  reached  by Phone at (516) 442-9191  or by our Website  Contact  E-mail