Login and Register

Log in  \/ 
x
x
Register  \/ 
x

Home

Chap2-Isi Nke Abụọ

ISI NKE ABỤỌ

   

    

Ọ dịbeghị anya Okonkwọ jiri fụnyụọ ọkụ ya ma dinakwa n’elu akwa osisi ya ka o bidoro nụwa onye ọkụekwe ka ọ naara akụ ogene ya n’ime etiti abalị. Ogene ahụ naara ada “ gom, gom, gom!” Ọkụekwe ahụ wee zie ozi ya ma kụọkwa ogene ya n’ikpeazụ. Nke a bụ ihe o kwuru: A chọrọ ka nwoke ọ bụla bụ onye Ụmụọfịa gbakọtaa na mbara ahịa ha n’ụtụtụ echi. Ọ gbara Okonkwọ gharịị ihe kpatara nke a n’ihi na ọ matara na o nweriri ihe merenụ. Site n’ụda okwu onye ọkụ ekwe ahụ, ọ chọpụtara na oke ihe ọjọọ mere, ọ bụladị ugbu a,ọ ka na-anụkwa olu ahụ ka ọ na-ada ntakịrị ntakịrị n’ebe dị anya.

 

Abalị ahụ dara jụụ. Ọ na-adịkwa otu a na-abụghị sọ mgbe ọnwa na-eti. Ọchịchịrị bụ ihe itụ egwu nye ndị obodo a, ọ bụladị ndị sikarịsịrị ike n’ime ha. A na-adọ ụmụaka aka na ntị ka ha ghara ime mkpọtụ n’abalị n’ihi egwu ndi ajọ mmụọ. Ụmụ ajọ anụmanụ na-akpakwa ike dị egwu n’ochịchịrị. A naghị akpọ agwọ aha n’abalị n’ihi na ọ na-anụ ya. A na-akpọ ya eriri. Ya mere, n’abalị a, ebe niile dakwara jụụ mgbe olu ọkụekwe a gabigachara, naanị ihe a na-anụ olu ha bụ akwa imerime ụmụ ahụhụ bi n’ime ọhịa.

 

Ihe dị iche na-adị n’abalị ọ bụla ọnwa na-eti. A na-anụ olu ụmụaka na-egwuri egwu n’obi ụtọ na mbara ezi. E leghị anya ndị na-akatachabeghị ahụ ga na-egwuri egwu nke ha abụọ abụọ n’ebe na-apụtachaghị ihe, ebe ndị agadị nwoke na agadị nwanyị ga na-echeta mgbe ha ka dị n’okoro na agbọghọ. Dị ka Igbo na-asị na “ọnwa gbawa ije agụwa ngwụrọ.”

 

Ma abalị a gbara ọchịchịrị wee dakwaa jụụ. Otu onye ọkụekwe jikwa ogene ya na-agagharị n’ime ọnụama toolu ahụ mejuputara Ụmụọfịa na-agwa nwoke ọ bụla ka ha pụtawa n’ụtụtụ echi. Okonkwọ nọ n’elu akwa ogugu ya na eche ihe oku gbata gbata a ga-abụ- eleghị anya, ọ ga-abụ iji buso otu ndị agbata obi ha agha. Ọ bụghị onye na-atụ agha egwu. Ọ bụ nwoke ike , dike ọgụ. Ọ naghị eme ka nna ya n’ihi na ọ na-ejiri anya ya ahụ ọbara. Ya bụ onye mbụ bulatara isi mmadụ n’agha ikpeazụ ndị Ụmụọfịa lụrụ. Nke ahụ bụ isi nke ise ọ na-egbu ma o mebekwaghị okenye.

 

N’omume ukwu obodo dị ka ịkwa ozu onye a ma ama, ọ na-eji isi mmadụ mbụ o gburu aṅụ mmanya.

N’ụtụtụ, mbara ahịa niile juputara na mmadụ. A gaara ahụ ihe ruru iri puku ndị nwoke n’ebe ahụ, ha niile ji olu dị ala na-ekwu okwu. N’ikpeazụ, Ogbuefi Ezeugo guzoro n’etiti ha ma bekuokwa ha ugboro anọ, Ụmụọfịa kwenu!!”. O sitịrị aka ya ma cheekwa ihu n’ebe dị iche iche n’ime ugboro anọ ndị a. Iri puku mmadụ ndị a zara ya “yaa!!” mgbe ọ bụla o bekuru ha. Ebe niile wee dakwaa jụụ. Ogbuefi Ezeugo bụ onye ọka okwu n’ihi ya a na-ahọpụta ya ka o kwuo okwu n’oge dị otu a. Ọ chịgharịrị isi awọ ya ma dọtụkwa afọ ọnụ ya. Ọ dọzikwara akwa ya bụ nke sitere n’akpa abụ aka nri ya wee gafee ma jikọkwaa ọnụ n’ubu aka ekpe ya.

O wee bekuokwa ha nke ugboro ise sị, “Ụmụọfịa kwenu,” ha niile jirikwa otu olu zaa ya.

 N’otu ntabị anya, o setịrị aka ekpe ya dị ka onye ara na-acha wee tụdo ya  n’ụzọ Mbaịnọ, ma sitekwa n’ịtachị eze ọcha ya sị, “ Ụmụ anụ ọhịa ahụ na-azụghị azụ nwara wee gbuo otu ada Ụmụọfịa.” Mgbe o kwuchara nke a, o weturu isi ya ala ma taakwa ikikere eze ya. O mere nke a iji nye ohere ka mmadụ niile gosipụta iwe ha. Mgbe o bidoro ọzo, iwe ahụ dị ya n’ihu apụọla kama ọ bụzi eze ọchị nọchiri, ma ụdịrị ọchị a dị njọ karịa iwe. O jiiri ezigbo olu wee kọọrọ ndị Ụmụọfịa ka ndị Mbaịnọ jiri gbuo ada ha nwanyị gara ahịa n’obodo ha. Ọ gwara ha na nwanyị ahụ bụ nwunye Ogbuefi Udo ma tụọkwara ha otu nwoke nọdebere ya nke na-erikwa uju aka. Igwe mmadụ ahụ nọ ebe ahụ jiri obi iwe wee tiwe mkpu agha.

 

tụtụ ndị ọzọ kwuru okwu ma n’ikpeazụ, ha kpebiri na ha ga-esi ụzọ ziri ezi sowe ya bụ okwu. Ngwa ngwa ha zipuru ozi zigara ndị Mbaịnọ ịgwa ha ka ha họrọ ịlụso ha agha n’otu ụzọ, ma ọ bụkwanụ inye ha otu nwa okorọbịa na otu nwa agbọghọ na-amabeghị nwoke dị ka ihe iti aka n’obi, n’aka nke ọzọ.

 

Ndị agbata obi Ụmụọfịa niile na-atụ ya egwu. Ọ na-akpa ike dị egwu n’ebe agha nakwa ọgwụ dị, a na-atụkwa ndị nchuaja na ndị dịbịa ha egwu na gburugburu obodo ha niile. Ọtụmọkpọ ha ji aga agha bụkwa nke siri n’ala ahụ pụta. Ọ dịghị onye ma afọ ole ọ gbarala. Ma ọ dị otu nkwekọrịta mmadụ niile nwere - ya bụ na ihe na-akpa ike n’ọtụmọkpọ ahụ bụ otu agadị nwanyị nwere otu ụkwụ. N’ezie aha ọtụmụọkpọ ahụ n’onwe ya bụ agadị nwanyị. Ụlọ ya dị n’etiti obodo Ụmụọfịa bụkwa ebe a bọchasịrị nke ọma. Ọ bụrụ na mmadụ akpachaghị anya wee gafewe ebe ahụ n’anyasị, ọ ga-ahụrịrị agadị nwanyị ahụ ka ọ na- awụgharị.

 

N’ihi nke a, ndị agbata obi Ụmụọfịa niile bụ ndị matarala nke a na mbụ na-atụ ya egwu. Ha agaghịkwa ebusọ ya agha na-ebughị ụzọ chọwa udo. N’iji kwuo eziokwu, a ga-asị na ndị Ụmụọfịa enweghị ike ịlụ agha ọ bụla na-abụghị ma ikpe gara ha, ya bụkwa nke agbara ha kwadoro. Mgbe ụfọdụ, agbara ahụ na-agwa ndị Ụmụọfịa ka ha ghara ịga agha. Ọ bụrụ na ha enupu isi, a ghaghị imeri ha n’ihi na agadị nwanyị ahụ a na-atụ egwu enweghị ike ịlụ agha ndị igbo na-akpọ agha ịta ụta.

 

Ma agha nke a  na-akwado ịda bụ agha ziri ezi. Ọ bụladị ndị iro ha makwara nke a. Ya mere mgbe Okonkwọ onye Ụmụọfịa nke bụkwa dike a ma ama n’agha rutere Mbaịnọ, ha jiri ugwu na nsọpụrụ nabata ya. Ka abalị abụọ gachara, ọ kpọrọ otu nwatakịrị nwoke gbara afọ iri na ise na otu nwagbọghọ na-amabeghị nwoke wee lọta. Aha nwa nwoke ahụ bụ Ikemefuna bụkwa onye a ka na akọkwa akụkọ mwute ya n’Ụmụọfịa ruo taa.

 

Ndi okenye gbakọtara ịnụrụ ọtu Okonkwọ siri jee ozi ahụ. N’ikpeazụ, ha kpebiri di ka a tụrụ anya na nwa agbọghọ ahụ ga-anọchi anya nwunye Ogbuefi Udo. Nwa okorọbịa ahụkwanụ bụ nke ndị Ụmụọfịa niile, ya mere na ọ dịghị ha ọsịịsọ iji kpebie ihe ga-abụ ọnọdụ ya. Ma ugbu a, ndị Ụmụọfịa gwara Okonkwọ ka ọ na-elekọtara ha ya anya. Ya mere Ikemefuna jiri bie n’ụlọ Okonkwọ afọ atọ.

 

Okonkwọ jiri aka ike na-achị ezinaụlo ya. Ndị nwunye ya, ọ bụladị nke ọdụdụ n’ime ha nakwa ụmụ ya na-atụ egwu mgbe ọ bụla maka iwe ọkụ ya. Ma e leghị anya, n’ime onwe ya Okonkwọ abụghị  ajọ mmadụ. Itụ egwu bụ ihe naara achị ndụ ya , itụ egwu umengwu nakwa ọdịda. Ọ dị omimi karịa egwu mmụọ ojọọ nakwa nke igwọ ọgwụ, nke ajọọ ọhịa na nke ihe ọjọọ na-akpagharị n’elu ụwa. Egwu Okonkwọ karịrị ndị a. Ọ bughị ihe anya na-ahụ ma ọ dị n’ime onwe ya. Ọ bụ egwu onwe ya, ka a ghara ịsị na o yiri nna ya. Ọ bụladị mgbe ọ bụ nwata, ọ kpọrọ umengwu nna ya asị. Ruo ugbu a, ọ na-echeta arịrị o riri mgbe nwa ọgbọ ya gwara na nna ya bụ agbala. Otu a ka Okonkwọ siri mata na agbala abughị naanị aha nwanyị kama  e nwekwara ike ịkpọ ya nwoke adịghị  echichi ọ bụla o chiri. Ya mere Okonkwọ jiri buru otu ihe n’obi- ya bụ ịkpọ ihe ọ bụla nna ya Ụnọka hụrụ n’anya asị. Otu n’ime ihe ndị a bụ ịdị nwayọ ebe nke ọzọ bụ ịnọ n'efu.

 

N’oge ọrụ ubi, Okonkwọ na-arụgide ọrụ n’ubi ya kwa ụbọchị site n’isi ụtụtụ wee ruo n’ime anyasị. Ọ bụ nwoke siri ike n’ihi ya ike anaghị agwụ ya ọsịịsọ. Ma ndị nwunye ya na ụmụ ya adịghị ike otu ahụ, ya mere ha jiri ata ahụhụ. Ọ dighị onye n’ime ha nwere ike ikwuputa nke a. Nwoye nke bụ diọkpara Okonkwọ gbara afọ iri na abụọ ebidolarị nyewe nna ya ọbara mgbali elu n’ihi umengwu ya. Ka o sina dị,otu a ka ọ dị n’anya nna ya. Ya mere o jiri na-abara ya mba nakwa akụ ya ihe mgbe dum iji duzie ya ụzọ. Ya mere Nwoye jiri na-eto di ka nwa okorọbịa ihu anaghị atọ ọchị.

 

Akụ na ụba Okonkwọ ka a  na-ahụ n’ezinaụlọ ya. Ezi ya buru ibu bụkwa nke o ji aja uhie gbaa gburu gburu. Nke ọ bụla n’ime ndị nwunye ya atọ nwere ụlọ nke ya n’azụ obi ya. Ọ rụgidere ọba ji ya n’otu isi ahụ aja ụlọ bụ ebe ọtụtụ ogologo mkpa ji guzochara onwe ha. N'isi ụlọ nke ọzọ bụ ebe ọgba ewu ha dị. Nke ọ bụla nime nwunye ya rụkwunyere obere ntu nisi ụlọ ya maka ọkụkọ. N'akụkụ ọba ya ka Okonkwọ rụrụ ụlọ arụsị ya nke bụ ebe o dotere ihe ndị a kpụrụ akpụ bụ ndị na-anọchi anya chi ya nakwa mmụọ ndị nna ya ochie. Ọ na-ekpere ha site n’ichụrụ ha aja ọjị, erimeri na mmanya. Ọ na-arịọkwa ha ka ha na-echebe ya, ndị nwunye ya atọ na ụmụ ya asatọ.

 

Ya mere mgbe ndị Mbaịnọ gburu ada ndị Ụmụọfịa, Ikemefuna bịara biri n’ụlọ Okonkwọ. Mgbe Okonkwọ kpọlatara ya ụlọ n’ụbọchị ahụ, o nyefere ya n’aka isi nwanyị ya. Ọ gwara nwunye ya sị: “ nwa a bụ nwa ndị obodo, n’ihi ya, lekọta ya anya nke ọma.̂

Nwunye ya jụrụ ya sị: “ Anyị na ya ga-ebite aka?” Okonkwọ jiri oke olu dị ka egbe igwe baara ya mba sị, “ mee ihe a gwara gị, nwanyị. O lee mgbe I bidoro bụrụ otu n’ime ndichie Ụmụọfịa?”

 

Nne Nwoye kpọbara Ikemefuna n’ụlọ ya na-ajụghịkwa ajụjụ ọ bụla ọzọ.

Oke egwu tụrụ Ikemefuna n’onwe ya, Ọ mataghị ihe na-eme ya ma ọ bụkwanụ ihe o mere. Kedukwanụ ka ọ ga-esi mata na nna ya so na ndị gburu ada ndị Ụmụọfịa? Naanị ihe ọ matara bụ na ndị nwoke ole na ole bịara n’ụlọ ha, ha na nna ya jiri olu dị ala kparịta ụka. N’ikpeazụ ọ kpọtara ya nye otu onye ọbịa. Nne ya bere oke akwa ma ya onwe ya ebeghị akwa ọ bụla n’ihi na ihe nke a gbara ya gharịị. E mesịa, onye ọbịa a kpọrọ ya na otu nwa agboghọbịa gara ogologo ụzọ ọhịa wee lọta. Ọ maghị onye nwa agbọghọbia ahụ bụ nke o ji ahukwa ya anya ọzọ.

 

 

 

IGBO AMAKA

ỤLỌAKWỤKWỌ IGBO

MỤTA IGBO

CULTURAL DANCE

MASQUERADE

EGWU DI YA

EDEMEDE IGBO

ONYE NKUZI IGBO

OLU ỤMỤ IGBO

IGBO MADE EASY

Learn In Igbo in 1 day

Learn In Igbo

Copyright � 2018-2020. Mother Tongue Academy. All Rights Reserved.We can be  reached  by Phone at (516) 442-9191  or by our Website  Contact  E-mail