Login and Register

Log in  \/ 
x
x
Register  \/ 
x

Home

Chap6-Isi Nke Isii

ISI NKE ISII

 

 

Ndị obodo niile pụtara n’ilo ndị nwoke, ndị nwanyị na ụmụntakịrị. Ha guzoro gburu gburu ebe ahụ ma hapụkwa ohere n’etiti ama egwuregwu ahụ. Ndị ichie na ndị ukwu obodo nọrọ n’oche ha nke ụmụ ha ma ọ bụ ndị ohu ha butere ha. Okonkwọ nọ n’etiti ha. Ndị ọzọ niile guzo ọtọ ma e wepụ ndị ahụ bịara ngwa ngwa ma were oche ole ahụ ha jiri ogwe osisi wee rụọ.

  Ndị mgba abịarubeghị ebe ahụ, sọ ndị na-akụ nkwa ka ji ama. Ha onwe ha nọkwa ọdụ n’ihu igwe mmadụ ndị a bịara ilere anya. Ha chedokwara ndi ichie ahụ ihu. Osisi akwụ ahụ buru ibu, karala nka ma dịkwa nsọ dị ha n’azụ. Mmụọ ụmụaka ọma bi n’ime osisi a na-eche ka a mụọ ha. N’ụbọchị nkịtị, ụmụ agbọghọbịa ndi na-achọ nwa na-abịa nọrọ na ndo ya.

  Ha dị ekwe asaa. A dọnyechara ha n’ime nkata n’usoro otu ha ha. Ụmụ nwoke atọ ji osisi na-akụ ha.Ha gbalịsịrị ike n’ihi na mmụọ nke ekwe ndị ahụ ejidela ha.

  Ụmụ nwoke ndị na-achịkọta ndị mmadụ na mmemme dị otu a, na-agagharị, na-akparịta ụka n’onwe ha nakwa n’etiti ndị ndu otu mgba abụọ ndị a bụ ndị ka nọ n’azụ igwe mmadụ ahụ. Mgbe ụfọdụ, ụmụ nwoke abụọ ga-eji igu nkwụ gaa gburu gburu ịchụghachi ndị mmadụ azụ site n’ịkụ ya n’ala n’ihu ha. Ọ bụrụ na ndị ahụ emewe isi ike, ha na-apịa ha ya n’ụkwụ.

  N’ikpeazụ, otu abụọ ndị a batara n’ọgbọ mgba, ndị mmadụ wee tie mkpu ma kụọkwa aka. Ekwe mgba ndị ahụ bidoro dasiwe ike. Ndị mmadụ bidoro pụtasịwa n’ihu. Ndị nchekwa ahụ jiiri igu nkwụ ha gagharịa. Ndị agadị nwoke ji isi ha na-ekwe ụda ekwe ahụ na-echetakwa mgbe ha gbara mgba nke ha.

  Ụmụ nwoke ndị gbara afọ iri na ise ma ọ bụ iri na isii bidoro mgba ahụ. Ha dị naanị mmadụ atọ n’otu otu. Ha abụghị ndị ezigbo mgba ahụ; ọrụ ha bụ naanị idozi ụzọ. Na nwa obere oge, ha agbaala mgba abụọ. Mgba nke atọ tụrụ mmadụ niile n’anya, ọ bụladị ndị okenye ndị na-adịghị ezipụta aṅụrị ha ebe ọ pụtara ihe . Ha gbara mgba ahụ ngwa ngwa dị ka abụọ ndị ọzọ ma ọ bụ karịa otu ahụ. Naanị mmadụ ole na ole hụrụla ụdị mgba ahụ mbụ. Ngwa ngwa ụmụaka abụọ ndị a bidoro, otu n’ime ha mere ihe mmadụ na-enweghị ike ịkọwa n’ihi na ọ dị ka ebe amụma mmiri sere. Onye nke ọzọ jiiri azụ ya daa n’ala. Nke a mere ka igwe mmadụ ahụ kụọ aka ha ma tiekwa mkpụ nke dachiri ụda ekwe ahụ. Okonkwọ walitere n’ike ma nọrọkwa ala ozugbo. Ụmụ nwoke atọ sitere n’ebe nwantakịrị ahụ meririnụ gbapụtara, bulie ya elu wee gbagharịa egwu n’etiti ndị ahụ na-akụrụ ya aka. Madụ niile mechara mata onye nwa ahụ bụ. Aha ya bụ Madụka nwa Obierika.

Ndị a na-akụ nkwa kwụsịrị ka ha zurutu ntakịrị ike tupu ezigbo mgba ahụ ebido. Ọsịsọọ juru ha ahụ, n’ihi ya ha weere akụpe na-efe onwe ha. Ha ṅụrụ mmiri ma taakwa ọjị. Ha nwetakwara onwe ha ọzọ, ha na-akparịta ụka ma na-achịrịta ọchị n’etiti onwe ha nakwa n’etiti ndị nọdebere ha. Ebe niile dakwara jụụ ọzọ. Ọ dịka a wụrụ mmiri n’elu nkwa ndị ahụ. Ọtụtụ ndị mmadụ legharịrị anya ha nke mbụ wee hụta ndị nọdebere ha.

  Ekwefi gwara otu nwanyị nke guzoro ya n’akụkụ kemgbe mgba ahụ bidoro sị “Amataghị m na ọ bụ gị”.

   Nwanyị ahụ zara ya sị “Ataghị m gị ụta. Ahụbeghị m ụdị igwe mmadụ a mbụ. Ọ bụ eziokwu na Okonkwọ chọro ịgbagbu gị n’egbe?”.

 “Ọ bụ eziokwu, enyi m nwanyị. Ahụbeghị m ọnụ m ji akọ ya bụ akụkọ.”

 “Enyi m nwanyị, chi gị mụ anya. Kedu maka ada m Ezimma?”

 “Ahụ adịchaala ya mma ugbu a. Echekwaghị m na o nwere ihe ga-emekwa ya ọzọ”

  “Echekwara m otu ahụ. Afọ ole ka ọ gbarala ugbu a?”

  “Ihe dị ka afọ iri”.

   Echere m na ọ ga-anọzi nke ugbu a. Ha na-anọ ma ọ bụrụ na ha anwụghị tupu ha agbaa afọ isii.”

  Ekwefi sụrụ oke ude wee sị “Ana m ekpe ekpere ka ọ nọrọ”

  Nwanyị ahụ ya na ya na-akparịta ụka bụ Chielo. Ọ bụ ya bụ eze nwanyị Agbala -agbara obodo ha. Na ndụ ya nkịtị, Chielo bụ nwanyị isi mkpe ji ụmụ abụọ. Ya na Ekwefi bụ ezi enyi, ha abụọ na-anọkọ otu ebe n’ahịa. Ọ na-akpụkarị Ezimma bụ naanị otu nwa Ekwefi bụkwa onye ọ na-akpọ ada ya n’ọnụ mgbe ọ bụla. Mgbe ụfọdụ ọ na-azụta akara nye Ekwefi ka o welaara Ezimma. Onye ọ bụla hụrụ Chielo na ndụ ọma ya agaghị ekweta na ọ bụ ya bụkwa onye ahụ na-eme nkwuputa mgbe mmụọ Agbala jidere ya.

  Ndị a na-akụ nkwa wekwara osisi ha ọzọ, ebe dum wee dịkwa na njikere.

  Ụzọ ndị mgba abụọ ndị a chekọrịta onwe ha ihu n’ọgbọ mgba ahụ. Otu nwa okorobịa ga-esite n’ebe ndị nke ya nọ tere egwu gaa n’ebe nke ọzọ wee rụtụ onye nke ọzọ ọ chọrọ ka ya na ya gbaa mgba aka. Ha abụọ ga-agbara egwu pụta n’ọgbọ wee bido.

  Mmadụ iri na abụọ  nọrọ n’otu akụkụ ebe mgba ahụ sitekwara n’otu akụkụ wee ruo na nke ọzọ. Ndị ogbugbo abụọ na-agagharị n’akụkụ ndị ahụ na-agba mgba. Ọ bụrụ na ha chere na ike mmadụ abụọ ndị a ha, ha akwụsị ha. Ụzọ mgba ise siri otu a bie. Ma mgbe obi ji atọkarị ndị mmadụ ụtọ bụ mgbe a tụrụ mmadụ n’ala. Olu igwe mmadụ ga-esi akụkụ niile laa elu . Ọ bụladị obodo ndị gbara ha gburu gburu ga-anụ mkpụ ha na-etị.

  Mgba nke ikpeazụ dịịrị n’etiti ndị ndu otu abụọ ndị a. Ha so bụrụ ndị ọkamgba n’isiama toolu ndi ahụ. Ndị mmadụ nọ na-eche onye n’ime ha ga-atụ ibe ya n’ala n’afọ a. Ndị ụfọdụ sịrị na Okafọ ka mma, ndị ọzọ sịrị na a gaghị  eji ya tụnyere Ikezue. N’afọ gara aga, ọ dịghị onye n’ime ha tụrụ ibe ya n’ala na-agbanyeghị na ndị ogbugbo hapụrụ ha ka ha gbaa mgba karịa otu omenala kwuru. Ha nwere otu nka ha ji agba mgba, ya mere onye ọ bụla ji amata ihe ibe ya chọrọ ime n’oge. Ihe dị otu a nwere ike imekwa ọzọ n’afọ a.

  Chi ejiwela mgbe ha bidoro. Ekwe mgba bidoro dasiwe ike, ndị mmadụ bidokwara tisiwe mkpu ike. Ha bidoro pụtawa n’ihu ka mmadụ abụọ ndị a gbaara egwu pụta n’ọgbọ. Ndị a ji igu nkwụ enwekwaghị ike ịchụghachi ha azụ.

  Ikezue wepụtara aka nri ya. Okafọ wee hachie ya, mgba wee biri ọkụ. Mgba a kpụ ọkụ n’ọnụ. Ikezue gbalịrị tinye ụkwụ aka nri ya n’azụ Okafọ iji nwụde ya n’ụzọ ege. Ma otu matara ihe ibe ya na-eche. Ọha mmadụ a agbaala ha gburu gburu ma nọchiekwa ndi nkwa nke ụda egwu ha bidorola kụwa n’obi ndi mmadụ

  Ndi mgba abụọ ndị a ji onwe ha aka ugbu a wee kwụrụ otu ebe. Akwara niile dị ha n’ahụ pụtachara. O yiri mgba dị nhata nha. Ndị ogbugbo abụọ ahụ ebidolarị gawa igbosa ha mgbe Ikezue bụ onye chọrọ iji ụzọ ọ bụla merie, jiri ngwa binye otu ikpere ya n’ala ka o were isi tụọ ogbo ya n’ala. Okafọ weliri ụkwụ aka nri ya wee fee onye mgba ya n’isi dị ka a ga-asị na ọ bụ egbe igwe Amadiọra. Igwe mmadụ ahụ wee dapụ na mkpu ọṅụ. Ndị na-akwado Okafọ buliri ya elu wee bulaa ya n’ubu ha. Ha bụrụ abụ otuto ya ebe ụmụ nwanyị na-akụrụ ya aka:

    “Onye ga-agbara obodo anyị mgba?”

     Okafọ ga-agbara obodo anyị.

     Ọ tụọla narị mmadụ ole n’ala?

     Ọ tụọla narị mmadụ anọ.

     Ọ tụọla narị dimgba ole n’ala?

     Ọ tụọla narị dimgba anọ.

     Ngwanụ ka anyị kpọọnụ ya ka ọ gbaara anyị mgba”                      

 

IGBO AMAKA

ỤLỌAKWỤKWỌ IGBO

MỤTA IGBO

CULTURAL DANCE

MASQUERADE

EGWU DI YA

EDEMEDE IGBO

ONYE NKUZI IGBO

OLU ỤMỤ IGBO

IGBO MADE EASY

Learn In Igbo in 1 day

Learn In Igbo

Copyright � 2018-2020. Mother Tongue Academy. All Rights Reserved.We can be  reached  by Phone at (516) 442-9191  or by our Website  Contact  E-mail