Login and Register

Log in  \/ 
x
x
Register  \/ 
x

Home

Chap12-Isi Iri Na Abụọ

ISI NKE IRI NA ABỤỌ

 

              N’ụtụtụ echi ya, ebe niile gbara ha gburu gburu nọ n’ọnọdụ ememme n’ihi na Obierika enyi Okonkwọ na-eme emume uri ada ya nwanyị. Ọ bụ ụbọchị dị ya ga-ebutere ndị umụnna ndị ọgọ ya mmanya n’ihi na ọ kwụọlarị ihe karịrị ọkara ụgwọ nwanyị ya. A kpọrọ mmadụ dum oku, ma nwoke, ma nwanyị, ma ụmụaka. Ihe a bụ emume ụmụ nwanyị nke ndị na apụtakarị ihe bụ nwanyị a na-alụ alụ na nne ya.

      Ka chi ụbọchị ahụ bọrọ, onye ọ bụla mere ngwa ngwa rie nri ụtụtụ, ndị nwanyị na ụmụaka wee bịawa n’ezi Obierika inyere nwunye ya aka isi nri obodo ha niile ga-eri.

      Ndị ezinaụlọ Okonkwọ mekwara ka ezinaụlọ ndị ọzọ dị ha nso. Nne Nwoye na ọdụdụ nwunye Okonkwọ na ụmụ ha dum kwadoro iga n’ezi Obierika. Nne Nwoye bu nkata nke ede, otu ọkpụrụkpụ nnu na azụ ọkpọọ dị n’ime ya, bụ nke ọ ga-enye nwunye Obierika. Ọjịugo, ọdụdụ nwunye Okonkwọ bukwa nkata nke ụkam, ede na otu obere ite mmanụ dị n’ime ya. Ụmụaka ha bu ite mmiri.

       Ike gwụrụ Ekwefi, ụra na-atụkwa ya site n’ihe ahụ ọ mere n’abalị gara aga. O tebeghị anya ha lọtara. Eze nwanyị kwọọrọ Ezimma onye hirila ụra n’azụ ya wee jiri afọ ya kpụrụ pụta n’ụlọ agbara ahụ ka agwo. O leghị Okonkwọ na Ekwefi anya ma ọ bụ gosipụta n’ụzọ ọ bụla na ọ tụrụ ya n’anya ịhụ ha n’ọnụ ebe ahụ. O legidere anya n’ihu ya wee laghachi n’obodo ha. Okonkwọ na nwunye ya nyere ya ezigbo ohere wee sowe ya n’azụ. Ha chere na eze nwanyị ga- ala n’ụlọ ya ma, ọ gara n’ezi Okonkwọ site n’obi ya gafee, banye n’ụlọ Ekwefi. Ọ bara n’ime ụlọ ha na-ehi ụra wee jiri nwayọ nyiwe Ezimma n’elu akwa ma lawakwa na-atụpụrụghị onye o bụla ọnụ.

       Ezimma ka nọ n’ụra mgbe ndị ọzọ naara ejikere.Ekwefi gwara Nne Nwoye na Ọjiugo ka ha kọwaara nwunye Obierika na ya agaghị abịa n;oge. Ọ kwadochala nkata ede na azụ ya ma, o ga-echere ka Ezimma teta n’ụra.

       Nne Nwoye sịrị ya “gị onwe gị kwesiri ịrahụ ụra. Ị dịcha ka onye ike gwụrụ.” Mgbe ha naara ekwu okwu a,Ezimma siri n’ime ụlọ pụta, na-ehicha anya ya ma na-adọtịkwa onwe ya. Ọ hụrụ ụmụaka ndị ọzo ka ha jicha ite mmiri ha wee cheta na ha ga-aga ichuru nwunye Obierika mmiri. Ọ bara n’ime ụlọ gaa wepụta ite nke ya.Nne ya jụrụ ya ma o hirichaala ụra. Ọ sịrị ya “eee, ngwa ka anyị gawa.”

       Nne ya gwara ya na ha ga-aga mgbe o richara nri ụtụtụ. O wee baa n’ime ụlọ ya isitu ofe akwụkwọ ahụ o tere n’abalị ọkụ

       Nne Nwoye gwara Ekwefi sị “Anyị ga-agawa, aga m agwa Nwunye Obierika na ị na-abịa n’azụ. Ha niile wee gawa inyere nwunye Obierika aka. Nne Nwoye na ụmụ ya anọ nakwa Ọjịugo na ụmụ ya abụọ. Ka ha na-agafe n’obi Okonkwọ, ọ jụrụ ha sị “Onye ga-esiri m nri ehịhie?” Ọjiugo sịrị na ya ga-alọta bịa sie ya.

        Ike gwụkwara Okonkwọ, ụra na-atụkwa ya n’ihi na o highị ụra ọ bụla n’abalị gara aga na-agbanyeghị na ọ dịghị onye ọzọ matara nke a. Obi lọrọ ya mmiri ma na o zipụtaghị ya. Mgbe Ekwefi sooro eze nwanyị ahụ gawa, o nyere ha nnukwu ohere, were mma ya wee gawa n’ihu agbara ahụ bụ ebe o chere na ha ga-anọ. Ọ bụ naanị mgbe o ruru ebe ahụ ka o metụrụ n’ahụ na eze nwanyị nwere ike ibu ụzọ gazuchaa obodo ha dum. Okonkwọ lọghachiri ụlọ ya chere. Mgbe o chere na ya anọọla ọdụ, ọ laghachiri azụ n’ihu agbara ahụ ma na ebe ahụ dị ka ebe ozu nwụrụ. Ọ bụ naanị mgbe ọ gara nke ugboro anọ ka ọ hụrụ Ekwefi. Ma n’oge ahụkwa obi ezughịkwa ya ike.

      Ememme na-arị ibe ya elu n’ezi Obierika. A kwachara ekwu n’ebe ọ bụla ohere dị n’ebe ahụ site n’ibukọta ọkpụrụkpụ aja atọ nakwa ịmunye ọkụ na ha. A na-esi, a na-afọpụ n’ekwu ndị a. Ha  nakwa asụ ụtara n’ihe dị ka otu narị ikwe. Ụfọdụ ụmụ nwanyị siri ji na akpụ ebe ndị ọzọ tere ofe akwụkwọ. Ụmụ okorobịa sụrụ ụtara ndị ahụ ma ọ bụ, ha wara nkụ. Ụmụaka churu mmiri akwụsịghị akwụsị.

       Ụmụ okorobịa atọ nyeere Ọbierika aka igbu ewu abụọ ahụ ha jiri tee ofe. Ha abụọ mara abụba, ma na nke kacha ha maa abụba ka elinyere ọbụ n’osisi dịdebere ahụ aja ụlọ. Ọ ha ka nwa ehi. Obierika dupuru otu nwanna ya ka ọ gaa Umuike gaa zụta ewu ahụ. Ọ bụ nke a ka ọ ga-akpụnye ndị ọgọ ya na ndụ.

        Nwa okorọbịa ahụ Obierika dunyere ịga zụta ewu ahụ sịrị na ahịa ndị Ụmụike dị egwu. Ndị mmadụ juputara ebe ahụ nke bụ na a ghalie aja elu, ọ gaghị adaru ala.

       Obierika sịrị ya na nke ahụ bụ aka ọrụ ọtụmọkpọ. Ndị Ụmụike chọrọ ka ahịa ha buo ibu karịa nke ndị agbata obi ha. Ya mere ha jiri gwọọ ọgwụ siri ike. Ụbọchị ahịa ọ bụla, tupu ọkụkọ mgbụ ebee akwa, ọgwụ a ga-aga guzoro n’etiti ahịa dị ka agadi nwanyị ji akupe. Akupe ọgwụ a ka o ji akpọkọ ndị agbata obi ha niile ka ha bịa ahịa ahụ. Ọ na-akpọ n’ihu kpọọ n’azụ ya, kpọọ n’aka nri na aka ekpa ya. Otu nwoke ọzọ sịkwara: ‘Ya mere mmadụ dum ji abịa ahịa ahụ, ma ndi ọma ma ndi ohi. Ha nwere ike izuru gị akwa n’ukwu n’ahịa ahu.’’

       Obirika zara sị “Nke a bụ eziokwu. Adọrọ m Nwankwọ aka na ntị ka ọ kpachapụ anya ya. Otu mgbe otu nwoke gara ire ewu ya. Ọ dọkpụ ya n’otu ụdọ buru ibu nke ọ manyere n’aka ya. Ma mgbe ọ na-aga n’ime ahịa, ọ chọpụtara na ndị mmadụ naara atụ ya aka ka ọ bụ onye ara. Ihe a gbara ya gharịị wee ruo mgbe o lere anya n’azụ wee hụ na ihe ọ dọkpụ abụghị ewu, na ọ bụ mkpirisi nkụ buru ibu. Nwankwọ jụrụ ya sị “I chere na otu onye ohi nwere ike ime ihe ahụ naanị ya?” Obierika zara ya “Mba ha na-eji ọgwụ.”

       Mgbe ha gbuchara ewu ndị ahụ ma jirikwa efere cheta ọbara ha, ha hụrụ ha n’ọkụ iji hụsịa ajị dị ha n’ahụ. Isisi ajị ahụ nakwa isisi nri a na-esi mekọtara ọnụ. Ha sara ha mmiri ma gbubisie ha ka ụmụ nwanyị ahụ were ha tee ofe.

       Omume ihe ndị naara aga n’ihu mgbe otu ihe mgbochu mberede mere. Ọ bụ mkpu nke a na-eti n’ebe dị anya “Oji ọdụ achụ ijiji oo!” Nwanyị ọ bụla hapụrụ ihe ọ na-eme otu ihu ahụ wee gbagawa ebe mkpu ahụ siri bịa.

       Chielo, eze nwanyị Agbala tiri mkpu sị “Anyị dum agaghị agbapụ otu ahụ hapụ ihe anyị sinyere n’ọkụ ka ha ree ọkụ. Mmadụ atọ ma ọ bụ anọ n’ime anyị ga-anọ ebe a.” Otu nwanyị ọzọ kwetara ihe ahụ o kwuru wee sị “Nke a bụ eziokwu, anyị ga-ahapụ ụmụ nwanyị atọ ma ọ bụ anọ ka ha nọrọ ebe a.”

      Ụmụ nwanyị ise nọdụrụ ileta ihe ahụ ha sinyere n’ọkụ ebe ndị ọzọ gbapụrụ ịhụ ehi ahụ a tọpụrụ atọpụ. Mgbe ha hụrụ ya, ha chụhachiiri ya onye nwe azụ bụ onye kwụrụ nha ahụ nke ndị obodo kwuru na onye ọ bụla hapụrụ ehi ya ka ọ taa mkpụrụ akụkụ ndị ọzọ, ga-akwụ. Mgbe ụmụ nwanyị ndị a natachara nha a, ha lere anya n’ime onwe ha ịhụ ma ọ dị onye n’ime ha hapụrụ ịbịa mgbe ahụ ha tiri mkpu ahụ. Otu n’ime ha jụrụ sị ‘Kedu ebe Mgbogo nọ?” Onye agbata obi ya zara sị “Ahụ adịghị ya. O nwere ịba.” Otu nwanyị ọzọ sịrị “Onye ọzọ na-anọghị ebe a bụ Udenkwo n’ihi na nwa ya agbabeghị iri abalị abụọ na asatọ.”

        Umụ nwanyị ndị ahụ Nwunye Obierika akpọghị ka ha bịa nyere ya aka laghachiri azụ n’ụlọ ha ebe ndị ọzọ laghachiri azụ n’ezi Obierika.

       Ndị ahụ ha ekweghị ka ha gbaputa jụrụ sị “Onye nwe ehi ahụ?” Ezelagbo zara si “Ọ bụ nke di m. Otu n’ime ụmụaka m meghere ọnụ ọgba ha.”

      N’ehihie ubọchị ahụ, ndị ọgọ Ọbierika butere ya ite mmanya abụọ mbụ ha. O bunyere ha ụmụ nwanyị ndị ahụ na-esi nri bụ ndị ṅụrụ otu iko ma ọ bụ abụọ iji nyere ha aka na ihe ha na-esi. Ụfọdụ n’ime hakwa ka ha nyere nwa ahụ a na-alụ alụ na ndị na-enyere ya aka ịkpa isi ya na ide ya uri n’ahụ.

       Mgbe anwụ dawara, Madụka ọkpara Obierika tụtụrụ azịza wee zachaa mbara obi nna ya. Dị ka a ga-asị na ha naara eche ka ọ zachaa, ndị ikwu na ibe nakwa ndị enyị Obierika bidoro bịawa, nke ọ bụla, ọ nyara akpa ajị ya n’otu aka ma nyarakwa ute akpụkpọ anụ ya nke ọ fụchiri afụchi n’aka nke ọzọ. Ụfọdụ n’ime ha kpọ ọkpara ha bụ ndị buteere ha oche ha tụrụ atụ ha ji anọ ọdụ, bịa. Okonkwọ bụ otu n’ime ha. Ha nọrọ otu akụkụ wee na-akọrị akụkọ. Ọ gaghị ete anya ndị ọgọ ha abịawa.

       Okonkwọ wepụtara mkpọ anwụrụ ya wee nye ya Ogbuefi Ezenwa bụ onye nọdebere ya. Ezenwa naara ya, kụọ ya n’ikpere ya, were aka ekpe ya hichaa ya tupu ọ kpọọ anwụrụ dị n’ime ya. Ọ kpacha anya mee ihe ndị ahụ. Ọ nakwa akọ akụkọ mgbe ọ na-eme ha. “Enwere m olile anya na ndị ọgọ anyị ga-ebute ọtụtụ ite mmanya, n’agbanyeghị na ha sitere n’obodo a ma ama maka aka ntagide ha bịa. Ha ga-amata na Akụeke bụ nwunye onye eze.”

        Okonkwọ sịrị “Ha agaghị ebute ihe dị nta karịa ite mmanya iri atọ. Ọ bụrụ na ha mee nke a, aga m agwa ha ihe dị m n’obi.”

        Na mgbe ahụ ka Madụka sitere n’ime ezi ha kpụpụta ewu ukwu ahụ ka ndị ikwu na ibe nna ya hụ ya. Ha niile jara ya mma wee sị na ọ bụ otu ahụ ka o kwesiri isi eme ihe. Ọ kpụghachikwara ewu ahụ azụ.

       N’oge na-adịghị anya, ndị ọgọ ha bidoro bịawa. Ụmụ okorobịa na ụmụaka soro n’ahịrị, nke ọ bụla bu otu ite mmanya, bụ ụzọ bịa. Ndị ikwu Obierika ndị a gụrụ ite mmanya ndị ahụ ọnụ. Ha dị ite iri abụọ na ise. Ogologo oge gafere, ndị dum nọ ebe ahụ lerịtara onwe ha anya dị ka ha ga-asị “agwakwara m gị agwa.” Ite mmanya ndị ọzọ wee bịdo bịawakwa. Ha dị iri anọ na ise. Ndị ahụ nọ ebe ahụ kwere n’isi dị ka ha na-asị “Ugbu a ka ha na-akpa agwa ka ndị nwoke.” Ite mmanya niile ha butere dị iri ise. Ibe, bụ onye na-alụ nwanyị na ndị okenye ezinaụlọ ya bịara mgbe ndị bu mmanya ndị a bịachara. Ha nọrọ n’akụkụ nke ọzọ wee mee ka ha na ndị ogọ ha nọ gburu gburu. Ite mmanya ndị ahụ dọọrọ n’etiti ha. Mgbe ahụ ka nwa agbọghọbịa ahụ a na-alu alụ na nne ya nakwa ụfọdụ ụmụ nwanyị na agbọghọbịa ndị ọzọ siri n’ime ezi pụta, gaa gburu gburu wee kwee ndị niile nọ ebe ahu n’aka. Nne nwa ahụ bu ụzọ, nwa ya na-eso ya, ụmụ nwanyị ndị ọzọ na-esozi ha. Ụmụ nwanyị ndị a lụrụ alụ ji uwe ha kacha mma, ebe umụ agbọghọbịa ndị ahụ yi jigida na-eji oji na nke na-acha uhie uhie ma gbarakwa ọdụ

      Mgbe ụmụ nwanyị ndị a pụrụ Obierika cheere ndị ọgọ ya ọjị. Nwanne ya nke dimkpa wara nke mbụ “Ndụ anyị dum,” ka o kwuru mgbe ọ na-awa ya. “Ka ezi mmekọrịta dị n’ezinaụlọ anyị na nke unu.” Ọha mmadụ zukọrọ ebe ahu sịrị “eee!” Anyi na-akpọnye unu ada anyị taa. Ọ ga-abụrụ unu ezigbo nwunye. Ọ ga-amụrụ unu ụmụ nwoke toolu dị ka nne mụtaara obodo anyị.” “eee!” onye mekarịchara okenye n’ime ndị ọbịa zara sị “Ọ ga-adịrị unu mma, dịkwara anyị mma.” ‘eee!’ “Nke a bụghị mbụ ndị anyị na-abịa ịlụrụ nwa unu. Nne m bụ nwa unu.” “eee!”

         Nke a gaghị abụ nke ikpeazụ n’ihi na unu ghọtara anyị, anyị onwe anyị ghọtakwara unu. Ezinaụlọ unu bụ ezinaụlọ ukwu.” “eee!”

        Ndi bara ụba na ndị bụ dike n’agha.” O lere anya n’ebe Okonkwọ nọ. Ada unu ga-amụrụ anyị ndị nwoke dị ka unu’’ “eee!”

        Ha tara ọjị wee bido ịṅụ mmanya. Mmadụ anọ ma ọ bụ ise nọkọrọ ọnụ wee dote otu ite mmanya n’etiti ha. Mgbe anyasị na-abịa, ha butere ndị ọbịa ha nri. Ha butere ha ọtụtụ efere ụtara buru ibu nakwa ite ofe ndị na-ekusi ọkụ. Ha butekwara ji a gwọrọ agwọ. Ọ bụụrụ oke emume.

       Mgbe chi jiri, ha mụnyechara ọkụ, ụmụ okorọbịa wee bido ịgụ egwu. Ndị okenye nọrọ gburu gburu, ndị a na-agụ egwu gara ha gburu gburu na-eto onye ọ bụla n’ime ha ha bịara n’ihu ya. Ha nwere ihe ha ga-ekwuru onye ọ bụla n’ime ha. Ụfọdu bụ ndị ọrụ ubi a ma ama, Ụfọdụ bụ ndị ọnụ na-ekwuru obodo ha okwu. Okonkwọ bụ onye ọkamgba na ọchị agha kachasị ibe ya, nọ ndụ. Mgbe ha gachara gburu gburu , ha gara nọrọ n’etiti. Ụmụ agbọghọbịa pụtara ịgba egwu. Na mbụ, nwa ahụ a na-alụ alụ esoghị ha. Mmadụ dum nọ ebe ahụ tiiri ya mkpu ọṅụ n’ikpeazụ mgbe o jiri otu oke ọkpa n’aka nri ya pụta. Ndị egwu ndị ọzọ niile nyere ya ohere. O nyere ndị ahụ na-akụ egwu oke ọkpa ahụ wee bido ịgba egwu. Ọla ndị ahụ ọ gba n’aka na-akụkọ onwe ha ọnụ mgbe ọ na-agba egwu, ebe ahụ ya na-amụke amụke n’ọkụ ahụ. Ndị egwu ahụ ji osisi, mpekele ọkụ na mkpirisi igwe akụ egwu, sitere n’otu egwu fere n’ọzọ. Obi bụcha ha niile aṅụrị. Ha gụrụ egwu ọgbara ọhụrụ dị n’obodo ha.

                             “M jide aka ya

                             Ọ sị, ebetula aka

                             M jide ụkwụ ya

                             Ọ si ebetula aka

       Ma mgbe jidere mgboji dị ya n’ukwu O mee ka ọ mataghị”

 

      Chi ejimiela mgbe ndị ọbịa ha biliri ịla, ha kpọọrọ nwanye ha ka ọ gaa nọọ izu asaa n’ụlọ di ya. Ha gụrụ egwu mgbe ha na-ala. Ha kpọtụkwaara ụfọdụ ndị a ma ama n’obodo dị ka Okonkwọ tupu ha alawa. Okonkwo nyere ha ọke ọkpa abụọ.

                 

IGBO AMAKA

ỤLỌAKWỤKWỌ IGBO

MỤTA IGBO

CULTURAL DANCE

MASQUERADE

EGWU DI YA

EDEMEDE IGBO

ONYE NKUZI IGBO

OLU ỤMỤ IGBO

IGBO MADE EASY

Learn In Igbo in 1 day

Learn In Igbo

Copyright � 2018-2020. Mother Tongue Academy. All Rights Reserved.We can be  reached  by Phone at (516) 442-9191  or by our Website  Contact  E-mail